Anyị enweghị afọ ojuju na mpụtara nnyocha gbasara ọnwụ Odira Nwobu - Nwanne ya

Aha onyonyo, Anyị enweghị afọ ojuju na mpụtara nnyocha gbasara ọnwụ Odira Nwobu - Nwanne ya
Anyị enweghị afọ ojuju na mpụtara nnyocha gbasara ọnwụ Odira Nwobu - Nwanne ya
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Maazị Chukwuma Nwobu a ma dịka 'Pastor' bụ ọkpara ezinaụlọ Odira Nwobu, onye ihe ejije Nollywood nwụrụ n'ike na mba Saụt Afrịka n'abalị 24 nke ọnwa Nọvemba 2025.

Cheta na onye ọkpaọchị na ihe ejije a ma ama bụ Odira Nwobu nwụrụ ka ọ gbachara afọ iri atọ na ise nke kpalite arịrị, akụkọ nakwa ajụjụ dị iche iche.

Na mkparịtaụka nwanne nwoke Odira na BBC News Igbo nwere na nsonso a, ka kwuru na nchọpụta rụtụrụ aka na ọ bụ 'nsi' gburu Odira Nwobu mana gbarụọ ihe na akwụkwọ nnyocha e nyere ezinaụlọ a ezughị oke ikwu hooha, ụdị nsi gburu nwanne ya nke obere.

Maazi Nwobu kọwara: "Dịka ihe mere, e nyere anyị mpụtara nnyocha nke abụọ e mere mana ezinaụlọ ya enweghị afọ ojuju na ya.

"Anyị ahụghị akwụkwọ mpụtara nnyocha ndị uweojii mere.Ihe anyị hụrụ bụ mpụtara nke dọkịta na ndị ụlọọgwụ mere ebe a nọ mịkpọọ ozu ya ma tinye ya n'ụlọozu, burukwa ya bulọta Naijiria."

"Ị sị anyị na amaghị ebe mpụtara nke mbụ dị, achọghị m ka m kweta n'ihe m na-eche."

"Sị nye ezinaụlọ Odira Nwobu, mpụtara nnyocha ozu mbụ e mere na Saụt Afrika, biko."

Ọ gara n'ihu kwuo na akụkọ dị iche iche na-efegharị banyere etu Odira sirị nwụọ bụ 'akụkọ e ji emeju akụkọ'.

O kwuru sị, "Hapụchaa akụkọ ndị a na-akọ. Onye ọbụla nwụrụ nwere ihe a ga-akọ.

"Ha niile bụ akụkọ e ji emezu akụkọ. Ọ nwụkwara n'elu nwaanyị, ọ bụkwa BP, ọ bụkwa ọgwụ ike, ọ ṅụkwara shaba, ọ ṅụkwara nke a ma nke ọzọ ji dinaa nwaanyị, ihe ndị a bụ akụkọ. Ihe anyị na onwe anyị ma, etu m sị mata nwanne m nwoke ọ bụghị ụdị mmadụ na-eme ụdị ihe dị otu ahụ."

Maazị Nwobu tụrụ arịrị na kemgbe ọnwa Disemba ebulatara ozu Odira na Naịjirịa na ndị ya na ya na-rụkọ bụ ma ndị enyi enweghị ndị jụrụ ezinaụlọ ya ozị nke ha na-abịara ha mgbaru.

"Kemgbe ahụ, o nwebeghị onye nke anyị na ya hụrụ."

Ihe ụlọọrụ kpọgara Odira Saụt Afrịka kwuru

Oge BBC News Igbo kpotụrụ ya, onye nwe ųlọọrų Nwaguatahįhįa bų ụlọọrụ kpọgara Odira mba Saụt Afrika bų Chukwukeme Okechukwu Kingsley gwara BBC News Igbo n'ekwenti na Odira na mmadụ iri ndị otu ya nupụrụ isi na nkwekọrita ha nwere.

"Oge anyị na-aga Saụti Afrịka, ụlọọrụ anyị kpọgara ha iri Saụt Afrịka, ha na ọkaiwu ụlọọrụ anyị na ha nwere nkwekọrịta mana ha iri nupụrụịsi na nkwekọrịta ahụ.

O gara n'ihu kwuo na ọ bụghị ọrụ ha ibulata ozu Odira mana ha mere ya dịka ihe a na-emere nwanne, na ha leghara anya n'ihe ha mere, ma mefuo ihe karịrị nde naira asaa na ibulata ozu ya na Naịjirịa.

O kwukwara na ha enyela ezinaulo ya otu nde naira.

N'okwu mpụtara nnyocha ozu ya, o kwuru na ha achọghį ikọwapụtara ọha etu Odira si nwụọ iji kwanyere ezinaulo ya ugwu.

N'okwu na o bu ulọọrụ ahụ bụ ndị dugara ya ije o jiri nwee ihe mberede okporoụzọ nke tara isi otu enyi Odira, tupu ọdachi ọnwụ adakwasịkwazị Odira, Chukwukeme kwuru na ulọọrụ ya kpebiri ịgbara Odira ụgbọelu mana Odira na ndi otu ya jụrụ, hara iji ụgbọala mee njem bụ nke ha ji danye n'ihe mberede okporoụzọ.

"Odira bụ onye bịakwutere anyị, (ọ bụghị anyị gakwuru ya) sị na o mebeghị nnukwu nkwekọrịta ahịa ọbụla. Anyị na ya kwekọrịta ma binye aka n'akwụkwọ ka ọ gaa mere anyị ozi ahịa, anyị kwụọ ya ụgwọ, zụte akwụkwọ njem ụgbọelu, ọ sị mba na ọ bụ ụgbọala ka ọ ga-aba, ya na enyi ya."

Kirie ya n'uju n'ihe onyonyoo a: