Ndị a ma ama n'Afrịka e kwuru na ha na Jeffery Epstein nwere mmekọ

Ebe foto si, Getty Images
Dịka okwu Jeffery Epstein na-aga n'ihu, nchọpụta ọhụrụ mba Amerịka wepụtara, akpọọla aha ndị a ma ama n'Afrịka a na-ekwu na ha na Epstein nwere mmekọ.
nke a na-abịa dịka mba Amerịka gbara n'anwụ ọtụtụ puku ozi banyere ndị a na-ekwu na ha na Jeffery nwere mmekọ n'ụdị dị iche iche.
Robert Mugabe bụbu onyeisiala mba Zimbabwe

Ebe foto si, Getty Images
Nchọpụta a ahụ kwuru na Robert Zimbabwe bụbu onyeisiala mba Zimbabwe na Epstein nwere mmekọ ihe gbasara ego.
Akụkọ kwuru na ozi emeelu nwaafọ mba Japan bụ Joi Ito dere, kwuru na n'afọ 2015, Epstein gwara Mugabe oge ọ bụ onyeisiala mba Zimbabwe na ọ chọrọ inye mba Zimbabwe ego kọresi ọhụrụ. nke a na-abịa dịka ego dọla kụrụ ego mba Zimbabwe isi aba okpu.
N'afọ 2017, ụlọọrụ FBI wepụtara ozi otu onye akaebe a na-amaghị ka ọ bụ eziokwu nke kwuru na Epstein bụ onye na-ahụ ma na-achịkọtara Onyeisiala Vladimir Putin ego ma kwuo na ọ rụkwaara Mugabe ọrụ di etu a.
Mana a na-ekwu na ị kpọ aha mmadụ n'ihe gbasara okwu Epstein apụtaghị nao nye ahụ mere mpụ ọbụla.
BBC agwala ezinaụlọ Mugabe ka ha kwuo okwu banyere nke a.
Cheta na Robert Mugabe bụ onyeisiala oge Zimbabwe nwtere nwere onwe ha ma bụrụkwa onyeisiala kachasị nọọ n'ọkwa ọchịchị. A napụrụ ya ọchịchị n'ike n'afọ 2017. Ọ nwụrụ n'afọ 2019 dịka ọ gbara afọ 95.
Jabob Zuma bụbu onyeisiala Saụt Afrịka

Ebe foto si, Getty Images
Onye ọzọ a kpọrọ aha ya bụ Jacob Zuma bụbu onyeisiala mba Saụt Afrịka. E kwuru na Jeffery Epstein haziere Zuma nri abalị na Lọndọ n'afọ 2010 nke e kwuru na otu nwaanyị mba Rọshịa mara mma bịara.
Mana nzaghachi otu Jacob Zuma Foundation kọwara akụkọ banyere nchọpụta a dịka aka ọrụ ndị na-agba Zuma mgba okpuru ma kwuo na enweghị oge ọbụla Zuma kpara agwa na-adịghị mma dịka onyeisiala mba Saụt Afrịka.
Nchọpụta kwuru na otu onye e kwuru na ọ bụ enyi Epstein degaara Zuma ozi meelu na Maachị 4, 2010 ma gwa ya na a na-ahaziri ya nri abalị n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ Ritz Hotel nke ga-abụ na Maachị 5, 2010.
Enyi Epstein ahụ kwuru na ihe mere o ji zigara Zuma ozi ahụ bụ maka na o kwenyere na Zuma ga-eme ka emume nri abalị ahụ chawapụ. Ma kwuo na onye ọbụla bụ enyi Epstein, bụkwa enyi ya onwe ya.
Jeffrey Epstein: Trump, Gates, Musk, Andrew na ihe ndị ọzọ mkpughe ọhụrụ gbara n'anwụ banyere mmetọ ụmụaka

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe abalị 30 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026, Gọọmentị mba Amerịka gbara n'anwụ akwụkwọ ọhụrụ metụtara Jeffrey Epsten, otu nnukwu ọgaranya nwụrụ na mkpọrọ n'afọ 2019 ebe a tụkpuru ya maka ebubo imetọ nakwa iji ụmụaka ụmụnwaanyị echere ndị oke ọgaralanya ọjị, okwu ihe pụtara ihe ka bụ okwu a kpụ n'ọnụn n'ụwa gbaa gburugburu.
E wepụtara akwụkwọ ibe akwụkwọ dị nde atọ, foto dị 180,000 nakwa ihe onyonyo dị 2000 nke gosiri ndị nnukwu mmadụ gụnyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ojiegoachụego nakwa ndị bụ ọgaranya iri ehi ha na Epstein nwere ihe jịkọrọ ha.
Ndị aha ga gbara n'akwụkwọ nchọpụta ahụ gụnyere onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump, Bill Gate(Microsoft) Andrew(Nwaeze mba Briten),Richard Branson(Virgins Airline), Elon Musk(X a mabu dịka Twitter).
Lee ụfọdụ ihe pụtara ihe:
Bill Gates

Ebe foto si, Getty Images
Akwụkwọ ọhụrụ ahụ a gbara n'anwụ na- ebo ebubo na Gates chọrọ ụzọ ọ ga-esi gbuchie ọrịa mmekọrịta (STIs) a sị o butere site na ya na ụmụagbọghọ Rọshịa ka nwunye ya oge ahụ bụ Melinda Gates ghara ịma.
Melinda ekwuola na mkpughe ọhụrụ ahụ kpalitere ihe o chefuru banyere nsogbu dapụtara na alumdinanwye ha.
"Nke kacha mkpa bụ a gaaala m ihu , olileanya m bụ ka ndị ahụ emetọrọ bụ ndị bụụla ibiriachị ugbua nweta ikpe mkwụmaọtọ."
Mana ọnụ na-ekwuru Bill Gates gwara BBC na ebubo ndị a si "n'ọnụ onye ụgha" na-asị "okpotokpo asị."
Bill Clinton

Ebe foto si, Getty Images
Aka chịburu Amerịka bụ Bill Clinton na Epstein na-adị na mma.
Clinton ejirila ụgbọelu gaa Epstein Island bụ ala dị n'etiti mmiri bụ ebe Epstein na-ehihe mmemme ndị ọgaranya na ndị nwere agba na-abịa.
Ihe mgbaa pụtara ọhụrụ gosiri foto Clinton na-egwu mmiri ya na ụmụnwaanyị ehichara ihu ha nọ na foto ndị ahụ..
Clinton agọọla na aka ya dị ọcha ma kwupụta njikere ya ịgba aka ebe n'ihu ndị ụlọomeiwu Amerịka na-enyocha okwu a.
Elon Musk
Onye nwe ọbaozi X nakwa ụgbọala Tesla bụ Elon Musk so na ndị ọgaranya akpọnyere aha ha na mkpuhe ọhụrụ banyere Epsteein.
Ozi imeelu Musk zigara Epstein jụrụ Epstein n'afọ 2012 jụrụ Epstein ma o nwere mmemme(party) ọ ọ kwadoro n'Epstein Island.
Epstein sara ya si ya na na oke na oke dị Epstein agaghị ekwe eyi Musk nwaanyị nọkwata.
Mana ọ dịghị ka Musk agara mmemme ahụ.
Elon Musk agọrọla isi onwe ya sị na ya azaghị ọtụtụ oku a kpọrọ ya bịa Epstein Island.
Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images
Trump na Epstein na-adịbu na mma.
Ozi a gbara n'anwụ gosiri ọtụtụ foto ebe Trump na ụmụnwaanyị dị iche iche e hichara ihu ha nọ.
Ihe ọzọ a gbara n'anwụ gunyere ozi imeelu nke nwunye Trump bụ Melania Trump zigara Epstein n'afọ 2002 zigara enyi Epstein bụ Ghislaine Maxwell bụ ebe o toro akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ nke New York Magazine dere banyere Epstein.
Mana Trump asaala okwu sị na akwụkwọ mkpughe maka Epstein pụtara ọhụrụ gbara ya akaebe na o nweghị ihe ọjọọ ya mere.
Sarah Ferguson

Ebe foto si, Getty Images
Sara Ferguson bubụ nwunye Andrew nakwa 'Duchess nke York', na Epstein ziritara onwe ha imeelu ọtụtụ oge dịka ama ọhụrụ a sị gbaa.
N'otu n'ime ozi imeelu ahụ nke o degara Epstein n'afọ 2009, ọ chọọ ka ha kpaa maka "my Sarah Ferguson Brand" ma kee ya maka ị bụrụ ya "nwanne nwoke" ya na-arọ nrọ ya.
Ngwa ngwa mkpughe ọhụrụ pụtara ihe, e mechiri 'Sarah Trust' bụ ụlọrụ abụghị nke Gọọmentị o ji enyere ndị mmadụ aka.
Andrew Mountbatten-Windsor

Ebe foto si, US Justice Department
Foto Andrew Mountbatten-Windsor(Duke of York) gbara na mkpughe ọhụrụ a gosiri ebe o sekpu ala, aka abụọ ya n'ala nelu nwaanyị dịna ala mana e gosighị ihu nwata nwaanyị ahụ.
Andrew onye bụ bụbụ Nwaeze Ingland bụ onye a Obi Eze napụrụla aha na ọkwa ya dịka nwaeze dịka mkpughe mbụ gosiri na ya na Epstein na-adị na mma nakwa foto ya na ụmụnwaanyị dị iche iche.
Mountbatten-Windsor ekwuola na o nweghị ihe ọjọọ ya mere.




























