Gịnị ga-eme ka ntutu isi gị too nke ọma maọbụ gbajie?

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara akpụkpọ ahụ na ntutu kwuru na ntutu isi mmadụ na-emebi maọbụ na-agbaji agbaji mgbe onye ahụ anaghị elekọta ya nke ọma.

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ntutu isi bara uru dị ukwuu na ndụ mmadụ, omenala, na nke onwe, ma na-egosikwa ihe nrịbama nke njirimara, ọnọdụ, na ahụike.

Ntutu isi na-enye nchekwa pụrụ iche n'ahụ mmadụ ọkachasị n'isi ma na-enye aka na mmetụta uche na nhazi okpomọkụ.

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara akpụkpọ ahụ na ntutu kwuru na ntutu isi mmadụ na-emebi maọbụ na-agbaji agbaji mgbe onye ahụ anaghị elekọta ya nke ọma.

Nwaada Uche Taiwo bụ onye ihe gbasara akpụkpọ ahụ na ntutu doro anya kwuru na o nwere ọtụtụ ihe mmadụ ga-eme nwere mmetụta n'ọnọdụ na uto ntutu isi ya.

O gara n'ihu kwuo e nwere ọtụtụ ihe mmadụ nwereike ime iji mee ka ntutu isi ya na-eto eto.

Kedụ etu ị ga-esi lezie isi gị anya nke ọma?

Ihe ndị ị ga-eme gụnyere:

  • Nke mbụ, ị na-agba mbọ na-ahụ na ntutu gị dị nro mgbe ọ bụla. Ị ga na-eme nke a site na itinye mmanụ na mmairi n'isi gị malite n'ala isi gị ruo n'ọnụ ntutu gị. Ime nke a apụtaghị iji naanị mmanụ isi. Nke a gụnyere itinye mmanụ na mmiri na ntutu isi gị.
  • Nwaada Taiwo kwuru na iji naanị mmanụ adịghị mma mana ọ bụrụ na itinye mmanụ na mmiri, ọ na-eme ka ntutu gị dị nro maka mgbe ọ bụla ntutu isi gị dị nrọ, ọ na-ebelata oke mgbaji.
  • Ọnọdụ ahụike mkpụrụ afọ gị dịkwa oke mkpa n'ihi na ihe ị na-eri na-ewulitekwa ọnọdụ ahụike ntutu isi gị dị mma.
Skip Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a and continue readingLee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a

End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a

Gịnị na-akpalite ntutu isi gị ji agbaji?

Ntutu isi mmadụ na-agbaji mgbe onye ahụ na-eme maọbụ anaghị eme ọtụtụ ihe ndịa nke gụnyere:

  • Ntutu isi mmadụ na-agbajị ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị eme ka ntutu isi ya na-enwe mmiri nke ọma maọbụ dị nro.
  • Ntutu isi mmadụ na-agbajikwa ma ọ bụrụ na o nweghịkwa ihe oriri dị mkpa nke na-eme ka ntutu na-eto.
  • Ntutu mmadụ na-agbaji agbaji ma ọ bụrụ na onye ahụ na-ahazikarị isi ya mgbe ọbụla site na ikesi ya ike maọbụ iji oke kemịkal. Nke a na-abịa n'ụzọ abụọ nke gụnyere iji kemịkal bekee kpọrọ 'relaxer' maọbụ ihe na-eme ka etu ntutu si acha gbanwee. Ọzọkwa bụ iji oke okpomọkụ ahazi ntutu na-emekwa ka ntutu gbajie.
  • Nwaada Taiwo kwukwara na e nwekwara ọrụ nke akwara 'hormone' na-arụ iji mee ka ntutu isi gị na-eto nke ọma.
  • "Ọ bụrụ na 'hormone' nwaanyị eguzozighị nke ọma dịka ahụ nwaanyị na-emepụtakarị 'hormone' ndị dị n'ime ụmụnwoke dịka 'testosterone' karịa progesterone na-eme ka ntutu mmadụ na-adapụ."
  • Mmadụ inwe oke nchekasị na-ebutekwa ntutu isi ịdapụ.
  • Mgbe ihu igwe kpọrọ nkụ ma ntutu isi gị akpọkwa nkụ, ọ na-eme ka ntutu na-agbaji agbaji.
Nwaanyị na-akpa isi ya

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Nwaada Taiwo bụ onye mara ihe ekwe na-akụ banyere nlezi ahụ na ntutu, kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu karịa na onye ọ bụla nwere ntutu ọcha bụ maka na onye ahụ na-eme okenye mana nke ahụ abụghị eziokwu.

  • Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ mgbe mmadụ enweghị akwara bekee kpọrọ 'Melanin' n'ozuzu oke ya ka ntutu onye ahụ na-amalite ịcha ọcha.
  • Taiwo kọwara Melanin dịka agba sitere n'okike, nke mkpụrụ ndụ a na-akpọ 'melanocytes' na-emepụta, bụkwa nke na-ahụ maka etu akpụkpọ ahụ mmadụ, ntutu isi na anya mmadụ si acha.
  • O kwuru na mmadụ ịme ụdị isi siri oke ike na-eme ka ntutu isi mmadụ na-adapụ maọbụ na-agbaji agbaji.
  • Mmadụ ị na-ese siga na aṅụ oke mmanya na-aba n'anya nwereike imetụta uto ntutu na ọdịmma ntutu onye ahụ.
  • Ụfọdụ ndị mmadụ amaghị etu esi etinye kemịkal eji achọ mma na ntutu isi ha. Kama ha ga-etinye 'releaxer' na ntutu topụtara ọhụrụ, ha na-ete 'relaxer' na ntutu ọhụrụ na nke dịgoro mma.

Lee etu ị ga-esi gbochie ntutu isi gị ịdapụ adapụ

Nwaanyị na-emezi ntutu isi ya

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Nwaada Taiwo gwara anyị na e nwere ọtụtụ ihe mmadụ kwesịrị ị na-eme iji mee ka ntutu isi ya nwee ezi ahụike maọbụ nọrọ n'ọnọdụ dị mma.

Ihe ndị ahụ gụnyere:

  • Ị na-aṅụ ọgwụ bekee kpọrọ 'supplement' dị mma maka uto ntutu isi gị.
  • Na-asa ntutu isi gị mgbe niile opekatampe otu ugboro n'ime izu abụọ.
  • Ị gba mbọ ka i yiri ụdị nhazi nke na-agaghị eme ka ahịrị ntutu ghara ị na-adọpụ adọpụ.