Nnamdi Kanu agbagharịala akwụkwọ n'ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images
Onye ndu otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Nnamdi Kanu agbala akwụkwọ n'ụlọikpe Ukwu nke Etiti n'Abuja iji gbagha ikpe a mara ya.
Ụlọikpe mara Nnamdi kanu ikpe n'ebubo iyi ndụ egwu ma tụọ ya nga mkpụrụọka.
Mana n'akwụkwọ ọ gbara taa bụ abalị anọ nke ọnwa Febụwarị, afọ 2026, Kanu chọrọ ka ụlọikpe kagbuo ikpe a mara ya n'ikpe nke akara ya bụ FHC/ABJ/CR/383/2015.
Kanụ kwuru na ya gbadoro ụkwụ n'ihe iri na abụọ nke gụnyere na Ụlọikpe Mkpegharị kagbuburu ikpe ahụ sị na usoro e si kee ya dajọrọ, were na-agbagha mkpebi ahụ tụrụ ya mkpọrọ mkpụrụọka.
O kwuru na ọkaikpe kpere ikpe ahụ ' dajọrọ n'iwu" dịka o kpezighị usoro nakwa mpụtara ikpe a malitere n'afọ 2017.
Kanu boro ọkaikpe ahụ ebubo iguzoro n'iwu ochie adịghịzi ire were kpee ya ikpe.
























