Grammy 2026: Ihe i kwesiri ima maka ụmụafọ atọ ritere nturuugo; Shaboozey, Cynthia Erivo na Tyler the Creator

Shaboozey (Obinna Chibueze), Cynthia Erivo (Cynthia Chinasa Onyedinmanasu Ukaegbu) na Tyler the Creator (Tyler Okonma) bụ ụmụ ọdịda anyanwụ Naịjirịa nọ na mba ofesi so weta ihe nturuugo na Grammy 2026 .

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dịka aha otiegwu Naijiria a ma ama bụ Fela Kuti na-akpọtụ maka rite nturuugo 'Lifetime Achievement Awards' na mmemme Grammy nke afọ 2026 maka ịbu onye malitere Afrobeat', ị ma na ụmụafọ si Ọwụwa Anyanwụ so na ndị turu ugo laa ne mume ahụ?

Mmadụ atọ ndị ahụ gunyere Obinna Chibueze nke e jiri Shaboozey mara bụ onye ritere "Best Country Duo/Performance ' maka egwu a kpọrọ "Amen" nke ya na Jelly Roll tikọrọ; Cynthia Chinasa Onyedinmanasu Ukaegbu nke e ji Cynthia Erivo mara na Ariana Grande jikọrọ aka rite nturuugo 'Win Best Pop Duo/Group Performance'; ebe Tyler Okonma nke a na-akpọ 'Tyler, the Creator' ritere nturuugo 'First-Ever Best Album Cover Award'.

Na ndekọ, anyị na-ewetara nkenke ihe ị kwesiri ịmara banyere ha:

Onye bụ Obinna Chibueze nke e jiri Shaboozey mara?

Otiegwu Obinna Chibueze nke e jiri Shaboozey mara

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Obinna Chibueze

Shaboozey bụ aha e jiri mara Obinna Chibueze bụ onye na-eti egwu n'Amerịka.

O tiela ọtụtụ egwu mana egwu ya a maama gunyere nke ọ kpọrọ 'Spider-Man' n'afọ 2018.

O sonyere otiegwu a maama bụ Beyonce gụọ egwu n'afọ 2024.

A mụrụ ma zulite Chibueze na Woodbridge dị na Virginia na mpaghara Washington.

Nne na nna ya bụ ndị Naịjirịa, mama nna ya gụrụ akwụkwọ na Texas ebe nne ya bụ nwaanyị nọọsụ.

Ihe ị ga-amara maka Cynthia Erivo

Ọgụ egwu Cynthia Erivo wetere nturuugo na Grammy 2026

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Cynthia Erivo

Ezigbo aha Cynthia Erivo bụ ọgụ egwu a maama na Briten bụ 'Cynthia Chinasa Onyedinmanasu Ukaegbu'.

Cynthia na-emekwa ihe nkiri ejije ma na-ede egwu.

O so na ndị a họpụtara maka inweta nturuugo na Grammy, Emmy, Oscar nakwa nke a na-akpọ Tony Award.

Nne ya na nna ya so na ndị gbara ọsọ agha Biafra gbaga mba Briten.

Ihe i kwesịrị ịma amak Tyler Okonma

Tyler, the Creator

Ebe foto si, Emma McIntyre/Getty Images

Ezigbo aha 'Tyler the creator bụ Tyler Gregory Okonma.

Tyler bụ onye na-eti egwu, na-ede egwu, ma na-arụpụta egwu na mba Amerịka ma bụrụkwa onye na-eme ejije.

Tyler sokwa mee ihe nkiri ịkpaamụ a na-akpọ Loiter Squad bido n'afọ 2012 ruo n'afọ 2014.

Fela Kuti bụ onye Naịjirịa ọzọ ritere erere na Grammy 2026

Otiegwu a maama bụ Fela Kuti mgbe ọ gara tie egwu na Riviera Riviera Theater, dị na Chicago, Illinois, na Novemba 13, 1986.

Ebe foto si, Paul Natkin/Getty Images

Nkọwa foto, Fela Kuti

E nwepụ mmadụ atọ ndị ahụ ritere na Grammy 2026, onye Naịjrịa ọzọ a kwanyere ugwu bụ Fela Kuti.

Fela Kuti wetere nturuugo a na-enye ndị mere nke ọma n'egwu ha tupu onye ahụ anwụọ.