Ndị ojiegbe gburu ọtụtụ ndị okpukperechi Alakụba maka na ha achọghị isonye ha - Gọvanọ Kwara Steeti

Aka na-achị Kwara Steeti bụ AbdulaRazaq ekwuola na ndị ojiegbe gburu ndị Alakụba 75 n'obodo Woro dị na steeti ahụ n'ụbọchị Tuzde 3 Febụwarị maka ha na-ekwenyeghị na n'ajọ nkuzi ha.
Gọvanọ AbdulRazaq kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'akara X ma kọwaa na ndị ojiegbe ahụ gburu mmadụ 75 ebe otu onye ụlọomeiwu steeti ahụ kwuru na e liela ihe ruru mmadụ 78 ebe a na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ nwereike iru 170 dịka a na-achọpụta ozu ndị ọzọ.
Onyeisiala Bola Tinubu na-atụ aka na ọ bụ ndị otu Boko Haram kpara ajọ agwa a ma nye iwu ka e ziga ndịagha kara aka n'obodo ahụ.
N'aka nke ọzọ, onyeomeiwu na steeti bụ Saidu Baba Ahmed gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ tọọrọ mmadụ 38, mụnye ọtụtụ ụlọ ọkụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ gbara ọsọ.
Ndị nwụrụ gụnyere ụmụ nwoke abụọ e kwuru na ha bụ ụmụ otu onye eze ọdịnala n'obodo.
Kwara Steeti: Ndị ojiegbe wakporo obodo anyị, gbuo ndị mmadụ ka anụmanụ - Ndị bi n'obodo Woro

Ebe foto si, Others
N'ụbọchị 3 Febụwarị 2026 bụ ụbọchị nnukwu ọdachi mere n'obodo Woro dị mpaghara ugwu Kwara Steeti dịka ndị ojiegbe wakporo ha ma gbuo opekatampe mmadụ iri atọ na abụọ, ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ.
BBC mere nnyocha ma chọpụta na ndị ojiegbe wakporo obodo ahụ mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere isii nke mgbede ma malite ịgba egbe aghara aghara iji menye ndị mmadụ ụjọ.
Onye obodo na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara anyị na ndị ojiegbe ahụ siri ike ma gbuokwa ọtụtụ mmadụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ gara zoo onwe ha n'ime ọhịa.
E gburu ndị mmadụ dịka anụmanụ
Ahmed Alhassan kwuru na ọnọdụ a bụ nnukwu ọdachi nyere ha n'ihi na ozu ndị ha hụrụla oge a na-ede akụkọ a karịrị iri atọ na abụọ, dịka a gbakwara ọtụtụ ụlọ ọkụ, nke gụnyere obieze Woró.
Alhassan kọwara na obodo Woro na Nuku bụ agbataobi, ke mere ka ọ raa ahụ ndị ojiegbe ahụ iwakpo ha abụọ otu mgbe.
"Ha gburu ndị mmadụ ka anụmanụ, ha gburu ha ọkpọrọ, ha kefere ha aka n'azụ, ma gbaa ha egbe."
"Oge ha mechara nke a, ha gakwara n'ụlọ okpukperechi nakwa n'obieze.
O kwuru na ọtụtụ mmadụ e gburu bụ ihe na-atụ n'anya n'ihi na ihe ndị ojiegbe na-emekarị oge gara aga bụ ịtọrọ ndị mmadụ iji nweta ego.
Alhassan gbakwunyere na gọọmenti eburula ụzọ zigaa ndịagha n'ime ọhịa dịka ha na-achụ ndị ojiegbe ọsọ ugbua.
Kedụ ihe ndị uweojii kwuru?
Ndị uweojii Kwara Steeti agwala BBC na ọbụ eziokwu na e mere mwakpo n'obodo Woro na Nuku.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kwara Steeti bụ Adetoun Ejire-Adeyemi gwara BBC na ha enwebeghị ike chọpụta mmadụ ole mwakpo ahụ metụtara mana ha ahụla ọtụtụ ozu mmadụ ma hụkwa ndị merụrụ ahụ.
Ejire-Adeyemi kwuru na ha ka na-eme nnyocha mana ha achọpụtabeghị ihe kpatara mwakpo ahụ, kama ụfọdụ ndị a na-enyo enyo gụnyere ndị ojiegbe na ndị otu ISWAP.
Ọ gbakwunyere na e zigaala ndị uweojii na ndịagha na mpaghara ahụ iji hụ na udo lọghachiri ebe ahụ.
Ha gakwara n'ihu kwuo na ha enweghị ike kwuo ma ndị ojiegbe ha tọọrọ mmadụ ọbụla.
Ndị ojiegbe wakporo Woro na Nuku chọrọ imegheri ndịagha anya - Gọọmenti Kwara Steeti
Gọvanọ Kwara Steeti bụ Abdulrahman Abdulrasaq akatọọla mwakpo ahụ ma kasie ndị o metụtara obi.
N'ozi ọnụ na-ekwuru gọvanọ ahụ bụ Rafiu Ajakaye wepụtara, AbdulRazaq kwuru na ndị ojiegbe ahụ na-akpa agwa ndị ọfọogori.
Gọvanọ ahụ kwuru na ndị ojiegbe mere mwakpo ahụ iji megwara ọgụ ndịagha na-alụso ha n'ime ọhịa.
O kwuru na ya na-akasị ndị obodo Woro na Nuku obi maka ihe ndị funahụrụ ha, ọkachasị ndị ahụ tụfutu ndụ ha n'oge ahụ e mere mwakpo.
"Anyị nụrụ na ha dị mmadụ ruru iri atọ na ise maọbụ iri ise na ise nwụrụ anwụ"
Onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara ahụ bụ Sinetọ Sa'idu Baba Ahmed, gwara BBC:
"Anyị nụrụ na e gburu mmadụ dị agbata iri atọ na ise na iri ise na ise (35-45), mana a chọpụtabeghị nke bụ eziokwu."
O kwukwara na ndị ojiegbe ahụ gbakwara ọtụtụ ụlọ ahịa ọkụ.
E wezụga ndị nwụrụ anwụ, ọtụtụ mmadụ gbapụrụ ebe ahụ, gụnyere ndị merụrụ ahụ.
Banyere ma ndị gburu nwoke ahụ ọ tọọrọ ndị ọzọ, Onarebu Ahmed kwuru na ya enweghị ike ikwu nke a.
O kwuru na ndị ojiegbe ahụ gbara obi Emir Woro Obí na ụlọ ahịa ndị dị nso n'obi eze ahụ ọkụ.
"Ndị ojiegbe ahụ dere anyị akwụkwọ ozi na ha na-abịa ịwakpo obodo Nuku na Woro."
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onarebu Sa'idu Baba Ahmed kwuru na e nwere akwụkwọ ozi ndị ojiegbe ahụ degaara ndị isi obodo Nuku na Woro, ebe ha dọrọ ha aka na ntị na ha na-abịa ịwakpo ha.
Onye omeiwu ahụ kwukwara na e zigala ndịagha n'ebe ahụ iji lụso ha ọgụ.
"Mana ha abịaghị mgbe ndị nchekwa nọ ebe ahụ, ha na-awakpo obodo ahụ n'ụbọchị Victory Day."
O kwukwara na ọ bụ n'oge na-adịbeghị anya ka ndị ojiegbe batara n'obodo Nuku, Kwara, n'okpuru ọchịchị Kaiama, dị n'akụkụ Woro.
O kwuru na ha gburukwa ndị mmadụ n'oge ahụ.
Ka mwakpo ụnyaahụ na-aga n'ihu, Onarebu Ahmed kọwara na ndị nchekwa nọ n'ogbe ahụ gbara ọsọ gaa ebe ahụ mgbe ha nụrụ ihe merenụ, mana o kwuru na ọ dịghị ihe akaebe na ha achọtala ndị kpara nkpa nkpa ahụ.
Echiche ọtụtụ mmadụ nwere gbasara ndị mere mwakpo ụnyaahụ bụ na ha si n'oke ọhịa Borgu, nke dị na steeti Niger, nke ha na Kwara nwere okeala, wee bịa.
Ka ọ dị ugbua, gọọmenti Kwara Steeti akatọọla ihe merenụ n'okwu ha, na-egosikwa obi ebere nye ezinụlọ ndị nwụrụ anwụ.
Cheta na e nweela ọtụtụ mwakpo ugboro ugboro na Kwara steeti, ọ kachasị na ngwụcha afọ 2025 dịka a tọọrọ ma gbuo ọtụtụ mmadụ.
























