SEDC ga-ewete mmepe zuru oke n'ala Igbo site ugbua ruo afọ 2050 - Osote Onyeisiala Naịjirịa

Osote Onyeisiala Kashim Shettima na ndị Gọvanọ na-achị ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Ebe foto si, ENSG

Nkọwa foto, Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima na ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ n'oge mmalite ọrụ na mgbape SEDC Vision 2050 n'ala igbo bụ nke e guzobere n’Enugwu.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu gọọmenti Naijira wepụtara maka mmepe mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa a kpọrọ " Southeast Development Commission (SEDC) e wepụtala atụmatụ ha ga-eji malite oru ha.

N'ụbọchị atọ na anọ nke ọnwa Febuwari 2026, ka Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima wuchiri n'isi obodo Enugwu Steeti iji malite ya bụ ọrụ agba nke mbụ ya nke a kpọrọ " Southeast Development Vision 2050"

Shettima kwuru na ya bụ atụmatụ abụghị naani n'akwụkwọ ka edere ya, kama na ọ bụ ọrụ na amalite ngwa ngwa iji weta mmepe na akụkụ niile n'ọwụwa nyanwụ Naịjirịa.

Ebe a rụtagasịrị aka bụ ebe gọọmenti na akwado ya bụ mmepe, gụnyere ịgụ-akwụkwọ, azụmahịa, ịzụ ahịa, irụpụta akụrụngwa , okporoụzọ, ịrụ ụlọọrụ mmepụta ihe, iwe ndị mmadụ n'ọrụ, imepe ọdọụgbọmmiri na River Niger Onitsha, irusi ọdụ ụgbọoloko, nakwa ebe ndị ọzọ.

Gọvanọ ndị na-achị Anambra, Enugwu na Abia steeti

Ebe foto si, ENSG

Nkọwa foto, Gọvanọ Soludo (nke Anambra), Gọvanọ Mba (nke Enugwu), na Gọvanọ Oti (nke Abia)

Gịnị bụ SouthEast Development Commission?

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu guzobere otu a n'afọ gara aga, si ha depụta, chikọba ma malite mmepe alaigbo nke emebeghị ka mgbe agha kwụsịrị na afọ 1960.

SEDC ji aka ha wepụta atụmatụ kwuru na ha ga-arụ ihe niile ha kwadoro site ugbua ruo n'afọ 2050.

Dịka ha siri gụsipụta, ebe ndị ha ga-amalite gụnyere, ịrụ ezigbo okporoụzọ, inye ọrụ, azụmahịa, ịrụgasị akwammiri, imepe ebe ọdọ ụgbọmmiri dị n'Ọnịcha, ụzọ ụgbọoloko na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Gọvanọ Peter Mba na-achị Enugwu steeti na ndị ogbo ya nabatara Osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima, ndị minista. ndị omeiwu na ihe karịrị mmadụ puku iri n'ogige "International Conference Center (ICC) dị n'Enugwu Steeti.

Shettima gwara ndi Igbo ka ha hụta ya bụ ihe dịka inyere aka chọpụta ebe ndị gọọmenti kwesịrị itinye aka mmepe ọsọsọ.

Ndị mmadụ gbakọrọ maka mmalite ọrụ “mmepe Alaigbo” nke SEDC chịkọbara

Ebe foto si, ENSG

Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbakọrọ na ICC Enugwu mgbe osote onyeisiala bịara

Olee ihe ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwụrụ n'ọgbakọ a?

Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mba kwuru na ugbua bụ oge e kwesịrị ịchịkọba akụ na ụba ọwụwa anyanwụ ka ọbụrụ otu dị ọkpụrụkpụ. "Njikọ akụ na ụba steeti ise a ga ebute mmepe na ọganịhu."

"Anyị ga amalite irụ okporoụzọ ga ejikọ steeti anyị ọnụ, okporo oloko na ụzọ azụmahịa ndị ọzọ"

Gọvanọ Mba kọwara na nchekwa na-echere ọwụwa anyanwụ aka mgba, wee kwuo na ọ bụ inweta ezi nchekwa bụ otu n'ihe ndị mbụ otu mmepe alaigbo ga eji kpọrọ ihe.

Gọvanọ Anambra bụ ọkammụta Chukwuma Soludo nọrọ na ya bụ mmemme n'Enugwu gwa ndị otu ahụ ka ha depụta etu odoro anya ụzọ ha ga-esi mee ka mmepe ahụ pụta ihe.

Ọ gwara ha tinye anya n'ihe atọ nke gụnyere nchekwa zuru oke, akụrụngwa e ji enyere ndụ aka ya na ka ego ha ga eji rụọ ọrụ si abata.

Soludo kwuru na ya bụ atụmatụ, Vision 2025 kwesiri ka akpọọ ya "Mmezi Obodo Ka Alụchara Agha Nigeria", " Post War Re-construction" n'olu bekee.