Ụlọikpe enyela Briten iwu ka ha kwụọ ezinaụlọ ndị ọrụ koolu e gburu n'Enugwu n'afọ 1949 nde paụnds 420

Akpụrụakụ ndị ọrụ Koolu

Ebe foto si, Centre for Memories

    • Onye dere ya, Jean Otalor
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe enyela gọọmentị mba Briten iwu ka ha kwụọ ezinaụlọ ndị ọrụ koolu mmadụ 21 e gburu n'afọ 1949 oge ndị ọcha ka na-achị Ọwụwa Anyanwụ Naijiria ego dị paụnds 420 dịka ego iti aka n'obi.

Ndị uweojii n'oge ọchịchị ndị ọcha gụnyere ma ndị isi ojii ma ndị ọcha gbagburu ndị ọrụ Koolu na-agba abụbụọrụ maka ọnọdụ ha ji arụ ọrụ .

E merụrụ ọtụtụ ahụ n'ihe ụlọ mgbasaozi News Agency of Nigeria kọwara dịka otu n'ime ihe mkpagbu mere n'oge Briten na-achị Naijiria.

Ndị akụkọ ihe mere mgbe ochie doro anya kwuru na ogbugbu ahụ e gburu ndị ọrụ koolu ahụ bụ ihe kpalitere otu ndị na-eti mkpu megide ọchịchị ndị ọcha nke so bute nnwereonwe n'afọ 1960 ka afọ 11 gachara.

Gọọmentị Briten ekwuola na e zibeghị ha ozi banyere mkpebi ahụ nke mere na o nweghị ihe ha ga-asa.

Otu onye na-ekwuru Gọọmentị mba Britan gwara BBC na o nweghị onye nọchitereanya gọọmentị ha oge a na-ekpe ya bụ ikpe.

Ezinaụlọ ndị o metụtara nakwa otu ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye, etiela mkpu okwu iti aka n'obi ọtụtụ afọ.

N'ikpe nke Ọkaikpe Anthony Onovo kpere n'Enugwu, ọ kọwara ogbugbu e gburu ọtụtụ ndị mmadụ n'igwe dịka ; ihe megidere iwu, dịka ụlọ ntaakụkọ NAN si kwuo.

Ọkaikpe Onovo mere ka o doo anya na ọ bụ mba Briten ka e kwesiri ịta ụta ma bụrụ ndị kwesiri ịkwụ ụgwọ iti aka n'obi nye ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ.

Ọ gwara Ụlọikpe Ukwu dị n'Enugwu steeti na ihe ndị ọrụ na-achọ bụ ka a wụlite ọnọdụ ha ji arụ ọrụ, o kwuru na n'agbanyeghị na ha anaghị eme ngagharịiwe ike ọbụla megide ndị ọchịchị, a gbagburu ha.

Ndọ ọrụ koolu ahụ na-arụ ọrụ na ogige koolu dị n'Iva Valley, na-eme ngagharịiwe megide ọnọdụ ha ji arụ ọrụ, mgbanwe n'ego a na-akwụ ha maka etu ha si acha, nakwa ọtụtụ ụgwọ e ji ha.