E nwela nyọcha ọbara ịma nwaanyị ga-amụkwo nwa

Nwaanyị dị ime

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaanyị dị ime ime nyocha ahụ dị mkpa maka ịma ọnọdụ ahụike ya na nwa ya

Nchọpụta ndị ọkamụta mere na mba Amerịka na-egọsi na enwela nyocha ọbara nwere ike igosi nwaanyị dị ime ga-amụ nwa n'oge erughi eru.

David Stevenson, onye duru ndi otu ya na ụlọọrụ nchọpụta a kpọrọ, 'March of Dimes Prematurity Research Centre' nke dị na mahadum Stanford dị na mba Amerịka kọwara usoro ọhụrụ ahụ bụ ụzọ ´iji gee nti na mkparitaụka na-aga n'etiti nne, nwa nakwa alọnwa" nke ụfọdụ ma dịka 'ichi (placenta) na enyeghị afọime nsogbu ọbụla.

Stevenson kwuru na nchọpụta ọhụrụ ga-enye aka ịma ọnwa ole nwa nọ n'afọ dị.

"Site ilile ọbara nne, anyị nwere ịhụ ka jiini (gene) si aga oge afọime na-aga nke ọma ma chọpụta ma egwu dagharia n'usoro a nke ga-egosi dọkịta na ihe amaghị kwụrụ nwere ike ibute ịmụkwo nwa na-eme."

Stevenson kwuru na ịganihu nna nyocha a nwere ike inye aka ka amata jiini nakwa ụzọ ha si egosi ihe butere ịmụkwo nwa nakwa ụzọ a ga-esi gbalahụ nsogbu ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ