APC sị na ọ bụ Igbo nwe onyeisiala n'afo 2023
Akụkọ ndị dị mkpa taa
Ndị Igbo nwe onyeisiala na 2023 - APC

Ebe foto si, Getty Images
Ndị oti mkpu onyeisiala Buhari na mpaghara ọwụwanyanwụ akatọọla okwu minista na-ahụ maka ọkụ bụ Fashola kwuru na ọchịchị ga-alọghachị ndịda n'afọ 2023.
Otu a kwusiri ike na ọ bụ oge ndị Igbo ịhọpụta onyeisiala n'afọ 2023.
Ndị ntọrọ ụgbọmmiri

Ebe foto si, EPA
Ụlọọrụ ụgbọmmiri Swiss ekwuola na atọhapụla ndị ọrụ ya mmadụ iri na abụọ atọrọ n'ihe karịrị otu ọnwa gara aga n'akụkụ osimmiri nke Naịjirịa.
Ọzọ gọọmentị mba Poland ekwuola na atọrọla ụmụafọ ha asatọ na mmadụ anọ ndị mba ọzọ nọ n'ụgbọmmiri si Angola na-abịa Naịjirịa.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, AFP
Otu nwaanyị agbagbuola onwe ya n'ogbunigwe ma merụọ mmadụ asatọ ahụ n'obodo Tunis bụ isi ọchịchị mba Tunisia.
Minista ime obodo nke mba ahụ kwuru na mmadụ asatọ a merụrụ ahụ bụ ndị uweojii.
N'egwuregwu
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Dịka ọ dị ugbua ndị mmadụ ji ifuru na akwa na-akwanyere Vichai Srivaddhanaprabha ugwu bụ onye nwe Leicester City nwụrụ na mbere ụgbọelu helịkọpta.
Ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede a bụ Nursara Suknamai and Kaveporn Punparen na-arụrụ ya ọrụ, Eric Swaffer na enyi ya nwaanyị bụ Izabela Roza Lechowicz bụ ndị ọkwọụgbọ sokwa nwụọ.
N'aka nke ọzọ Manchester City ga-ezute Tottenham n'abalịa n'asọmpi Iko Premier.
Nkeji abalị
Ihe nkiri
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ
N'otu aka ahụ, ụgbọelu ọzọ bu mmadụ otu narị na iri asatọ na asatọ dabara n'oke osimiri n'obodo Jakarta dị n'Indoneshia.

Ebe foto si, AFP
Ndị na-egwu mmiri na Jakarta ebidola ịchọ ndị nọ n'ụgbọelu ahụ, ruo ugbua, ezinaụlọ ndị ụgbọelu ahụ bu na-eche akụkọ ga-apụta na ya.
A gụpụtala ụfọdụ ngwongwo ha dịka akpa, ekwentị nakwa ihe ndị ọzọ na mmiri.
Nnamdi Kanu
Akpụrụla Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu IPOB n'ọnụ ọzọ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Onye ọbụla na-ekwu maka Kanu ka ọ pụtara n'onyonyo ndị mba Izrel ebe ọ gwara onye ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ na ndị gọọmentị Naịjirịa ekweghị emezu ihe ndị ọ gwara ha mee, nke gụnyere ịtọghapụ Ibrahim El-Zakzaky nakwa Sambo Dasuki.
Anthony Anenih alaa mmụọ
Dimkpa adaala ka Anthony Anenih bụ otu n'ime ugwu a na-arị atụ egwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa lara mmụọ.

Ebe foto si, @bukolasaraki/Twitter
Akụkọ kwuru na Anenih dị afọ iri asatọ na ise nwụrụ n'Abuja ka ọ rịachara ọrịa ihe ruru otu izuụka.
Gụọ akụkọ gbasara Anenih n'uju ebe a: Ihe ise ị na-amaghị maka Tony Anenih
N'egwuregwu,
Ndị otu Barcelona lụrụ otu Real Madrid dịka nwaanyị na be ndị Madrid ka ha zutere n'asọmpi El-Classico.

Ebe foto si, Getty Images
Ha ji ọkpụ goolu ise a satara otu (5-1) gwọọ Madrid ịba n'ogige Nou Camp bụ be ndị Madrid. Ihe onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ "a ga-achụ Julen Lopetegui n'ọrụ?"
Gere akụkọ ndịa n'otu nkeji ebe a:
Ihe nkiri nke taa












