Junaid Mohammed: Ihe ise dị mkpa o kwuru maka ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo akatọọla Junaidu Mohammed maka ịkwu na ọkwa Onyeisiala akaghị erute Ndigbo aka n'afọ 2019 sị na ọ bụ mmegbu.
Junaid Mohammed, onye bụbu onye nnọchịteanya n'Ụlọomeiwu Nta kwuru na mkparịtaụka ya n'akwụkwọ ntaakụkọ, Sun, nwere ụbọchị Satọde, kwuru na atụmatụ ị na-eke ọkwa onyeisiala onye o ruru ọ chịa, akụsala.
O kwukwara na ebe ndị Ugwu Naijiria nwere mbu, nwe nfụ iji nweta ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.
Mana ndị nwere agba n'Igbo na-ekwu n' okwu ya akwụghị ọtọ.
Onyeisi otu Njikọ Igbo Forum bụ Rev Okechukwu Obioha kwuru na mmegbu dị na ya.

Ebe foto si, Okechukwu Obioha
"Mba ọ dịghị mma, mmegbu dị na ya."
"Ọ bụrụ na a gbasowe usoro onye o ruru, ọ chịa, kemgbe 1999 rue 2023, ọ bụ naanị ndị Ọwụwa-Anyanwụ bụ ndị achịbeghị."
"E kwesịrị iji 2013 medaa Ndigbo chọrọ Biafra obi."
"E mere ya ndị Yoroba were Obasanjo tie ha aka n'obi maka MKO, were Jonathan tie ndị Niger-Delta n'obi maka ọgbaghara ndị mba mmiri."
Ịsa Junaid okwu dịka iji egbe agba nwa nza- Nnia Nwodo

Ebe foto si, Nnia Nwodo
N'okwu ya, onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru na inye Junaid ọsịsa dịka iji egbe agba nwa nza.
"Ọ naghị ata okwu eze tupu o kwuo ya."
Nwodo gara n'ihu kwuo na 2023 ka tere aka ibido kwuwe maka ya.
Ndigbo azụwala okwe maka 2023- Udeze
Kenneth Udeze bụ odeakwụkwọ otu jịkọrọ otu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị (CUPP) kwuru na, "Onye sị Ndigbo agaghị ewere ọchịchị na 20123 gaa laba hiwe ụra."
"N'ihi na Igbo na-azụ okwe etu anyị ga-ezi weghar ọchịchị."
Udeze onye bụkwa onyeisioche otu pati AA sị, "Ndigbo abịaghị ile ihe nkiri na Naijria."
Cheta na tupu e me ntuliaka 2019, ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị APC kwuru na Ọwụwa-Anyanwụ na Ọdịda-Anyanwụ kwere ndị be ha ṅkwa na a ga-enye ha ọkwa onyeisial n'afọ 2023 ma ọ bụrụ na ha tụnyere Buhari.
Na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ Sun nwere ụbọchị Satọde, Mohammed na Ndigbo na-atụụ naanị onwe ha vootu ma chọọ ka ndị ọzọ tụnyere ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọ sị, "Lee ndị si ọwụwa anynwụ na ntuliaka ikpeazụ e mere , ha niile tụrụ Atiku, ma na-atụ anya na ndị ọzọ ga-esi ebe ọzọ tụnyere ha."
Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ndị ọzọ tụnyere gị, ga chọọ ndị Naijiria ị ga-akwụnyere. Ikekwa, na afọ 2023, Kanu ga-apụta manye ndị Naijiria ndị ọzọ ha tụnyere ha. Ocụ̄ichị onyekwuo uche ya bụ inyem, ma eneye gị."
"Lee ihe na-eme ugbua, anyị ebiddola agba nke abụọ ọchịchị Buhari, ndị mmadụ azọwala 2023, ndị Yoroba sị nọ bụ ha ka o ruru. Ka o si ruo ha, amaghị m."
Leee ọkwụ ndị ọzọ o kwuru :
2. Etu ntuliaka 2019 siri gaa ejughị mafọ n'ihi ọgbaghara so ya na agwa ndị ọ bụ ọrụ ha ịhazi ntuliaka.
O wechighara elekere ọchịchị onye kwuoucheya azụ
3. Atiku maa na ya dara ntuliaka e mere.
O nwere ikike dịka Iwu siri kwuo ịgba akwụkwọ n'ụlọikpe mana ụzọ o si achụ ya bụ okwu ga-emebi ihe
4.Ekwenyeghị ma ọchịchị Muhammadu Buhari n'agba a ga-adị iche na nke mbụ
5. O nweghị mgbe m rịọrọ Buhari ọkwa ( n'ọsịsa ajụjụ na ihe ọ ji akatọ Buharị bụ maka na onye ghị ọkwa)









