'Ndị ohi ji egbe wakpoo anyị na Upper Iweka n'ehihie ọcha'- Chuma

Akwa mmiri

Ebe foto si, Getty Images

Ohi na mpụ na-arịzi ibe ya elu n'Upper Iweka dịka ụfọdụ ndị bị n'Onicha si gwa BBC Igbo.

Chuma toro ma birikwa n'Onicha kwuru na otelarịị mkpamkpa a malitere n'ebe ahụ ma na-ekwu na ikpesagoduru ndị uweojii onweghị ihe ha ga-eme.

O kwuru si, "Gọọmenti Obiano dowere ahụ ka onweghị ihe na-eme n'ebe ahụ".

O kwuru na o si Upper Iweka ala ahịa kwa ụbọchị ma na-ekwu na ndị omekome awakpola ya ugboro ugboro n'ụzọ ahụ.

Chuma kwuru na ndị omekome Upper Iweka ji egbe wakpo ya na ndị so ya n'elekere ise nke mgbede ọcha.

O kwuru na ha dị mmadụ abụọ baa 'keke' si Main Market aga Owerri Road maọbụ Ochanja.

Mgbe ha pụtara n'ụzọ Obodo ukwu ama ama n'Upper Iweka, ndị omekome bu egbe gba ha okiri ma si ha wekọta ihe niile ha ji.

N'okwu ya, ihe a na-eme ebe ndị mmadụ na-agafe ọfụma mana o nweghị onye tụpụrụ ọnụ maọbụ gbata ọsọ enyemaka.

O kwuru na ha megodu mkpesa n'aka ndị uweojii, ọ dịka okwu bara ọhịa makana o nweghị ihe ha ga-eme maka ya.

Aha onyonyo, Igbo People: 'Ndị Igbo, ndị Bini na ndị Yoroba si otu ebe pụta'

Ihe gọọmenti Anambara kwuru ọhụrụ a maka mkpamkpa a

BBC Igbo Kpọrọ Don Adinuba bụ kọmishọna mgbasa ozi Anambra steeti mana o kwuru na ọ bụ okwu asị na-efegharị n'elu soshal midia.

Ihe ndị uweojii kwuru

Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti azabeghị ekwenti ya ruo ugbua gbasara mkpụ ndị bi Onicha na-eti ọhụrụ a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: