Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Ọrụ agaghị akwụsị n'akwa Niger nke abụọ - Fashola
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:

Ebe foto si, Getty Images
Minista na-ahụ maka ọrụ na ọkụ bụ Babatunde Fashola, ekwuola na ebidola ọrụ n'elu akwa Niger nke abụọ, ma kwukwaa na ọ hụghị ihe ga-eme ka a kwụsị ọrụ ebe ahụ ọzọ maka na gọọmentị amapụtala ego e ji arụcha ya.
Ebe ọzọ na Naịjirịa

Ebe foto si, @HQNigerianArmy
Ndị agha nchekwa Naịjirịa akpọrọ Operation Lafiya Dole kwuru na-anwụchiri otu nwaanyị yi uwe ogbunigwe baa n'ụlọ ndị alakụba dị na Gashua, Yobe Steeti n'isi ụtụtụ taa.
Anwụchiri nwaanyị a dịka ọ na-achọ ịgbapụ ogbunigwe ahụ mgbe ndị a na-achọ ikpe ekpere ụtụtụ.
Etu a ka ndị mmadụ gaara esi nwụọ maka ikperechi Ha.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Reuters
Achọpụtala na ụlọọrụ Damojh nwe ụgbọelu ahụ kpọkasịrị ma gbuo mmadụ otu narị na iri na mba Cuba nwetara mkpesa maka ọnọdụ ụgbọelu ha n'oge gara aga.
Mkpesa ndị a gụnyere ibufe oke ibu, ingin ịkwụsị ọrụ nakwa nkwụsị igwe na-enye ya ọkụ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Dịka otu Chelsea buliri iko FA, ị ma na onye nwe ha abịanwughị lelee ka ha si merie?
Akụkọ kwuru na Roman Abramovic abatanwughị England maka na o megharịnwughị akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ nke a kpọrọ Visa n'oge.
Gee nkeji anyị na mgbede a:
Ihe nkiri taa
N'ime izu agara aga, ndị otu abuo pụtara n'APC Imo Steeti gara kpesara ndị isi ha n'Abuja ihe na-esere ha. N'ihe onyonyo a, TOE Ekechi bụ otu n'ime ndị na-asị Gọvanọ Okorocha kwapụkwapụ kọwaara BBC ebe ya bụ mmiri siri banye opi ụgbọgụrụ.











