Third Mainland Bridge: Agbatikwuola oge mmepe akwammiri 'third mainland' nke Legọs

Gọọmentị kwuburu na a ga-emepe akwammiri 'third mainland bridge' n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Febrụwarị, mana ọ gaghị enwezi isi ugbua.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. 'Ọnwụ Michael Nnadi akụzịghịrị Naịjirịa ihe ka ọ gbachara otu afọ' Matthew Kukah

    Michael Nnadi

    Ebe foto si, Catholic News Agency

    Dịka ọ gbachara otu afọ ndị ogbu ara ọbara tọchaara ma gbufuo nwaadị Igbo bụ Michael Nnadi na-aga ọzụzụ ụkọchukwu na Seminary dị na Sokoto, Bishọpụ ebe ahụ bụ Matthew Kukah etiela mkpu na ọnwụ ya bụ nwaamadị gbara afọ 18 enweghị ihe mgbanwe ọ nwetere n'ọrụnchekwa na Naịjirịa.

    Ọ sị, "ọ bụ ihe mwute na ka ọgbachara otu afụ, anyị azọbeghị ọkpa njem iru ebe anyi kwesiri ga.".

    Kukah kwuru nke a na-ncheta ọnwụ Michael Nnadi mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Febuwarị 2021.

  2. Nkeji Coronavirus

  3. Mmadụ 1528 agbakeela n'ọrịa coronavirus

    ncdc

    Ebe foto si, ncdc twitter

    Ọnụgụgụ ndị butere ọrịa coronavirus n’ụbọchị Monde bụ narị ise na iri asaa na anọ dịka ngalaba NCDC si kwuo.

    Ọṅụọgụgụ ndị gbakerela site n’ọrịa ahụ n’ime Monde ahụ bụkwa mmadụ otu puku na narị ise na iri abụọ na asatọ.

    Cheta na n’ụbọchị ole gara aga ndị butere ọrịa a na Naịjirịa na-agafe otu puku kwa ụbọchị.

    Nke a mere na ndị niile butere ya bụ ọrịa na Naịjirịa gafere otu puku narị na iri anọ na isii,

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Daalụ nụ ndị ọma!

    Anyị na-anabata ụnụ dịka ụnụ na-esonye anyị ịmata akụkọ niile gbara ọkpụrụkpụ n'ala Igbo, nakwa ala Naịjirịa.

  5. Ka chi fo nụ

    Igbo ndị ọma, anyị abịala n'isi njedebe nke mgbasaozi taa.

    Anyị ji n'aka na emume Valentine gị gara nke ọma.

    Ka ọ dị nụ echi.

  6. Ọgwụ mgbochi coronavirus abụghị akara 666 - Onyeisi ụka Anglican

    Henry Ndukuba

    Ebe foto si, Anglican Church Nigeria/Reuters

    Onyeisi ụka Anglịkan na Naịjirịa bụ Henry Ndukuba agwala ụmụ Naịjirịa ka ha kwụsị ịtụ egwu maka ọgwụmgbochi coronavirus.

    Primate Ndukuba kwuru nke a n'ọgbakọ ndị isi ụka Anglịkan nke e nwere na ụlọụka 'All Saints' dị n'Ọnịcha malite n'ụbọchị asatọ ruo ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Febrụwarị.

    N'akwụkwọ ozi si n'ọgbakọ ahụ nke ụlọntaakụkọ News Agency of Nigeria hụrụ, Primate Ndukuba gwara ndị mmadụ ka onye ọbụla pụta n'igwe gbaa ya bụ ọgwụ mgbochi mgbe ọbụla e bidoro ịgba ya na Naịjirịa.

    "Covid-19 abanyelarị n'ime obodo anyị dị icheiche," Primate Ndukuba kwuru.

    "Ọrịa Covid-19 egbuola ọtụtụ ndị ụka anyị, mana ndị mmadụ ka na eme ihe masịrị ha, na-eche na ọ bụ ọrịa ndị ọgaranya maọbụ na ọbụghị eziokwu."

    "Coronavirus bụ eziokwu. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebugharị akụkọ ụgha dị icheiche maka ọgwụmgbochi Coronavirus, ha na-ekwu na onye ọbụla gbara ya ga-enwe akara 'anti-Christ bụ 666."

    "Ndị na-agba ndị mmadụ ọgwụmgbochi coronavirus anaghị enye ndị ahụ akara 666. Ọ dị ka ọgwụmgbochi ndị ọzọ eji egbochi ọrịa."

    "Ọ bụ eziokwu na ihe ndị na-egosi ọgwụgwụ oge ejupụtala ụwa, mana oke mmekpa ahụ nakwa ịta ahụhụ abịabeghị."

    "Onye ọbụla kwesịrị ịkpachapụ anya ma hapụ ịgbasa ozi asị nke nwere ike imebi ndụ ndị be anyị."

  7. Agbatikwuola oge mmepe akwammiri 'third mainland' nke Legọs

    Akwammiri 3rd mainland

    Ebe foto si, BBC/AYO BELLO

    Mmepe akwammiri 'third mainland' nke Legọs agaghị abụzị n'ụbọchị Mọnde, abalị iri na ise nke ọnwa Febrụwarị dịka gọọmentị kwuburu na mbụ.

    Ngalaba na-ahụ maka ọrụ na Naịjirịa kọwara na ha arụchabeghị ọrụ ha ji n'aka n'elu akwammiri ahụ.

    Onyeisi ngalaba a na Legọs bụ Olukayode Popoola kọwara na ihe mere ha ji gbuo oge n'ọrụ ahụ bụ maka oge ha gburu mgbe e mere ngagharịiwe End SARS n'ọnwa Ọkụtoba.

    Popoola kwuru na a ga0emechi akwammiri ahụ kpamkpam malite n'ụbọchị Fraịde, abalị iri na itoolu ruo Sọnde abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Febrụwarị iji rụchapụ ihe fọrọ afọ.

  8. Ọrịa Ebola amalitekwala ọzọ na mba Guinea

    Ebola

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Guinea ekwupụtala na ọrịa Ebola amalitekwala ịgbasa na mba ahụ ọzọ.

    Ka ọ dị ugbua, ọrịa ahụ egbuola mmadụ atọ, ebe nnyocha gosiri na mmadụ ise ọzọ butekwara ya.

    Nke a bụ nke mbụ ọrịa ebola na-egbu mmadụ na mba Guinea kamgbe afọ 2016.

    Cheta na ọ bụ na Guinea ka Ebola malitere ịgbasa n'afọ 2013, sizie ebe ahụ fesaa mba Afrịka dị iche iche ma gbuo ihe karịrị puku mmadụ iri na otu (11,000).

    N'ụbọchị olemole gara aga, mba Democratic Republic of Congo kwukwara na ha chọpụtara nje Ebola n'ahụ ụfọdụ mmadụ na mba ha.

    Enwebeghị ọgwụ nwere ike ịgwọ Ebola kpamkpam ugbua, mana ọgwụ dị nke nwere ike inyere ndị butere ya aka ka ha dị ndụ.

    Ebola nwekwara ọgwụmgbochi nke otu WHO nyerela nkwado ka amalite itule ya n'ahụ ndị nwere nje ahụ.

  9. ISWAP awakpola ndị agha Naịjirịa na Borno gbuo mmadụ atọ

    Ndị agha Naịjirịa mmadụ atọ tụfuru ndụ ha oge ndị ọgụ ụka alakụba bụ ISWAP wakporo ha na Borno steeti.

    Otu onye agha gwara ndị ntaakụkọ AFP na ndị agha abụọ ọzọ merụkwara ahụ na mwakpo ahụ nke mere na mgbede Fraịday.

    Onyeagha ahụ kwuru na ụgbọala ndị ahụ ji aga manyere ụkwụ n'ogbunigwe nke ndị otu ISWAP zoro n'ụzọ, tupu ndị ekperima ahụ esi n'ime ọhị mapụta malite ịkwaha mgbọ.

    Nigerian Army
  10. UFC 258: Kamaru Usman akụọla Gilbert Burns ihe 'Tinka kụrụ Pan'

    Kamaru Usman

    Ebe foto si, getty

    Kamaru Usman bụ ọkaibe n'asọmpị Welterweight jidesiri ọkwa ahụ ike dịka ọ kụpụrụ Gilbert Burns ọkụrụ n'anya n'ọgụ UFC 258.

    Ihe Burns bụ onye Brazil mere Usman dị afọ iri atọ na atọ na mbido ọgụ ahụ, gbagọjuru ya anya.

    Mana n'oge na-adịghị anya, Usman tụgharịrị ma nyụwa Burns ikpakwụ.

    Usman emeriela ọgụ UFC ruru iri na atọ(13)ma gafee Georges St-Pierre na mmeri kachasnu na Welterweight.

    Mgbe ọgụ biri ha abụọ makọrọ, ebe Burns na-ebe akwa mana Usman dịka onye na-ejidesi onwe ya ike ka ọ ghara ibepụ anya mmiri.

  11. Mmadụ 1143 butere ọrịa covid 19 n'ụbọchị Febuwarị 13,2021

    Ncdc

    Ebe foto si, ncdc twitter page

    A hụrụ ọrịa covid 19 n'ahụ mmadụ otu pụkụ , otu narị, iri anọ na atọ n'ụbọchị Febuwarị iri na atọ nke afọ 2021 dịka ngalaba Nigeria Center For Disease Control si depụta.

    Enugu chitara mmadụ iri asaa na abụọ(72) , Imo steeti chitara iri ise na asatọ (58) ebe Ebonyi chitara iri na asatọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Ụnụ asaala chị.

    Bute oche nọnyere anyị ka anyị wetere unu akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọku na mba ụwa nile.

  13. Ndị otu nzuzo na-awakpo ndị POS n'Aba, anya ga-ahụ ha ndị mmụọ - Nnamdi Kanu

    Nnamdi Kanu

    Ebe foto si, Facebook/Mazi Nnamdi Kanu

    Mazi Nnamdi Kanu adọọla ndị ekperima na-awakpo ndị ọrụ POS n'Aba aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ.

    POS bụ igwe ọgbara ọhụrụ nke mmadụ nwere ike iji were ego n'akara ọbaego ya.

    Nnamdi Kanu kwuru nke a na mgbasa ozi o mere n'akara Facebook ya na mgbede Satọde.

    O nyere ndịọrụ nchekwa Eastern Security Network iwu ka ha gbaa mbọ nwụchie onye ọbụla wakporo ndị POS ọzọ.

    Nnamdi Kanu kwuru na onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye otu nzuzo n'ala Igbo ga-eji anya ya hụ ihe ndị ESN ga-eme ya.

    Onye Biafra ọbụla esonyekwala na ngagharịiwe na Naịjirịa

    Nnamdi Kanu

    Ebe foto si, Youtube screengrab

    Nnamdi Kanu dọkwara ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ aka na ntị ka ha ghara isonye na ngagharịiwe ọbụla ọzọ a na-eme na Naịjirịa.

    O kwuru na ndị nchekwa Naịjirịa na-achọ ọbara ha ga-awufu.

    "Ọ bụrụ na ọbụghị 'revolution' onye ọbụla esonyela na ngagharịiwe ọbụla," Nnamdi Kanu kwuru.

  14. Manchester City ebeela Tottenham kịrịkịrị ka suya

    Manchester City vs Tottenham

    Ebe foto si, Getty Images

    Pep Guardiola egosila Jose Mourinho nkarị dịka Manchester City ji ọkpụ goolu atọ asataghị ihe ọbụla merie Tottenham na mgbede Satọde.

    Manchester City ji mmeri a guzosie ike n'elu tebulu 'English Premier League dịka ha nọzị n'akara iri ise na atọ.

    Rodri nyere otu goolu ebe Ilkay Gundogan nyere goolu abụọ nke Man City ji nweta mmeri.

  15. Mario Draghi abụrụla Praịm Mịnịsta mba Italy

    Mario Draghi

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Mario Draghi

    E duola Mario Draghi n’iyi ọrụ dịka Praịm Mịnịsta ọhụrụ nke mba Italy, dịka olileanya na-arị elu na ọchịchị ya ga-enye aka wepụta mba ahụ na mkpamkpa coronavirus na-akpa.

    Draghi rụburu ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ European Central Bank malite n’afọ 2011 ruo 2019.

    A na-atụ anya na Draghi ga-ewepụta atụmatụ doro anya iji buso ọrịa coronavirus agha na mba Italy.

  16. Etinyela mmachi mkpagharị na Oyo steeti n'ihi ọgbọaghara

    Gọọmentị Oyo steeti etinyela mmachi mkpagharị nke bekee kpọrọ curfew na mpaghara ụfọdụ na steeti ahụ dịka ọgbaaghara malitere n’ụtụtụ Satọde.

    Mmachi mkpagharị a ga-amalit n’elekere isii nke abalị ruo elekere asaa nke ụtụtụ kwa ụbọchị ruo mgbe gọọmentị ga-akwụsị ya.

    Akụkọ si Oyo steeti kwuru na ụfọdụ ndị ntorobịa wakporo ụlọahịa ebe ndị si mpaghara Ugwu na-ere ahịa.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  17. Ụjọ ka ji ndị mmadụ na Nkpor n'ihi mgbagbu agbagburu ndị ntorobịa atọ

    Emeka Mbagha
    Nkọwa foto, Emeka Mbagha bụ onyeisi otu jikọrọ obodo Nkpor niile

    Anya mmiri na iru uju juputara na Nkpor dị n'Anambra steeti ugbua dịka ndị amaghị ndị ha bụ gburu ụmụ okorobia atọ ebe ha na-eme nzụkọ obodo.

    'President General' Obodo Nkpor bụ ichie Emeka Mbagha ji obi nwute kọọrọ BBC Igbo etu ya bụ ọdachi siri mee n'ụbọchị Wenezde, abalị iri nke ọnwa February 2021.

    Mbagha kwuru na ọ bụ nzukọ ha jiri họpụta ndị ohụrụ ga na-anakọta ụtụ n'obodo Nkpor ka ha mechara, were duo ndị ọhụrụ ha họpụtara n'iyi ọrụ.

    Oge e mechara ọgbakọ a, ụmụ okorobịa nọdụzịrị na-aṅụ mmanya oge otu ụgbọala gbapụtara ebe ahụ, ụmụ nwoke abụọ mapụtara n'ime ya malite ịgba egbe, nke gburu mmadụ atọ.

    Nkpor Civic Centre
    Nkọwa foto, Nkpor Civic Centre ebe ya bụ njinji nọrọ jie

    Mbagha kwuru na ya bụ ihe gbagwojuru ya anya n'ihi na onweghị onye ya na ibe ya na-ese okwu ma ya fọdụzịa ịzọ ọchịchị.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uwe ojii Anambra Steeti akpọpụtala aha mmadụ atọ ahụ lara mmụọ.

    Ha bụ Izuchukwu Idemmili - 32 years; Chidi Oforma - 31 years; na Bobgo Muoghalu 45 years.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Haruna Mohammed kwere nkwa na aka ga-akpara ndị ọṅụ ọbara ahụ n'oge adịghị anya.

    Mazi Mbagha kwuru na Nkopr amalitegokwa zụwa ahịa, mewe njem ma kwukwaa na egwu ka ji ndị mmadụ.

    Mbagha kọwakwara na ọbụ iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu mere ya na ndị obodo jiri were igodo kpochie ya bụ ụlọ Nkpor Civic center.

  18. Leicester City vs Liverpool: Leicester City ayọọla Liverpool ka akpụ nọrọ abalị atọ

    Leicester City Vs Liverpool

    Ebe foto si, Getty Images

    Liverpool yọkasịrị ka akpụ abanyere mmiri n'ụbọchị Satọde oge ha zutere ndị Leicester na be ha n'ụbọchị Satọde.

    Ọkpụ goolu atọ a satara otu ka ha ji kụọ Liverpool isi aba okpu.

    Mohammed Sallah bu ụzọ nyetere Liverpool goolu, mana Maddison, Jamie Vardy na Barnes nyere goolu atọ n'ime nkeji isii n'agba nke abụọ nke asọmpi ahụ.

    Mmeri a bugoro Leicester City n'ọkwa ndị nke abụọ na tebulu 'English Premier League', ebe Liverpool gbadara bụrụ ndị nke anọ.

    Chetakwa na Manchester City ji ọkpụ anọ asatara otu merie Liverpool n'izuụka gara aga.

  19. Manchester City na Tottenham Hotspur ga-ezite n'elekere asatọ nke abalịa

    Manchester City na Tottingham Hotspur ga-ezute n'elekere ise nke mgbede Satọde n'ọgbọegwụregwụ Etihad. Sergio Aguero bụ onye ghagoro egwubọọlụ ugboro iri na otu nwereike ịsọ Man city gbaa taa.

    Manchester City na Tottenham

    Ebe foto si, Press Association

  20. Ogbunigwe gbara na Mogadishu

    Ebe foto si, Reuters

    N'Afrịka, ụgbọala e kpojuru ogbunigwu n'ime ya agbariele na-akụkụ ụlọ onyeisiaala na Mogadishu, isiobodo mba Somali .

    Ndị uweojii mba ahụ sị na ya bụ ụgbọala gbariri mgbe aha wụwara ya mgbọ ịkwụsị ya ka ọ ghara ịgbaba obi onyeisiala ha.