Gọọmentị Abia Steeti ọ kwụchaala ndị nwe ala n'ọdọụgbọelu Nsulu ụgwọ? Lee ihe anyị ma

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook
Ọtụtụ ndị nwee ala n'obodo Nsulu dị n'okpuruọchịchị Isiala Ngwa North bụ ebe gọọmentị Abia Steeti na-arụ ọdọụgbọelu emeela ngagharịiwe maka na gọọmenti akwụbeghi ha ụgwọ ala ha e ji arụ ọdọụgbọelu ahụ.
Ihe onyonyo nke na-efegharị na soshal midia gosiri ka ndị a na-akwa arịrị na-ekwu na kamgbe atụmatụ ahụ malitere na o nweghi ego ọbụla rutere ha aka dịka ego iti aka n'obi maka ọrụ ugbo ha e mebisiri.
Otu nwoke kpọrọ onwe ya Maazị Gabriel Echezolam Ukaumunna kwuru na ha na-eme ihe onyonyo ahụ iji mee ka o doo ụwa anya na ha enweteghi ego n'aka gọọmenti banyere ala ha.
Ọ sị na Gọvanọ Alex Otti nọọrọ n'ụbọchị 31 Mee, 2025 kwuo na ọ kwụchaala mmadụ pasentị 100 nwee ala na Nsulu ụgwọ maka ịrụ ọdọụgbọelu ahụ.
Na nke a mere ka ndị obodo gụnyere ụmụnwaanyị ajadu jiri na-ebe akwa na-ejụ "ọ bụ etu a ka ala anyị ga-eji fuo n'ụkpọrọ?".
Ukaumunna kwuru na kamgbe ahụ rute ugbua, na ha ka na-eche ka gọọmenti mee ihe banyere ala ha mana o nwebeghi ihe ha hụrụ.
Ụfọdụ obodo ndị ihe a metụtara gụnyere Umuomainta na Umuelenwa kwuru na ọ bụ naanị ihe ruru pasentị 10 n'ime ha ka gọọmentị kwụrụla ụgwọ ahụ.
Ndị a kpọrọ oku ma rịọ Gọvanọ Otti, ka ọ bịa leba anya n'okwu ahụ, na o nwereike ọ bụrụ na ndị o nyere ego ịkwụ ha ụgwọ eriela ya.
"Anyị akwụchaala ndị nwee ala na Nsulu ụgwọ"
Onyeisi ọrụ Gọọmenti Abia Steeti bụ Caleb Ajagba kwuru na gọọmenti akwụchaala ndị niile nwere ala na Nsulu ebe a na-arụ ọdọụgbọelu ụgwọ ala ha.
O kwuru na ọ bụrụ na e nwere ndị a na-akwụbeghi ụgwọ na ọ bụ naanị mmadụ mkpụrụ ole ma ole nwere nsogbu n'akara ụbaego ha.
O kwuru na ọ bụ ya mere ya na Kọmishọna na-ahụ maka ala bụ Chika Chukwumerije jiri bịa na Nsulu ịchọpụta ihe mere, ma kwuo na ndị a na-eme ngagharịiwe nwere nsogbu metụtara idezighi akwụkwọ njirimaara ha maka ịkwụ ha ụgwọ.
"Ihe a kwụrụ ụfọdụ ndị nwee ala bụ puku naịra 180"
Otu onye n'ime obodo ndị nọ na Nsulu na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na nke bụ eziokwu bụ na gọọmenti akwụbeghi ọtụtụ ndị nwee ala ebe ahụ ụgwọ.
"Gọọmenti kwụrụ ụfọdụ ndị ụgwọ ma pụta kwuo na ha akwụchaala mmadụ niile ụgwọ.
"Kedụ etu ị ga-esi akwụ mmadụ otu puku narị naịra na puku iri asatọ (N180,000) kwa otu plọtụ ala n'etu ihe si dị na Naịjirịa ugbua? Nke ahụ adịghị mma."
O kwuru na ala gọọmenti kewapụtara na mbụ iji rụọ ọdọụgbọelu ahụ dị ekta otu puku na narị asatọ (1800acre) bụ nke ji ugboro abụọ karịa ala ọdọụgbọelu Legọs.
Na e mechara butuo ya ruo ekta otu puku na iri anọ (1040acre) mana gọọmenti akwụchabeghi ndị nwee ala ndị a ụgwọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmenti akwụrubeghi ihe ruru mmadụ pasentị 30% ụgwọ ala ha na Nsulu.
Etu ọrụ si aga n'ọdọụgbọelu Nsulu

Ebe foto si, Ferdinand Ekeoma/Facebook
Gọọmentị Abịa steeti amalitela ikpocha ụzọ a ga-esi abanye n'ọdụụgbọelu ha chọrọ ịrụ na Nsulu dị na steet ahụ n'ụbọchị Fraịde 28 Maachị 2025.
Ozi Onye ndụmọdụ pụrụiche nye Gọvanọ Abia steeti bụ Ferdinand Ekeoma wepụtara n'akara sọshịa midia ya kwuru na gọọmentị bidoro ikpocha ụzọ a ga-esi banye n'ọdụụgbọelu ahụ n'ihi na ndị obodo ghọtara mkpa ịrụ ọdụụgbọelu dị, ma kwuo na ndị kwuru na ndị Nsulu achọghị ka gọọmentị rụọ ọdụụgbọelu abụghị eziokwu.
Onyeisi ndị ọrụ Gọvanọ bụ Pastọ Calab Ajagba gwara ndị obodo Nsulu na aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti ga-gbaa mbọ ịhụ na steeti ahụ na gọọmentị etiti ga-arụkọ ọrụ iji mezue nkwa ahụ.
Kedụ maka ndị Nsulu?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ajagba kwuru na obi anụrị dị ndị obodo bụ ndị nwee ala ebe a na-arụ ọdụụgbọelu ahụ gosiri na ha nabatara ihe gọọmentị na-eme.
Ajagba toro ndị obodo ahụ maka nghọta ha ma gwakwa ndị ọrụ ngo ka ha na ndị obodo na-arụkọ ọrụ ọfụma.
O kwuru na gọọmentị amalitela ịkwụ ndị nwe ala ụgwọ maka iji ala ha arụ ọdụụgbọelu.
Ajagba: "Ugbua, a malitela ịkwụ ụgwọ. Ọtụtụ obodo anatala ugwo ha, nke a mere mmadụ niile ji enwe obi ụtọ n'ihi na nghọta bụ ihe ndị na-eweta tụkwasị obi.
N'aka nke ọzọ, Onye enyemaka pụrụiche nye Gọvanọ n'ihe gbasara ala na ụlọ bụkwa onye na-ahụ maka ọrụ n'ọdụụgbọelu Abịa steeti bụ pastọ Okoro Aji kwuru na ikpuocha ebe a ga-esi abanye n'ọdụụgbọelu bụ ihe dị mkpa n'ọrụ a.
Aji kwuru "Taa, anyị na-eke ụzọ ịbanye n'okporoụzọ ụgbọelu ka anyị wee nwee ike ime ule ala dị mkpa na nnyocha ndị ọzọ ekwesịrị ime n'ebe a ga-arụ ọdụụgbọelu ahụ".
O kwuru na ụzọ ahụ ga adị ihe dịka kilomita 853 site na isi okporoụzọ gaa n'ọdụụgbọ elu. Ya mere, anyị na-ele anya iji ụbọchị ise maọbụ asaa iji mechaa ikpochapụ ụzọ ahụ.
Onye ndu ndi nwe ala Nsulu n'otu Gọọmentị Land Owners Forum na onyeisi oche nke Memorandum of Agreement Committee nke oru ọdụụgbọelu ahụ bụ Uzor Azubuike toro Gọvanọ Alex Otti maka ịge ntị n'arịrịọ ha na-arịọ ka o welata ala ahụ site na hekịta 1,800 nke mbụ gaa na hekịta 1,000.

Ebe foto si, Ferdinand Ekeoma/Facebook
A tọọla ntọala maka ọdọụgbọelu Abịa steeti

Gọọmenti atọọla ntọala maka ọdọụgbọelu Abịa steeti n'ụbọchị Tuzde 17 Disemba 2024.
Oge ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ, Minista njem ụgbọelu bụ Festus Keyamo kelere ụlọ omeiwu Naịjirịa maka itinye ọdọụgbọelu ahụ n'atụmatụ mkpata na mmefu ego afọ 2024.
O kelekwara osote onyeisioche ụlọ omeiwu nta bụ Benjamin Kalu maka mbọ niile ọ gbara iji hụ na ọdọụgbọelu ahụ pụtara ihe.
N'okwu nke ya, aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti kwuru na atụmatụ ọdọụgbọelu ahụ bụ nke a kpachapụrụ anya mee iji gosipụta steeti ahụ n'ọha mbaụwa.
Osote onyeisioche ụlọ omeiwu nta bụ Benjamin Kalu kelere Onyeisiala Bola Tinubu maka afọ ọma ya ma keleekwa Gọvanọ Alex Otti maka ezi ọhụ ya ma werekwa ohere ahụ kpọọ oku maka mgbakọaka iji mee ka ọdọụgbọelu ahụ bụrụ nke a ga-eji na-eme njem n'ọha mbaụwa.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ọdọụgbọelu ka ha na-arụ kama ha na-arụ obodo ọdọụgbọelu ga na-ekwo ekwo maka azụmahịa.
Otu onye obodo Nsulu ma bụrụkwa onyeisi ndị ọrụ n'obi ọchịchị Abịa steeti bụ Pastor Caleb Ajagba gwara ndị obodo ya atụla ụjọ n'ihi na e nwere ọtụtụ uru ndị ha ga-erite n'atụmatụ ọrụ ahụ.

Ebe foto si, Alex Otti, Festus Keyamo, Benjamin Kalu/X
Ihe ndị Nsulu chọrọ n'aka gọọmentị Abia Steeti maka ọdọụgbọelu a chọrọ ịrụ n'obodo ha

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook
Ụmụnwaanyị si n'ụfọdụ obodo dị n'okpuruọchịchị Isiala Ngwa North nke Abia Steeti emeela ngagharịiwe megide atụmatụ ịrụ ọdọụgbọelu nke gọọmentị chọrọ ịrụ n'obodo ha.
Nke a na-abịa dịka gọọmentị Abia Steeti chọrọ ịmalịte ịrụ ọdọụgbọelu n'obosara ala dị n'obodo ndị dị na mpaghara Nsulu.
Ụmụada ndị a si n'obodo asatọ gụnyere; Umuala Nsulu, Ikputu, Umuosu, Umuezeukwu, Umuomainta, Umuode, Umuala na Umuodecha jụrụ ịnabata atụmatụ a gọọmentị nwere n'ebe obodo ha nọ.
"Ọdọụgbọelu abụghị ihe dị anyị mkpa ugbua"

Ebe foto si, Ferdinand Ekeoma/Facebook
Ụmụada a bu ngagharịwe gaa n'ụlọ ezumezu ha n'ụbọchị Mọnde 9 Disemba 2024 ma kwuo na ọdọụgbọelu abụghị ihe dị mkpe nye ha ugbua.
Ha kwuru na ọ bụ ọrụ ugbo ka e ji maara ha bụrụkwanụ ebe ha si eri nri ma na-ebi ndu. Ha boro gọọmentị Abia ebubo ịchọrọ ịnapụ ndị obodo ha nri n'ọnụ site n'ịkpachi ala ha n'aha ịrụ ọdọụgbọelu.
Ha kwuru na gọomentị kwesịrị ileba anya n'ịrụ ihe ndị dị mkpa dịka ụlọakwụkwọ, ụlọ ọrụ aka na ndị ọzọ na-abụghị ọdọụgbọelu.
Mana otu nwoke a kpọrọ Jessy Odu bụ onyendu ndị nnọchiteanya ndị a ga-eji ala ha arụ ọdọụgbọlu ahụ kwuru na o nweghi nsogbu dị n'etiti ha na gọọmentị.
Odu bụ onye obodo Agburuke Nsulu, kwuru na o nwere ala n'ebe a chọrọ ịrụ ọdọụgbọelu. O kwuru na ọ bụ kamgbe ọnwa Mee nke afọ 2024 mgbe gọọmentị wepụtara atụmatụ ahụ ka ha malitere inwe mkparịtaụka banyere ya.
O kwuru na ndị nwere ala n'obodo asatọ ndị ọ ga-emetụta kọwaara gọọmentị ihe ndị ha chọrọ bụ nke gọọmentị kwuru na ha ga-eme.
O kwuru na ihe ndị a gụnyere;
- Ịkwụ ndị nwe ala ebe ahụ ego iti aka n'obi
- Iwere ndị ntoroọbịa obodo ndị ahụ n'ọrụ dịka ndị ọrụ aka oge a ga na-arụ ọdọụgbọelu ahụ.
- Inye ndị na-arụ ọrụ ugbo n'ala ndị ahụ ego enyemaka a kpọro 'grant' iji hiwe azụmaahịa ọzọ ga-amasị ha.
- Inye ndị obodo ahụ ọrụ ngo ịzụta akụrụngwa ndị dịka aja, ogwuta nakwa ihe ndị ọzọ a ga-eji arụ ọdọụgbọelu ahụ.
Odu kwuru na ụmụnwaanyị ndị a na-eme ngagharịiwe banyere ịrụ ọdọụgbọelu ahụ bụ ndị a na-akwanye ọkụ ime ụdịrị ihe a.
Ihe gọọmentị Abia kwuru

Ebe foto si, Abia State Government
Tupu akụkọ a na-apụta, BBC gbara mbọ ịnụta n'ọnụ gọọmentị Abia Steeti banyere ngagharịiwe ụmụada a mere.
BBC kpọtụụrụ ndị ọrụ gọọmentị gụnyere Odeakwụkwọ mgbasaozi bụ Ukoha Njoku na Ferdinand Ekeoma bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọvanọ Alex Otti, onweghi onye zara n'ime ha abụọ.
Mana ozi Ukoha wepụtara n'akara Facebook kwuru na a ga-eme emume ntọala ọdọụgbọelu ahụ n'ụbọchị 17 Disemba 2024 bụ nke mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu ga-abụ onye ọbịa pụrụiche.
Akụkọ ọzọ dị n'ọbaozi ụlọọrụ ntaakụkọ Punch kwuru na gọọmentị na ndị obodo ebe a chọro ịrụ ọdọụgbọelu a amalitela inwe mkparịtaụka.
Akụkọ kwuru na onyeisi ọrụ Gọvanọ Alex Otti bụ Caleb Ajagba mere njem n'obodo ndị ahụ ma kwuo na ndịisi ndị obodo nabatara atụmatụ ahụ ọfụma.
Mana BBC Igbo achọpụtabeghi n'onwe ha ma nke ahụ ọ bụ eziokwu.









