Abia Pension law: Alex Otti ọ napụrụ Ikpeazu, T.A Orji na Uzor Kalu ara n'ọnụ?

Ebe foto si, Otti/Ikpeazu/Orji/Kalu
Gọvanọ Abia Steeti nọọrọ n’ụbọchị Tọzde 21 Maachị, 2024 tinye aka n’akwụkwọ iwu ga-eme ka a kwụsị ịkwụ ndị gọvanọ chiburu steeti ahụ na ndị osote ha ụgwọ ezumike nka a kpọro ‘pension’.
Ndị ụlọomeiwu Abia Steeti kwadoro atụmatụ iwu a n’ụbọchị Tuzde 19 Maachị, 2024 ma kpọọ ya “Abia State Governors and Deputy Governors Pensions (Repeal) law, 2024”.
Onye omeiwu na-anọchiteanya mpaghara Arochukwu bụ Uchenna Okoro wepụtara atụmatụ iwu a tupu ọ gafee ngụputa nke mbụ, abụọ nakwa atọ n’ụlọomeiwu.
Ihe butere iwu a

Ebe foto si, Abia State Government
Mgbe ọ na-etinye aka n’akwụkwọ iwu ahụ, Gọvanọ Otti kwuru na mkpebi ya tupu ọ banye n’ọchịchị bụ na ha agaghị aga n’ihu ịkwụ ndị gọvanọ na osote ha chịrịla achị ụgwọ ezumike nka.
“Anya agaghị aga n’ihu ịkwụ ndị gọvanọ na osote ha pụrụ apụ ụgwọ ezumike nka ebe e nwere ọtụtụ ndị ọrụ Bekee lara ezumike nka e ji ụgwọ.
Ọchịhchị bụ maka ịrụrụ ọha ọrụ, ọ bụghị ohere onye na-achị achị nwere iji fọjuo akpa ya.
Ọ ga-akara anyị mma iji ego a ga-eji kwụọ ndị gọvanọ na osote ha pụrụ apụ kwụọ ya ndị ọrụ bekee gọọmenti lara ezumike nka
Iwu ọhụrụ a e mere kagburu iwu nke e mere n’afọ 2001 ngalaba nke anọ, mgbe Orji Uzor Kalu na-achị bụ nke nyere gọọmentị steeti ikike ị na-akwụ ndị gọvanọ pụrụ apụ na osote ha ụgwọ ezumike nka.
Ihe ndị bụbu Gọvanọ Abia kwuru
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụfọdụ ndị gọvanọ chịrị n’oge gara aga etinyela ọnụ n’okwu na gọọmentị kwụsịrị ịkwụ ha ụgwọ ezumike nka.
Okezie Ikpeazu bụ gọvanọ ka chịchara na nso nso a ekwuola na o nweghi ụgwọ ezumike nka ọbụla ọ natarala n’aka gọọmentị Abia Steeti kamgbe ọ rịturu n’ọkwa n’ọnwa Mee afọ 2023.
N’akwụkwọ ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Onyebuchi Ememanka, Ikpeazu kọwaara na kamgbe ọ rịọtụbeghi gọọmentị ka a kwụọ ya ụgwọ ọbụla, na ọ gaghị emekwanụ nke ahụ.
O kwuru na o wepụla anya n’ọchịchị Abia Steeti ma tinye uche n’ihe ndị ọzọ baara ya uru ma gwa gọọmentị na-achị ugbua ka ha lekwasị anya n’ọrụ ha.
N'otu aka ahụ, otu n'ime ndị enyemaka T.A Orji chịbukwara Abia bụ Ifeanyi Umere kwuru na Orji anatabeghi ego ọbụla dịka ụgwọ ezumike nka n'aka gọọmentị.
Umere kwuru nke a, mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo mata nke a mgbe ọ kpọtụụrụ ya n'ekwenti.
BBC Igbo kpọtụụrụ ndị na-ekwuru Orji Uzor Kalu bụbu aka na-achị Abia bụ onye e mere iwu a n'oge ọ bụ gọvanọ mana ọ zaghị oku a kpọro rute mgbe akụkọ a pụtara.









