"Ọnọdụ anyị n'obodo Ezeukwu dị na Bende, Abia Steeti na-agba anya mmiri" – Ndị Obodo

Okporoụzọ, ụlọakwụkwọ, akwammiri, ahụike mebichara emebi n'obodo Ezeukwu.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị bi n'obodo Ezeukwu dị n’Okpuruọchịchị Bende nke Abia steeti etiela mkpuakwa maka ọnọdụ ọjọọ nke ụfọdụ akụrụngwa ndị e ji ebi ndụ n'obodo ahụ dị ugbua.

Ha na-ebe akwa na-arịọ ka gọọmenti Abia steeti nakwa nke Etiti gbatara ha ọsọ enyemaka.

Ndị obodo a gosiri ma kọwaara onye ntaakụkọ BBC Igbo etu ọnọdụ ọjọo akụrụngwa ndị a si emekpa ha ahụ n'obodo ma na-eme ka ihe na-esiri ha ike.

Chukwu Anayo Chukwu bụ ji ọkwa 'President General' nke Ezeukwu Development Unionkwuru na mmebi akụrụngwa ndị a etinyekwuola obodo ha n'ọnọdụ oke agụụ.

Akwammiri Ifuama dị n’okpuru ọchịchị Bande n’Abia steeti
Nkọwa foto, Akwammiri

Anayo kwuru na kamgbe okporoụzọ na akwammiri ha mebiri na ndị mmadụ enweghị ụzọ ọzọ ha ga-esi buga ihe ha kọrọ n’ugbo n’ahịa.

Onye ọzọ bụ Ndubisi Chukwu Edward kwuru na obodo Ezeukwu bụ ndị a maara nke ọma maka ịkọpụta ihe n’ugbo ma sị na ụzọ ha mebiri bụ nnukwu ihe aka mgba nye ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na otu ụzọ nakwa akwammiri a kpọrọ 'Ifuama' ndị obodo si aga n'ụlọ Eze ha emebiela nke bụ na ụgbọala maọbụ ọgbatumtum agaghị agafenwu ebe ahụ.

Ụlọakwụkwọ Praịmarị dị n'Ezeukwu
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ Praịmarị n'Ezeukwu opkuruọchịchị Bende, Abia steeti

Onye ọzọ bụ Ukanwa Ogbajie kwuru na ihe niile e ji enyere ndụ aka dịka okporouzo, ụlọakwụkwọ na akwammịrị niile nke gọọmenti rụrụ n’obodo ha emebichaala.

O kwuru na okporoụzọ si Ezeukwu gawa Alayi nakwa Akwammiri a kpọro Eze adaala.

O kwuru na ọ bụ Sịnetọ Orji Uzor Kalu na-anọchiteanya Abia North n'ụlọomeiwu wetere ụzọ na akwammiri ahụ na mbụ mana o rughi ọnwa isii arụchara ya, okporoụzọ ahụ emebie.

Ụlọakwụkwọ Praịmarị n'Ezeukwu opkuruọchịchị Bende, Abia steeti
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ Praịmarị n'Ezeukwu

Kedụ akụrụngwa ndị mebiri emebi?

Onye ntaakụkọ BBC setere foto akụrụngwa dị iche iche mebiri emebi n'obodo Ezeukwu, nke gụnyere;

  • Akwammịrị Ifuama
  • Akwammịrị Eze
  • Okporoụzọ sị Ezeukwu gawa Alayi
  • Ụlọakwụkwọ Praịmarị dị n'Ezeukwu na ihe ndị ọzọ.
Okporoụzọ si Alayi na-aga Ezeukwu ma gaa Ebonyi steeti ( Ụzọ dị na foto a bụ nke mpaghara Ezeukwu)
Akwa mmiri Ịyị Eze dị n'ụzọ si Alayi na-aga Ezeukwu
Nkọwa foto, Akwa mmiri Ịyị Eze dị n'ụzọ si Alayi na-aga Ezeukwu

Ihe gọọmentị Abia kwuru

Tupuu akụkọ a apụta, anyị kpọtụrụ gọọmentị Abia Steeti ka ha gwa anyị ihe ha na-eme maka ọnọdụ mmepe n'Ezeukwu.

Onye mechere za anyị ajuju bụ odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Abia steeti bụ Ukoha Njoku.

Njoku kwuru na "Gọọmenti Abia na-etinye anya n'ihe gbasara ọnọdụ okporoụzọ niile dị na steeti ahụ nakwa akụrụngwa mmepe obodo dị iche iche".

"Usoro Gọọmenti anyị nwere bụ maka imepe steeti niile, enweghị obodo anyị ga-emepe hara ibe ya".

"Gọọmenti emeela nyocha n'ụlọakwụkwọ ruru 22; anyị ga-amalite imezi ụlọakwụkwọ ndị ahụ. Ụlọakawụkwọ karịrị 900 ka anyị ga-aruzi".

Ukoha Njoku kwukwara na gọọmenti Abia steeti choro ịrụ ọrụ mmepe na mpaghara steeti ahụ niile nke gụnyere obodo Ezeukwu.

"Ọ bụrụ na anyị emeghị ya taa, anyị ga-eme ya echi".