Steeti ndị dị n’Ọwụwa Anyanwụ maliterela ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ na ego ole ha na-akwụ

Ndị gọvanọ na-achị steeti ndị dị n'Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Otti/Soludo/Nwifuru/Mbah/Uzodimma/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Otu jikọtara ndị ọrụ Bekee na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress gwara ndị otu ha nọ na steeti dị iche iche ka ha malite ịgba abụbụọrụ n’ọnwa Disemba 2024 ma ọ bụrụ na gọọmentị steeti ahụ ebidobeghi kwụwa ndị ọrụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ bụ N70,000.

Nke a na-abịa dịka gọọmentị etiti malitere n’ọnwa Ọktoba 2024 na-akwụ ndị ọrụ Bekee nọ n’okpuru ha ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ a bụ nkeha ha dọlara azụ malite n’ọnwa Julaị 2024.

Ndị ọrụ nọ n’ụfọdụ steeti gụnyere ndị nọ n’Ọwụwa Anyanwụ malitere ịgba abụbụọrụ n’ihi akwụghị ụgwọ opekatampe a ebe ndị ọzọ kwuru na ha agaghị n’olileanya na gọọmentị ha ga-ebido ịkwụ ha ụgwọ a.

Ebonyi Steeti

Mịnịstrị na-ahụ maka ikpe ziri ezi n'Ebonyi Steeti ka a gbachiri ụlọọrụ ha
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị Ebonyi Steeti emepeghi n’ụbọchị Mọnde 02 Disemba, 2024 n’ihi abụbụọrụ ahụ dịka ọtụtụ ndị ọrụ kwụcha n’ezi.

N'Ebonyi, ndị ọrụ bekee malitere ịgba abụbụọrụ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba 2024 maka na gọọmentị ha amalitebeghi kwụwa ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ a.

Onyeisi otu a n’Ebonyi bụ Ogugua Egwu gwara ndị ntaakụkọ na abụbụọrụ a bụ otu izuụka iji dọọ gọọmentị steetị ha aka na ntị.

O kwuru na kọmitii e hiwere maka ileba anya n’ịkwụ ụgwọ ahụ ewepụtabeghi akwụkwọ nnyocha ruo mgbe gọvanọ kwupụtara mkpebi ya bụ nke ọ sịrị na ọ gaghị adị ndị ọrụ mma.

Ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị Ebonyi Steeti emepeghi n’ụbọchị Mọnde 02 Disemba, 2024 n’ihi abụbụọrụ ahụ dịka ọtụtụ ndị ọrụ kwụcha n’ezi.

Na nzaghachị, Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Francis Nwifuru yiri egwu na a ga-achụ onye ọrụ ọbụla na-abịaghị ọrụ ruo ụbọchị atọ.

O kwuru na ọ bụ maka ọdịmma ndị ọrụ mere o jiri kweta ịkwụ ndị ọrụ puku naịra 75 (N75,000) dịka ụgwọ opekatampe. Na ndị ọrụ nọ n’ogogo nke mbụ na abụọ (level 1 and 2) amalitela ịnwete ego a ebe a gbakwụnyere puku naịra 40 (N40,000) n’ụgwọ ọnwa ndị ọzọ.

Abia Steeti

Ngalaba ahụike n'ụlọọrụ gọọmentị Abia Steeti
Nkọwa foto, Ndị ọrụ bekee nọ n’ụlọọrụ ha dị iche iche n'Abia Steeti mana na-arụ ọrụ ha

N’Abia Steeti, ndị ọrụ bekee agbaghị abụbụọrụ ọbụla dịka ọtụtụ ndị ọrụ nọ n’ụlọọrụ ha dị iche iche mgbe onye ntaakụkọ BBC ruru ebe ahụ.

Onyeisi ndị ọrụ Bekee n’Abia Steetị bụ Ogbonnaya Okoro na ogbo ya nke Trade Union Congress (TUC) bụ Ihechi Eneogwe kwuru na gọọmentị malitere ịgwụ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ n’ọnwa Ọktoba, 2024.

Ha kwuru na ndị ọrụ nọ n’ogogo mbụ ruo ogogo asaa na-erite ya ugbua ebe ndị nọ n’ogogo 8 ruo 16 anatabeghi ya, kama na gọọmentị na-eleba ya anya site na mkpesa ha mere.

“Ngwa ngwa a malitere ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ n’ọnwa Ọktoba, ndị nọ n’ogogo 7 malitere irite ego karịa ndị nọ n’ogogo 10. O kwesighị ịdị etu ahụ,” ka o Okoro kwuru.

Enugwu Steeti

Gọvanọ Peter Mbah nke Enugwu Steeti

Ebe foto si, Peter Mbah/Facebook

Nkọwa foto, Ndị ọrụ Bekee agbaghị abụbụọrụ maka na gọọmentị amalitela ịkwụ ha ụgwọ ọnwa Opekatampe ọhụrụ.

N’Enugu Steetị, ndị ọrụ Bekee agbaghị abụbụọrụ maka na gọọmentị amalitela ịkwụ ha ụgwọ ọnwa Opekatampe ọhụrụ.

Onyeisi ndị ọrụ Bekee na steeti ahụ bụ Fabian Nwigbo kwuru na gọọmentị malitere ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe na ngwụcha ọnwa Nọvemba, 2024.

O kwuru na ndị ọrụ nọ n’ogogo mbụ a na-akwụbu puku naịra 30 (N30,000) nwetere puku naịra 80 (N80,000) ebe a gbakwụnyere puku naịra 50 (N50,000) n’elu ụgwọọnwa ndị ọzọ.

Nwigbo kwuru na mgbakwụnye puku naịra 50 (N50,000) e nyere ndị ọrụ nọ n’ogogo ndị ọzọ abụghị etu o kwesịrị ịdị maka na o soghi usoro e si agbakọ ụgwọọnwa opekatampe.

O gara n’ihu kwuo na ha edegaarala gọọmentị steeti akwụkwọ ka ha biko leba ya anya ma hazie ya nke ọma.

Anambra Steeti

Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra Steeti

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook

Nkọwa foto, Gọọmentị Anambra steetị kwuru na ndị ọrụ bekee eriela ụgwọọnwa opekatampe (N70,000) n’ọnwa Ọktoba na Nọvemba.

N’Anambra Steeti, odeakwụkwọ mgbasaozi gọọmentị bụ Christian Aburime kwuru na ha malitere ịkwụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ a n’ọnwa Ọktoba 2024.

O kwuru na ndị ọrụ bekee na steeti ahụ eriela ụgwọọnwa opekatampe puku naịra 70 (N70,000) n’ọnwa Ọktoba na Nọvemba.

Imo Steeti

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

Tupu akụkọ a na-apụta, onwebeghi ozi ọbụla anyị nweterela banyere ego ole gọọmentị Imo Steeti na-akwụ ndị ọrụ dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ.

Otu onye ọrụ bekee na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na a gwara ha na ọ bụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2025 ka a ga-ebido kwụwa ha ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ a.

Mana BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ gọọmentị na ndị ọrụ bekee, iji chọpụta kpọmkwem ma a malitela ịkwụ ha ụgwọ a nakwa ego ole a na-akwụ ha.

Akụkọ ka na-abịa...