Soludo asaala Fada Mbaka n'okwu 'minimum wage'

Charles Soludo na Fada Ejike Mbaka

Ebe foto si, Charles Soludo/AMEN/Facebook

Aka na-achị Anambara steeti bụ Ọkammụta Soludo akwadola oku ụkọchukwu ụka Katolik a ma ama bụ Fada Ejike Mbaka kpọrọ ka ndị nọ n'ọchịchị welata aka n'etu ha si ekporị ndụ dịka ndị ọrụ na ụmụ Naijiria ndị ọzọ nọ n'ụbịam na ihe isi ike.

N'ozi ya n' ọgbakọ 'Platform' nke ụlọụka 'The Covenant Nation' hiwere na Legọs na nsonso a, Soludo sịrị, “ Agụụ gi ndị ogbenye , ha enweghịzi ndịdi. Ka anyị ghara ịkpasu ha iwe site na-ime azụanụụka.

"Ka m kwuo nke bụ eziokwu, Naijiria nọ na nnukwu ụkọ mana ndụ gọọmentị na ndị ọchịchị anaghị egosi ya ọkachasị, site na etu ha si agwọrị ndụ."

Ekwetara m ihe Fada Mbaka kwuru sị na ndị gọvanọ a họrọ n'ọkwa kwesịrị ị na-ana ụgwọọnwa opekatampe."

" Ekwetara m ka akwụwa anyị ụgwọọnwa opekatampe ka anyị were ghọta ka o si adị."

“N' Anambara, anabeghị m kọbọ dịka ụgwọnwa kemgbe m ji banye n'ọkwa. Eji m ụgwọọnwa meere steeti ọgọ."

N'Ụbọchịụka gara aga, Mbaka katọrọ etu ndị nọ n'ọchịchị si adọrọ ndị ọrụ ụka n'okwu ibuli ụgwọọnwa opekatampe ndị ọrụ dịka ihe isi ike na-akawanye njọ, na-agbanyeghị na ha na-enweta ego mmachi akpa maka ihe isi ike.

Ndị ọchịchị na-ana 'hardship allowance' mana obere 'minimum wage' bụrụ okwu- Fada Mbaka

Fada Ejike Mbaka

Ebe foto si, AMEN/Facebook

Ụkọchukwu Katolik a ma ama mabụrụ onye na-achịkọta ekpere "Adoration Ministry Enugu bụ Fada Ejike Mbaka agbarụọla ihu banyere ndọrịta Gọọmentị Etiti na ndị ọrụ na-adọ maka ibulite ụgwọọma opekata mpe ndị ọrụ.

Gọọmentị Etiti na otu jikọrọ ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress(NLC) na-adọrịta ụka banyere isi na puku naira iri atọ(N30,000) bulie ụgwọọnwa opekata mpe rue narị puku iri isi (N60,00 dịka ụgwọọnwa mana ṅdịọrụ jụrụ ajụ, si na o nweghị ihe ego ahụ ga-ezuru ndịọrụ..

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'oziọma o ziri n'ogige ekpre Adoration dị n'Emene, Enugu, ụbọchịụka, nke e wepụtara n'ọbaozi Facebook, Mbaka, onye boro ebubo na ndị nọ n'ọkwa ọchịchị na-ana ego maka ihe isi ike Bekee kpọrọ 'hardship allowance' mana na-adọ ụka ịkwụ ndịọrụ 'ụgwọọnwa opekatampe jụrụ ma ego ahụ gọọmentị chọrọ ịkwụ ọ bụ maka ịkwụ ụgwọ ụlọ ka ọ bụ maka njem ụgbọala ha ji aga ọrụ.

Mbaka dọrọ ndị n'ọkwa ọchịchị aka na ndị ka ha ghara ịga n'ihu na-eme ihe masịrị, na-eche na o nweghị ndị mmadụ ga-eme, si na nke a pụrụ itinye Naijiria na nnukwu nsogbu.

"Ndị ndu anyị na-ana ego maka ọnọdụ ihe isi ike mana ndị ọrụ na-achọ obere ụgwọọnwa opekatampe."

Ọ tụrụ arịrị na ihe isi ike nke siri na gọọmentị banye gọọmentị ọzọ na-aga n'ihu ma kwuo na ndị ọchịchị na-ekpekpa ndị ha na-achị ahụ aghaghị ịta ahụhụ dịrị ha maka ihe ha na-eme ọha ụmụ Naijiria sị, "Ha nwere ike ịzụ Inec, ha nwere ike ịzụ ndị ọkaikpe. Ha nwere nchekwa dị n'iwu( (immunity). Mana ha enweghị nchekwa megide karma. Karma anaghị eri ngarị. Otu ụbọchị ọ ga-eme."

"Ndị dowere obodo etu a, aghaghị ịta ahụhụ ya."