Etu nwaanyị si gbuo enyi ya nwoke maka ike ego ha nwetara na nwayo

Nwaanyị ahụ a nwụchiri

Ebe foto si, Imo state Police

Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela otu nwaanyị maka ebubo igbu ọyị ya nwoke na steeti ahụ.

Ebubo ha boro ya bụ na ọ bụ esemokwu si n'ike ego ha nwetara na wayo ha gwụrụ mmadụ n'ịntanetị.

Nwaanyị ahụ kọrọ ndị uweojii etu ọyị ya nwoke si dubaa n'ọrụ igwu ndị mmadụ wayo a ma dịka 'Yahoo yahoo' na Naịjịrịa.

Ọ sị na ha na-aba mba maka etu nwoke ahụ esighi nye ya oke n'ime ego ruru 250m Rupiah (N22,578,000m) ha natara otu nwoke si mba Inodeneshia.

N'ihe onyonyo ebe ndị uweojii na-agba nwaanyị ahụ ajụjụ ọnụ, o kwuru na ọ bụ kemgbe afọ 2019 ka ya na nwoke ahụ o gburu bi n'otu ụlọ nakwa na ọ mụọrọla ya nwa.

Ọ sịkwa na o kuru nwa ya nwaanyị gbapụ ọsọ mgbe ọ sụchara nke nwoke mma n'ihi na ahụ adịghị ya nke mere o ji kuru ya gaa na nke nwanne nne maọbụ nna ya.

Ndị uweojii sị na ọ bụ mgbe ha na-ese okwu ka o ji mma sụọ ya n'ahụ ya.

Ha sịkwa na o dere "ịche na ị ga-eri ego m gbalaga, aga m achọta gị na ezinaụlọ gị ma nwa gị" ma tụsa ya n'ahụ nwoke ahụ iji kpuchi na aka ya dị n'ọnwụ ya.

Ndị uweojii sị na ọchịchọ na-aga n'ihụ ịchọta ego ahụ ma nyefee ya n'aka onye nwe ya.

"Anyị ga-akpụpụ nwaanyị ahụ dị afọ 27 ụlọikpe ma nyocha anyị gachaa" ka ha kwuru.