Fake News: Nwatakịrị ọnwa abụọ e bepụrụ aka na FMC anwụbeghị

Akụkọ na-efegharị na soshal midia nke na-ekwu na nwata ahụ e bepụrụ aka n'ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre' Owerri anwụọla bụ asị.
N'ehihie ụbọchị Fraịde ka ya bụ akụkọ malitere ifegharị, mana ndị isi ụlọọgwụ ahụ agwala BBC Igbo na ọ bụghị eziokwu.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọgwụ ahụ bụ Achonu Jecinta gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya bụ nwatakịrị nọ n'ezigbo ahụike oge ya hụrụ ya n'ebe elekere asatọ nke abalị Fraịde.
"Oge m hụrụ akụkọ ahụ na soshal midia, obi mapụrụ m, m wee gbaga n'ụlọ ebe nwata ahụ na nne ya nọ, hụ ya ebe ọ na-aṅụ ara," Achonu kwuru.
"Onweghị ihe ọbụla na-eme ya, ahụ siri ya ike, ya na nne ya dị nnọọ mma oge m hụrụ ha n'abalị."
Achonu kwuru na ya nọ n'ụzọ ịla ụlọ ya oge ya hụrụ akụkọ ahụ, nke mere ka ọ laghachi azụ gaa mara ma ọ bụ eziokwu, mana nwata ahụ na nne ya dị ndụ gbasikwaa ike.
Oge anyụ jụrụ Achonu ebe akụkọ ọnwụ nwata ahụ si pụta, o kwuru na ya amaghị, mana ihe ya ma bụ na ọbụghị eziokwu.
Ihe mere anyị ji kpebie ibepụ aka nwata ọnwa abụọ nna ya kụrụ ihe - Ndị Dọkịnta

Ndị dọkịnta n'ụlọọgwụ FMC dị n'Owere akọwaala ihe ha ji kpebie ibepụ aka nwatakịrị dị ọnwa abụo, dịka akụkọ kwuru na ọ bụ nna ya kụjiri ya aka.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dọkịnta letara nwata ahụ kwuru na ọ bụ n'izuụka gara aga ka a kpọtara nwatakịrị ahụ n'ụlọọgwụ, wee bo ebubo na nna ya kụrụ ya ihe n'ihi na akwa ọ na-ebe n'ime abalị na-enye ya nsogbu.
Iheukwumere Onyenwe, onye ọkachamara na ngalaba ahụike gbasara ọkpụkpụ, so n'otu ndị dọkịnta letara nwata ahụ.
"Ndị kpọtara ya kwuru na oge nna nwata ahụ hụrụ na ọkpụkpụ aka nwata ahụ gbajiri, o weere akwa kegide ya, ọ nọọ ụfọdụ ụbọchị tupu a chọpụta na aka ahụ na-aza aza," otu n'ime ndị dọkịta ahụ kwuru.
"Ọ bụzi oge ahụ ka e butere ya na FMC, anyị wee chọpụta na o nweela 'gangrene' n'aka ahụ niile. Mana oge ahụ, ọ dịla njọ nke ukwuu, onweghịkwa ihe anyị nwere ike ime iji zọpụta ya."
"Ya mere anyị ji tụnyere ha alọ ka e bepụ aka nwata ahụ iji zọpụta ndụ ya ma gbochie nje ịbanye n'ọbara ya."
'Gangrene' bụ mgba akụkụ ahụ mmadụ nwụrụ n'ihi na ọbara anaghị erute ebe ahụ, maọbụ n'ihi nje bacteria.
Ọ na-emekarị n'aka maọbụ n'ụkwụ, tinyere mkpịsị aka na mkpịsị ụkwụ.

Ebe foto si, NAWOJ, Imo State
Dọkịta a gara n'ihu kwuo na nne nwata ahụ ekwebughi ka e bepụ nwa ya aka, mana oge a kọwaara ya na ọ bụ ihe ka mma iji zọta ndụ nwata ahụ, nna nne ya bịara nye nkwado tupu ha agaa n'ihu.
O kwuru na onweghị onye mazi ebe nna mụrụ nwata ahụ nọ ugbua n'ihi na ọ gbaala ọsọ. Ọ gara n'ihu kwuo na a na-eche na nwoke ahụ na-aṅụ ọgwụ ike.
Ọ kọwakwara na ọ bụrụ na ọnya ebe e si bepụ nwata ahụ aka lachaa nke ọma, e nwereike itinyere ya aka 'prostethic' n'ọdịnihu.
Banyere ego ụlọọgwụ na ihe ndị ọzọ, dọkịta kwuru na enwere ụfọdụ ndị otu na-arụ ọrụ ebere nyerela nwata ahụ aka, mana ọtụtụ ihe ndị ọzọ fọdụrụ bụ ngalaba ụlọọgwụ ahụ a kpọrọ 'social welfare department' ga-ekwu maka ya.

Ebe foto si, Dorothy Nnaji
Ọtụtụ otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye akpọkuola gọọmentị Imo steeti, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ka ha nwuchie otu nwoke a sị kujiri nwa ya aka nke mere e jiri bepụ aka ahụ.
Dorothy Nnaji, bụ onyeisi otu jikọrọ ndị ntaakụkọ ụmụnwaanyị bụ Nigeria Association of Women Journalists (NAWOJ), nke ngalaba Imo Steeti, gbara ama sị na nwoke a mere nke a n'ihi na nwa ya ahụ nọ na-ebe akwa.
Akụkọ sị na nwoke a ama dịka Confidence Amatobi dị afọ iri atọ na otu, nne nwa ahụ a ma dịka Favour dị afọ iri abụọ, ebe nwa ahụ bụ Miracle dị naanị ọnwa abụọ.
Amatobi bụ onye obodo Amurie dị n’okpuruọchịchị Isu, Imo steeti.
Kedụ etu ihe a si mee?
Nne nwata a bụ Favour kọwara na ihe a malitere n’ụbọchị Tọzde ruo n’isi ụtụtụ ụbọchị Fraịde 7 Ọktoba, 2022 mgbe o nyefere nwata ahụ n’aka nna ya ma gawa n’ụlọmposi.
Favour sị na ọ nụrụ ka nwa ya na-ebe akwa akwụsịghị akwụsị, nke mere o jiri gbata n’ime ụlọ ka ọ mara ihe mere ya.
Ọ chọpụtara na di ya agbajiela nwa ha aka dịka ọ hụrụ na aka ahụ kokwara eko.
Mgbe ọ jụrụ ya ihe mere o ji gbajie nwa ya aka, Amatobi sị na akwa nwa ahụ na-ebe na-egbochi ya ihi ụra abalị.
Mgbe Amatobi chọpụtara na aka nwa ha agbajiela, o were osisi na ụdọ kee n’aka nwata ahụ.
Ọ gara n’ihu kpọchibido nne na nwa n’ime ụlọ ụbọchị abụọ, ka ọ ghara ịgwa ndị agbataobi ha ihe o mere.
Favour gara n’ihu kwuo na o mechara chọta ụzọ o si pụta n'ụlọ ahụ dịka ụbọchị abụọ gachara, ebe ndị agbataobi ha nyerela ya aka kpọga nwa ahụ n’ụlọọgwụ.
Dịka ọ dị ugbua, a na-achọ nwoke a achọ dịka o sila n’aka ndị nchekwa obodo nwuchiri ya na mbụ gbaa ọsọ.
BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Michael Abattam, mana ọ zaghị ekwentị ya tupu akụkọ a apụta.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n’ọnụ Favour bụ nne nwata a.









