Child molestation: Ebe nwata dị afọ asaa boro dimkpa ebubo imetọ ya n'Enugwu nọzị ugbua

Aha onyonyo, Child molestation: Ebe okwu banyere nwata ahụ e metọọrọ n'Enugwu kwụ ugbua

Onyeisi ọrụ nchekwa n’Ugwuagor dị n’Abakpa Enugwu Steetị bụ Ikechukwu Festus Ukwuani akọwaala etu ha si chọpụta ma nwuchie nwoke ahụ a na-ebe ebubo na o dinara obere nwata nwaanyị ihe onyonyo ya na-ewu na sohal midia.

Maazị Ukwuani gwara BBC Igbo na ọ bụ otu nwata nwoke dị afọ iri na anọ gbaara ha ama e ji nwuchie nwoke ahụ.

”Otu nwata dị afọ iri na anọ bịakwutere anyị n’otu abalị ma gwa anyị na o nwere otu nwoke na-edina obere nwata nwaanyị n’abalị niile”.

Ọ sị na nwoke a na-ere mmanya, na ọ na-akụ ihe dịka elekere iri na abụọ nke abalị na nwoke ahụ ga-akpọba nwata ahụ n’ime ụlọ ma dinaa ya.

Ukwuani sị na ha kpọrọ nwata ahụ ma jụọ ya, nwata ahụ kwetere na ọ bụ eziokwu nke mere ha ji nwuchie nwoke ahụ.

“Mgbe anyị jụrụ nwoke ahụ ihe mere o ji akpa ụdị arụ a, ọ sị na ọ bụ ekwensu dubaara ya n’ọnwụnwa”.

Ukwuani gaara n’ihu kwuo na ọ bụ nne nne nwata ahụ e chere na-agba akwụna bụ onye mebiri nwata ahụ.

Ọ sị nwaanyị na-anara ụmụnwoke ego ka ha nwee ike dinaa nwa nwa ya.

Dịka ọ dị ugbua, ọ sị na nwoke ahụ na nne nne nwata nọ n’aka ndị uweojii ugbua ebe nwata a nọ n’ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Daniloe Ndukwe Igbo sị gwara BBC na ihe dị etu a mere ma sị ka a kpọghachị ya ka o nwee ike nye nkọwa.

Mana o kwubeghi ihe ọbụla banyere ye tupu akụkọ apụta.