Child molestation: Ebe nwata dị afọ asaa boro dimkpa ebubo imetọ ya n'Enugwu nọzị ugbua
Onyeisi ọrụ nchekwa n’Ugwuagor dị n’Abakpa Enugwu Steetị bụ Ikechukwu Festus Ukwuani akọwaala etu ha si chọpụta ma nwuchie nwoke ahụ a na-ebe ebubo na o dinara obere nwata nwaanyị ihe onyonyo ya na-ewu na sohal midia.
Maazị Ukwuani gwara BBC Igbo na ọ bụ otu nwata nwoke dị afọ iri na anọ gbaara ha ama e ji nwuchie nwoke ahụ.
”Otu nwata dị afọ iri na anọ bịakwutere anyị n’otu abalị ma gwa anyị na o nwere otu nwoke na-edina obere nwata nwaanyị n’abalị niile”.
Ọ sị na nwoke a na-ere mmanya, na ọ na-akụ ihe dịka elekere iri na abụọ nke abalị na nwoke ahụ ga-akpọba nwata ahụ n’ime ụlọ ma dinaa ya.
Ukwuani sị na ha kpọrọ nwata ahụ ma jụọ ya, nwata ahụ kwetere na ọ bụ eziokwu nke mere ha ji nwuchie nwoke ahụ.
“Mgbe anyị jụrụ nwoke ahụ ihe mere o ji akpa ụdị arụ a, ọ sị na ọ bụ ekwensu dubaara ya n’ọnwụnwa”.
Ukwuani gaara n’ihu kwuo na ọ bụ nne nne nwata ahụ e chere na-agba akwụna bụ onye mebiri nwata ahụ.
Ọ sị nwaanyị na-anara ụmụnwoke ego ka ha nwee ike dinaa nwa nwa ya.
Dịka ọ dị ugbua, ọ sị na nwoke ahụ na nne nne nwata nọ n’aka ndị uweojii ugbua ebe nwata a nọ n’ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Daniloe Ndukwe Igbo sị gwara BBC na ihe dị etu a mere ma sị ka a kpọghachị ya ka o nwee ike nye nkọwa.
Mana o kwubeghi ihe ọbụla banyere ye tupu akụkọ apụta.