N60,000 na N100,000: Kedu nke gọọmentị etiti ga-akwụ ndị ọrụ?

Kemgbe abalị ole ma ole gara aga, Naịjirịa na-ekpo ọkụ maka na otu jịkọrọ ndị ọrụ a kpọrọ Naịjirịa Labour Coungress (NLC) na gọọmentị etiti na-enwe nghọtahie.
Nke a mere ndị ọrụ jịrị gbaa abụbụọrụ n’ụbọchi Monde, abalị abụọ ma rụọ na ụbọchị Tụzde abalị atọ n’ọnwa Juun, afọ 2024.
Mana isi sekpuntị na nkata ahụ bụ ụgwọọnwa opekatampe gọọmentị kwesiri ịkwụ ndị ọrụ n’ọnwa ma ọ bụ nke ndị ọrụ kpọrọ ụgwụọnwa eji adị ndụ.
Mana e nwere ụfọdụ ndịn'iche n’etiti ụgwọọnwa opekatampa na ụgwọọnwa eji adị ndụ
Ụgwọọnwa eji adị ndụ bụ na aka ụgwụọnwa opekatampe nnukwu ma nyere ndị ọrụ aka ịtinye uche n’ọrụ ha.
A na-agbakọ ma na etinye ego onye ọrụ na emefu n’ọnwa tupu akwụọ ya ụgwọọrụ e jị adị ndu.
Na aka nke ọzọ, a na-agbakọ ihe dịka ego nrị, ụgwọụlọ, egọ ịzụ akwa, egọ ụgbọala n’ihe ndị ọzọ dị icheiche nwere mara ego ga ezulu onye ọrụ
Mana ụgwọọnwa opekatampe adịghị etu ahụ; gọọmentị na-ekwụ ndị ọnwa ụgwọ na achọghị ịma na ọ ga ezu ma na ọ gaghị ezu.
Kemgbe ndị NLC na gọọmentị etiti Naịjirịa bidoro na-enwe nzụkọ gbasara ụgwọọnwa opekatampe ma ọ bụ ụgwọọnwa eji adị ndụ gọọmentị ekweela nkwa ugboro ugboro mana ndị ọrụ ekwetaghị.
Na mbụ, Gọọmentị etiti kwetere na ha ga akwụ ndị ọrụ N48,000, mana ndị ọrụ ekwetaghị, gọọmentị emechaa kweta na ha ga akwụ N57,000 nke mere ndị ọrụ jịrị gbaa abubụọrụ tupuu gọọmentị ekwụọ na ha ga akwụ opekatampe N60,000 nke mere ndị ọrụ jịrị kwụsị nzogbu nzogbu.
Kedụ ihe dị iche ụgwọ opekatampe na ụgwọ eji adị ndụ?

Kamgbe Gọọmentị etiti na ndị otu jịkọrọ ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC) bidoro na eme mkparịtaụka gbasara ụgwọ ọnwa e kwesiri ịkwụ ndị ọrụ, ọtụtụ ndị mmadụ nwere ihe mgbagwoju anya gbasara ego ndị NLC chọrọ ka kwụọ ha.
Ọtụtụ na-ele anya, ma na ahụ ego ndị NLC chọrọ ka akwụọ ha dịka nnukwu ego, ebe ndị ọzọ na-ele anya na uru ego ahụ bara, nakwa ihe ọ nwereike ịzụta na ahịa ụgbụa.
N'akụkọ a, Desmond Echeta bụ onye nkuzi na Mahadum na-ahụ maka ọrụ ugbo n'Ohaji, Egbema, Imo steeti ma bụrụkwa ọkammụta n'ihe gbasara akụnụụba kọwara ihe dị iche na etiti ụgwọ ọnwa opekatampe na ụgwọ ọnwa e ji adị-ndụ.
Gịnị bụ ụgwọ ọnwa okpekatampe?

Ebe foto si, Getty Images
Desmond Echeta kọwara ụgwọ ọnwa opekatampe dịka ụgwọ ọnwa ịwụ kwadọrọ na agaghị akwụọ mmadụ ego perempe karịa ya.
“Ọ bụrụ na gọọmentị na ndị ọrụ kwata na ụgọ ọnwa opekatampe, nke ahụ ga a bụ egọ a ga azọdọ ụkwụ na enweghị onye ọrụ a ga akwụ egọ perempe karịa ya”
“Ọ pụtaghị na a ma nkwụ ego karịrị ya, mana gọọmentị enweghịzị ịkịke ịkwụ mmadụ ego dị obere ma ọ bụ nke na erughị ka nke ahụ”
Gịnị bụ ụgwọ ọnwa e ji adị-ndụ?
Desmond Echeta gara n’ịrụ kọwa na ụgwọ ọnwa e ji adị-ndu bụ ụgwọ ọnwa gọọmentị na akwụ ndị ọrụ nke ga enyere ha aka ịdị ndụ.
“Ụgwọ ọnwa e ji-adị ndụ bụ ego a na akwụ ndị ọrụ na agbakọ ihe dị icheiche dịka ego ndị ọrụ gị azụta ihe na ọnwa”
“A ga agbakọcha egọ nrị ha, ego ụlọọgwụ, ego ha gị azụ akwa, ụgwọ-ụlọ, ụgwọ ụgbọala ha jị abịa ọrụ na ego ihe niile ha ga emefu na ọrụ kwa ọnwa tupuu ha enwere ya mara akatamkpo ego gọọmentị ga akwụ ndị ọrụ”.
Lee ka ụgwọ opekatampe si kwụrụ na mba ndị Afrịka

Na mba Afrịka, Morocco kacha akwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa dịka ihe ndeko ụlọọrụ Statista mere n'afọ 2022.
Ndị Statista tụgharịrị ego niile mba dị icheiche na Afrịka na akwụ ndị ọrụ nakwa ọnụ ego ha na agbanwe ya na ọnụ ego dọlla ndị Amarika.
Na ndeko ahụ, ndị Chad, Libya, Gabon, na mba ndị ọzọ ka Naịjịrịa akwụ ndị ọrụ ụgwọọnwa.
Dịka Statista sị bịpụta: lee ihe dị iche na etiti Naịjirịa na mba afrịka ndị ọzọ kemgbe 2022
Naịjirịa $20.26
Morroco $285.61
Saut Afrika $248.12
Gabon $240.48
Equatoria Guinea $188.06
Congo 144.29
Tunisia $125.5
Botswana 123.19
Ihe na-esere Gọọmentị Naịjirịa na ndị NLC bụ ego ole gọọmentị kwesiri ịkwụ ndị ọrụ.
Ebe gọọmentị etiti Naịjirịa kwetere na ha ga akwụ ndịọrụ N60,000, ndị NLC jụrụ ma sị na ha chọrọ ka gọọmentị kwụọ ha ụgwọọnwa rụrụ N494,000 nke mere ndịọrụ jiri bido gba arụkwụghị m.
Ihe ndị NLC/TUC chọrọ n'aka Gọọmentị etiti Naịjirịa
Otu jịkọrọ ndị ọrụ bụ NLC na TUC bụ otu jịkọrọ ndị ahịa chọrọ ka gọọmentị etiti na akwụ ndị-ọrụ ego karịrị N100,000 n’ọnwa.
Otu abụọ ahụ mere ka amata nke a ka ha nwechere ọgbakọ ebe ha hazie ma jịkọta ihe ha chọrọ ọnụ.
N'akwụkọ ozi ede akwụkwọ ndị NLC bụ Tayo Aboyeji binyere aka, ndị NLC chọrọ ka gọomentị etiti Naịjirịa tinye ego nan’elu N60,000 ha kwetara na ha ga akwụ ndị ọrụ.
“Anyị kwetara na gọọmentị ga etinye ihe n’elu N60,000 ha kwetara”
“Anyị na enwedata ọnwa abụọ gọọmentị etiti nyere maka ịkpa nkata gbasara ụgwọọnwa ndị-ọrụ ka ọ bụrụ ihe a ga akpa n’otu ụzọ ụka maka ime ọsịso”
Ndị NLC na TUC gara n’ihu kwụsị arụkwaghịm ha na agba ka onye ha na gọọmentị ohere iwe ezi nkwekọrịta.
Na akwụkọw ọzị ahụ ndị NLC jiri kwụsị abụbọ ọru, Tayo Aboyeji dere sị “Arụkwaghịm akwụsịla ụgbụọ. Ọrụ ga amalịta echi”.








