A họpụtala onye ọkpaọchị dịka Osote Onyeisiala ọhụrụ nke mba Malawi

Ebe foto si, AFP
Michael Usi bụ ọkpaọchị a ma ama mechara banye ndọrọ ndọrọ ọchịchị abụrụla Osote Onyeisiala mba Malawi dịka e duchara ya n’iyi n’isi obodo ha bụ Lilongwe.
Nwamadị a gbara afọ 55 ga-anọchi anya Saulos Chilima, bụ onye nwụrụ n’ihe mbere ụgbọelu na mbido ọnwa Juun tinyere mmadụ asatọ ndị ọzọ.
Ndị mmadụ kwụụrụ ọtọ ma kụọrọ Uli aka dịka o kwuchara okwu nnabata n’iyi ọrụ e duru ya ma sị na o ji obi nwute na obi juru afọ nabata ọkwa ahụ.
O kwere nkwa ichekwa ugwu onye ọ na-achị anya ya ma kelee Onyeisiala Lazarus Chakwela maka ịtụkwasị ya obi dịka o weere ọkwa osote onyeisiala na gọọmentị a na-eke ikike eke.
Nhọpụta n’ọkwa ya ekewaala mba Malawi ụzọ abụọ.
Ụfọdụ na-ekesa ihe onyonyo ebe ọ na-akpa ọchị na soshal midia ma jụọ ma ọ ga-etinwu uche n’ọrụ osote onyeisiala.
Ebe ndị ọzọ etoola Onyeisiala Chekwara maka ịhọpụta osote onyeisi pati Chilima ma kwenyere mmekọrịta dị na pati abụọ ndị a ugwu.
Uli bụ onye a ma ama na-eme ihe nkiri ịkpa ọchị dị aṅaa nke mere e ji etu ya aha dịka ‘Manganya’ nke bụ aha o ji eme ihe ejije n’ọnyọnyọ TV.
Onye enyemaka ya gwara BBC na ọ ka mechapụrụ ihe onyonyo n’izuụka gara aga.
Ụgbọala kwọgburu nwaanyị dị ime na ndị ọzọ na-eru uju ọnwụ Chilima

Ebe foto si, AFP
Otu n’ime ụgbọala ndị so ozu osote onyeisiala Malawi bụ Saulos Chilima akwọgbuola ụfọdụ ndị na-eru uju, nke gụnyere nwaanyị dị ime na mmadụ ndị ọzọ.
Ndị uweojii sịrị na njinji ahụ jiri n’abalị Sọnde 16 Juun 2024.
Dịka ha siri kwuo, ebugaala mmadụ iri na abụọ (12) ndị nwetara ihe mmerụahụ ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ.
Ha kwuru na ihe ọdachi ahụ mere n’oge e nwechara nghọtahie n’etiti ndị obodo, ndị uweojii na ndịagha sitere isi obodo Malawi bụ Lilongwe na-ebula ozu Chilima obodo ya maka olili.
Chilima nwụrụ n’izuụka gara aga n’oge ọ na-aga akwamoozu onye bụbu mịnịsta mba Malawi ebe a ga-eli ozu ya n’obodo ya bụ Ntcheu dị na ndịda isi obodo mba ahụ.
Ndị Malawi na-akwanyere Saulos Chilima ugwu ikpeazụ n’ụka oliliozu ya

Ebe foto si, MALAWI GOVERNMENT
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọtụtụ ụmụafọ Malawi apụtala n’ama egwuruegwu mba ahụ maka ụka oliliozu osote onyeisiala ha nwụrụ anwụ bụ Saulos Chilima.
Chilima gbara afọ iri ise na otu (51) ma bụrụkwa onye a hụtara dịka “ume ndụ” na ndọrọndọrọ ọchịchị Malawi tupu ọ nwụọ n’ihe mberede ụgbọelu izuụka gara aga.
Ọ bụ onye maara etu e si agwa ọhanaeze okwu na etu e si akpalite mmụọ mmadụ ọkachasị ndị ntorobịa Malawi.
A na-ahaziri ya ụka oliliozu n’uju n’ihi na ọ bụ onye ụka Katolik a maara nke ọma.
E kwupụtala Mọnde 17 Juun 2024 dịka ụbọchị ezumiike na Malawi maka akwamoozu Chilima n’obodo ya bụ Ntcheu dị na ndịda Lilongwe.
Ụka oliliozu ahụ a na-ahazi n’ama egwuruegwu Bingu National Stadium bụ nke e ji ozi nkwanyeugwu sitere n’ezinaụlọ ya malite.
Ama egwuruegwu ahụ nwereike ịbanye mmadụ puku iri anọ na otu (41,000) juru eju ebe ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ezi.
Chilima nwụrụ n’ụbọchị Mọnde izuụka gara aga n’oge o ji ụgbọelu ndịagha na-aga akwamoozu onye bụbu mịnịsta n’obodo Nkhata Bay dị na mgbago ugwu Malawi.
Saulos Chilima: Ihe ị kwesịrị ịma maka osote onyeisiala Malawi nwụrụ anwụ

Ebe foto si, AFP
N’ụbọchị nke ịrị n’ọnwa Juun 2024 ka e bidoro chọwa osote onyeisiala mba Malawi bụ Saulos Chilima achọ.
Ụgbọelu ndịagha bu Chilima na mmadụ itoolu ndị ọzọ furu na njem mana e mechara chọta ebe ọ dara n'ọmaagụ dị na Chikangawa.
Ha si na Lilongwe bụ isi obodo mba Malawi eme njem aga ọdọ ụgbọelu nzuzu dị na Chikangawa.
Chilima na mmadụ ịtọọlụ ndị ọzọ amabaghị aha ha nwụrụ n'ihe mgberede ahụ.
Oge ụgbọelu ndịagha bụ Chilima na mmadụ asatọ ndị ọzọ furuefu na ịkụkụ nke mere gọọmenti mba Malawi jịrị nye ikike ka e bido chọwa ha bụ ihe mbụ mere ọ gi na ewuewu na shoshịal midịa.
Ugboelu ndịagha ahụ bụ Chilima na mmadụ ịtọọlụ feniru na ịsị obodo Malawi bụ Lilongwe n'elekere 9:17 nke ụtụtụ, mana ha mechara fụọ n’ịkụkụ nke mere e jịrị na achọ ha achọ.
Onye bụ Saulos Chilima?
- Saulos Chilima bụ osote onyeisiala mba Malawi nwụrụ n'ihe mgbere ụgbọelu.
- Ọ banyere n'ọkwa osote onyeisiala n'ụbọchị nke atọ n'ọnwa Febuwari, afọ 2020.
- Saulos dị afọ ịrị ise n'otu. Ọ lụrụ nwaanyị ma mụta ụmụaka abụọ.
- Ọ gụrụ akwụkwọ ọfụma ruo ọkwa PhD ma bụrụ onye gọọmenti mba Malawi na-ahụ dịka onye maara ọrụ ma bụrụ nnukwu onye nwere amamịhe.
- Ọzị maka ọnwụ ya n'ihe mberede ụgbọelu ha nke n'ụbọchị ịrị na otu, na ọnwa Juun 2024 edochabeghị anya.
Njem Saulos Chilime na ndọrọndọrọ ọchịchị
N'afọ 2018 ka Chilima kewaputara otu ọ kpọrọ United Transformation Movement (UTM).
O denyere aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke ọ gị nwere zọọ ọkwa na afọ 2019.
Na oge ahụ ka Chilima gi otu ya bụ UTM nwere kpokota otu ndọrọndọrọ ọchị dị icheiche na anọghị n’ochịchi ka ha nweike ịchụpụ gọọmentị nọ na ọchịchị oge ahụ.
Mana a kagburu ntụliaka e mere na 2019 nke mere ha jịrị megharịa ya n'afọ 2020.
Mana 2019 ka Chilima zọrọ ọkwa dịka osote onyeisiala ebe Michael Usi bụ Onyeisiala mana ha gbara ndị nke atọ nna ntụlịaka ahụ.
Na afọ 2020 ka ọ zọrọ ọkwa ọzọ dịka osetere onyeisiala, ebe Lazarus Chakwera bụ onyeisila.
Ha abụọ nwetara mmeri ma turu ugo n’ntụlịaka ahụ.
Etu gọọmenti Malawi si kwanyere Chilima ugwu n'ozi ọnwụ ya
N'akwụkwọ ozi Colleen Zamba bụ odeakwụkwọ onyeisiala na mba Malawi binyere aka ọ sị na “ụlọọrụ Onyeisiala na ndị ọchịchị na-agwa ohaneze na ha ebidola ịchọ ma zọpụta ụgbọelu nke ndị agha anyị bidoro furuefu n’ụbọchị Monday, abalị ịrị nke ọnwa June na afọ 2024”.
“Ụgbọelu ahụ bụ osetere onyeisiala Saulos Klaus Chilima na mmadụ itoolu ndị ọzọ ka a hụrụ na ọmaagụ dị na Chikangawa mana ndị niile nọ n’ime ụgbọelu ahụ nwụrụ anwụ.
“A gwaala onyeisiala mba Malawi bụ Lazarus mcCarthy Chawera maka mkpamkpa ahụ. Onyeisiala na onwe ya bere akwaarịrị ma tie ezinaulo Chilima aka n’obi”.
“Onyeisiala nyere iwu ka nwedeta ọkọrọtọ Malawi ka ọ dị n’etiti rụọ ụbọchị a ga eli ozu ya, ma kwuputa na mba Malawi niile ga anọ n’ịrị uju otu ụbọchị”.









