Ihe mere m ga saa ara m - Eniola, nwaagbọghọ sara ara ya
- Onye dere ya, Amaka Bassey, Faoziyah Saanu-Olomoda & Oluwadara Onipede
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist, Journalist & Video Journalist
- Ebeg o si, Lagos
"Ara m na-anyị m arọ, ọ na-eme ka azụ na-egbu m mgbu" bụ ihe otu nwaagbọghọ kwuru mere ọ ji gaa mee emume ịsa ara ya.
Anyị ahụla ka ndị ogbaraọhụrụ si alọghachi n’ụzọ omenala n’okpukperechi, mana nso nso a, ụfọdụ n’ime ha na-achọ ọgwụgwọ maka ihe dị iche iche n’ụzọ omenala.
Na mkparitaụka anyị na nwaada a kpọrọ Eniola nwere, ọ kọọrọ anyi ka o si nweta ọgwụgwọ banyere ara ya bidoro na-anyị ya arọ.
Ịsa ara bụ emume a ma ama n'etiti ndị agbụrụ Yoruba, ndị bikarị n'ọdịda anyanwụ Naịjirịa.
Nwata nwaanyị ahụ kwuru na nne ya ochie hụrụ etu ara ya si buo ibu nke ukwuu were nwee nchekasị maka na akpụ nwereike ị dị n'ime ya. Ọ bụ maka eke a ka o ji dụọ ya ọdụ ka ọ gaa saa ara ya n'ụzọ pụrụiche.
"Mgbe m mechara ya, a hụrụ m ihe dị iche iche, ma ụfọdụ dịka ndanda" ka o kwuru.
BBC Igbo mere njem gaa Kwara Steeti ịchọpụta ihe gbasara emume a pụrụiche ma hụkwa ụmụnwaanyị ndị ọzọ siri usuro a wee nweta ọgwụgwọ.
Umunwaanyi ahụ kwuru na ha sara ara ha maka na mmiri ara ha agbaghị ka ha muchara nwa, mana ka ha sachara ara, o wee gbawa.
Otu nwaanyi na-asa ara n'Ilorin kwuru na ọ na- asa ara ka nsogbu umunwaanyi a si di. Ụfọdụ bụ abali asaa, ebe ụfọdụ bụ abali atọ.
Na aka nke ọzọ, dokinta na ahụ maka ahụike ụmụnwaanyị kwuru na o nweghi etu isa ara ga-esi gwoo akpụ ara, mana enwereike maka ịfị aka n'ara, mmiri ara apụta.
Ọ kwukwara na-abia n'ihe gbasara akpụ ara na o nweghi Ihe ịsa ara ga emewu. Ọ dụkwara ụmụnwaanyị ndumọdụ ka ha gaa ulọọgwụ ma ha wee nsogbu n’ara ha.
Lee ihe nile ị kwesịrị ịma n'ihe ndị anti chọpụtara n'ime onyonyo a.






