"Ọ dịghịrị m mfe ibido ihe ịkpa ọchị" - Neekah Uwayah

- Onye dere ya, Jessica Nwankwo na Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist na Video Journalist
Ginika Uwayah bụ nwaada na-azụ ahịa malitere ịme ihe ịkpa ọchị iji kpọbata ndị ga-azụ ya ahịa mana ugbua ọ na-ewu ebe niile.
Na mkparịataụka ya na BBC Igbo nwere, nwaada ahụ bụ onye Delta steeti gwara BBC na o nweghi onye ọ na-adịrị mfe ịmalite ọrụ ịkpa ọchị.
Mana ọ dụrụ ndị mmadụ ndụmọdụ ha jisike n'ihe ọbụla ha chọrọ ịme iji hụ na ha nwetara mmeri na ngwụcha.
"E mena ihe onyonyo n'ihi na ịhụrụ ebe onye ọzọ na-eme ya" ka o kwuru.
Kama ọ sị ka ndị mmadụ tinye uche ịmata ihe ga-arụrụ ha ọrụ ma gbado anya na ya.
Ginika e ji Neekah mara kwukwara na ọ bụ ndị nso ya na-akpalite mmụọ ya eme ya ka ọ gba mbọ mekarịa echi nke o mere taa.
Ọ sị na ọ na-enye ya ọṅụ ma ndị mmadụ zitere ya ozi etu ihe ọ na-eme si emetụta ndụ ha n'ụzọ.
Gee ihe ọ gwara BBC n'uju ebe a.


