Ihe BBC chọpụtara mgbe ha gara n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ gọọmenti Abia Steeti sị ha na-arụzi

Aha onyonyo, Ihe BBC chọpụtara mgbe ha gara n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ gọọmenti Abia Steeti sị ha na-arụzi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Iji chọpụta nke bụ eziokwu banyere ihe gọọmenti Abia steeti kwuru maka akwụkwọ mkpesa ụfọdụ ndị pati All Progressive Congress (APC) gbara ha n'aka ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ bụ EFCC na ICPC banyere ego ha na-emefu iji rụzie ụlọakwụkwọ dị na steeti ahụ, BBC Igbo gara njem n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị na mpaghara Aba Saụt ma chọpụta na ọrụ na-aga n'ihu n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ ndị ahụ e kwuputara aha ha.

Onye ntaakụkọ anyị gara ụlọakwụkwọ National High School, Umuagbai Secondary School, Etche Road Primary School nakwa Comprehensive Secondary School dị n'kpuru ọchịchị Aba Saụt ma hụ na ndị ọrụ nọ ọrụ n'ụlọakwụkwọ ndị a n'agbagnyeghị mmiri ozuzo.

Ihe ngosi aha ụlọakwụkwọ Abia State School System dị n'Aba.

O doghị anya ka ụlọakwụkwọ ndị eso na ndị gọọmenti mapụtara maka atụmatụ bekee kpọrọ 'smart school' mana ihe anyị chọpụtara bụ na a gaghị arụcha ọrụ ụlọakwụkwọ ndị ahụ tupu ụmụakwụkwọ amalite akwụkwọ n'ọnwa Septemba 2025.

Nchọpụta anyị gosiri na ọ bụ naanị ụlọakwụkwọ ka a kụrụ gbamgbam dịka a na-eche ka a gbaa ya pent ma tinye ụfọdụ ihe ụmụakwụkwọ ji amụ akwụkwọ n'ime ya.

Otu ụlọakwụkwọ ahụ a na-arụ
Ihe ngosi aha ụlọakwụkwọ Etche Road Praịmrị dị n'Aba Saụt

Anyị anaghị atụegwu maka mkpụpụ a kpụpụrụ anyị n'ụlọọrụ EFCC - Gọọmenti Abia Steeti

Alex Otti bụ Gọvanọ Abia Steeti

Ebe foto si, Ferdinand Ekeoma/Facebook

Gọọmentị Abia Steeti ekwuola na egwu anaghị atụ ha maka onye ọbụla ịnyocha ha n'ego ndị ha na-emefu iji rụọ ọrụ metụtara steeti ahụ.

Onye ndụmọdụ pụrụiche Gọvanọ Alex Otti bụ Ferdinand Ekeoma gwara BBC Igbo nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ maka akwụkwọ mkpesa ụfọdụ ndị pati All Progressive Congress (APC) gbara ha n'aka ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ bụ EFCC na ICPC n'ịchafụ.

Otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Eze Chikamnayo na ndị ọzọ dere akwụkwọ mkpesa a n'Abuja megide Gọvano Alex Otti ma kwuo ka ọ bịa kọwaa etu o si mefuo ijeri naịra iri ise na anọ amawapụtara maka ịrụzi ụlọakwụkwọ n'Abia Steeti.

Ha kwuru na Gọvanọ egosighi foto, aha ụlọakwụkwọ maọbụ ebe ụlọakwụkwọ ndị a nọ maọbụ akwụkwọ e ji nye ndị ọrụ ngo ọrụ ahụ.

Gọọmentị Abia Steeti ekwuola na egwu anaghị atụ ha maka onye ọbụla ịnyocha ha n'ego ndị ha na-emefu iji rụọ ọrụ metụtara steeti ahụ.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Na nzaghachị, Ekeoma kwuru na ọ bụ ihe dị mma ka ndị a na-achị na-ekwupụta okwu ma ọ bụrụ ha hụụ ihe dị aṅaa n'ọchịchị gọọmenti.

O kwuru na ebe ọ bụ na o nweghi ihe nzuzo dị n'ọchịchị Gọvanọ Otti, ya mere na obi anaghị amapụ ha ma onye ọbụla kpụpụ ha n'ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ maka nnyocha.

O kwuru na o nweghi mgbe gọọmenti mefuru ego dị ijeri naịra iri ise na anọ maka ịrụzi ụlọakwụkwọ dịka ndị a si boo ebubo.

"Oge a na-ekwu okwu ya bụ n'agba anọ nke afọ 2024 a kpọrọ 'fourth quarter', ihe gọọmentị mefuru iji rụzie ụlọakwụkwọ bụ naanị ijeri naịra abụọ na otu ụma (N2.1bn).

"Kama ego a mawapụtara maka iji rụzie ụlọakwụkwọ n'afọ 2024 niile bụ ijeri naịra iri ise na anọ (N54bn) bụkwanụ ihe ndị a kpụụ n'ọnụ gbaa gọọmenti akwụkwọ.

Mgbe a jụrụ ya ego ole ka gọọmenti mefurula maka ịrụzi ụlọakwụkwọ, Ekeoma kwuru na o nweghi ike ikwu kpọmkwem ego ole gọọmentị mefurula kama na ọ ga-adị n'akwụkwọ nchịkọta ego niile e mefuru kwa afọ a kpọrọ 'audited annual account'.

O kwuru na e wepụ nruzigharị ụlọakwụkwọ nke ha na-eme, na gọọmenti emeela ọtụtụ ihe ndị ọzọ na ngalaba agụmaakwụkwọ, nke gụnyere iwe ndị nkuzi karịrị puku ise n'ọrụ, nakwa inye ha ezigbo ọzụzụ.

Lee ụlọakwụkwọ ndị Gọọmenti Abia na-arụzi ugbua

Na nzaghachị, Ekeoma kwuru na ọ bụ ihe dị mma ka ndị a na-achị na-ekwupụta okwu ma ọ bụrụ ha hụụ ihe dị aṅaa n'ọchịchị gọọmenti.

Akwụkwọ si n'aka mịnịstrị agụmaakwụkwọ n'Abia Steeti nke rutere BBC Igbo gosiri aha ụfọdụ ụlọakwụkwọ ndị gọọmentị na-arụzi.

Ọnụọgụgụ ụlọakwụkwọ ndị a dị iri isii na abụọ nke dị n'ime okpuruọchịchị iri na asaa mejupụtara Abia Steeti.

Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị a ka na-arụ ọrụ ugbua.

Abia North

(Arochukwu, Bende, Isuikwuato, Ohafia, Umunneochi)

Arochukwu

1. Ututu Junior Secondary School

2. Ihe Central School, Ihechiowa

3. Uruji Secondary School, Amuri-Abam

Bende

4. Amankalu Primary School, Igbere

5. Ozuitem Central School

6. Community Primary School, Agbozu Uzuakoli

7. Okposi Primary School, Igbere

Isuikwuato

8. Achara Uturu Central School

9. Eluama Central School

10. Mbaugwu Community Secondary School

Ohafia

11. Abiriba Nmaju Memorial Primary School

12. Amangwu Community School

13. Etiitama Community School

14. Biama Community School, Abiriba

15. Ofali-Agwu Primary School

Umunneochi

16. Mbala Community School, Mbala Isuochi

17. Nneato Junior Secondary School

18. Mbala Primary School

Abia Central

(Ikwuano, Isiala Ngwa North, Isiala Ngwa South, Osisioma, Umuahia North, Umuahia South)

Ikwuano

19. Ikwueke Community Secondary School

20. Ogbuebule Community Secondary School, Oboro

Isiala Ngwa North

21. Osusu Community Secondary School

Isiala Ngwa South

22. Omoba Central Model School I

23. Omoba Central Model School II

24. Amato Umuawa Community School

25. Ngwaobi Community School

26. Migrant Farmers Primary School, Umumgbo

27. Umuene Umuopia Primary School

28. Umuika Community Primary School

29. Umuikaa Model Secondary School

30. Amaudo Owerrinta Primary School

Lee ụlọakwụkwọ ndị Gọọmenti Abia na-arụzi ugbua

Osisioma

31. Owo na Umuosi Community School

32. Urata Amaise Migrant Farmers Primary School

33. Umuocham Girls Junior Secondary School, World Bank

34. Umuocham Girls Senior Secondary School, World Bank

35. Aro-Ngwa Primary School

Umuahia North

36. Ohuhu Community Secondary School, Amaogwugwu

37. Nkata Community School

38. Ibeku High School

Umuahia South

39. Mgbarakuma Primary School

40. Urban Mission Hill Primary School

41. Amakama Community High School, Olokoro

42. Umuogo Community Primary School, Ubakala

43. Umuokpara Secondary School

44. Ubakala Senior Secondary School, Nsukwe

45. Ubakala Junior Secondary School, Nsukwe

46. Ogbodinibe Community Primary School, Umuokpara

Abia South

(Aba North, Aba South, Obingwa, Ukwa East, Ukwa West, Ugwunagbo)

Aba South

47. Etche Road Primary School I

48. Etche Road Primary School II

49. Ndiegoro Comprehensive Junior Secondary School (Ulasi Girls)

50. Ndiegoro Comprehensive Senior Secondary School (Ulasi Girls)

51. Akoli Road Primary School

52. National High School, Aba

53. Ulasi Road Primary School I

54. Ulasi Road Primary School II

55. Umuagbai Secondary School

Obingwa

56. Itungwa Primary School

57. Ibeme High School, Obete Ukwu

Ukwa East

58. Akwete Junior Secondary Technical

59. Akwete Senior Secondary Technical

60. COMMUNITY PRIMARY SCHOOL, OBUOZU-NDOKI

Ugwunagbo

61. Owerre Aba Community School

62. Abayi Nchokoro Primary School