Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala ndị isi ọhụrụ maka ụlọọrụ South East Development Commission

Ndị isi ọhụrụ a họpụtara maka ụlọọrụ South East Development Commission

Ebe foto si, Mark Okoye/Facebook, Adejokechukwumah/Instagram, Emeka Wogu/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ozi obi ọchịchị Naịjirịa wepụtara na-ekwu na Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala mmadụ ise ndị ọhụrụ ga-anọ n'isi ụlọọrụ South East Development Commission (SEDC).

Onye ndụmọdụ onyeisiala gbasara mgbasaozi na nhazi ọrụ bụ Bayo Onanuga wepụtara ozi ahụ n'ụbọchị Satọde 7 Disemba 2024.

Ọ kọwara na onyeisiala gbanwere onye ọ họpụtaburu na mbụ dịka onyeisioche SEDC bụ Hon. Emeka Atuma ma were Dr Emeka Wogu dochie anya ya.

Onanuga kwukwara na onyeisiala gbanwere mmadụ atọ niile a họpụtaburu dika ndị nnukwu ntụziaka ma tinyekwa aha mmadụ abụọ ndị ọhụrụ.

Dịka ozi ahụ siri kwuo, onyeisiala wezugara aha Donatus Enyinna Nwankpa dịka otu n'ime ndị mejupụtara otu bọọdụ ahụ.

Ka o sinadị, Hon. Mark C. Okoye ga-aga n'ihu n'ọrụ ya dịka nnukwu onye nlekọta na nnukwu onyeisi nke bọọdụ ahụ nwere mmadụ iri na isii (16).

Stanley Ohajuruka ga-anọchi anya Anthony Ugbo dịka nnukwu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ego ebe Toby Okechukwu ga-anọchi anya Obinna Obiekweihe dịka nnukwu onyeisi ngalaba na-ahụ maka atụmatụ ọrụ.

N'aka nke ọzọ, Chief Sylvester Okonkwo ga-anọchi anya Dr Daniel Ikechukwu Ugwuja dịka nnukwu onyeisi na-ahụ maka ọrụ ndị gbara ọkpụrụkpụ.

Mmadụ abụọ a họpụtara dịka nnukwu ndị isi enyebeghị ọkwa ọbụla bụ Chidi Echeazu na Dr Clifford Ogbede.

Ndị ọzọ onyeisiala hapụrụ n'ọkwa ha bụ Barr. Ugochukwu H. Agballah, Hon. Okey Ezenwa, Chief Hyacinth Ikpor, Barr. Ifeanyi Agwu, Nasiru Usman, Hamma Adama Ali Kumo, Edward David Onoja, Orure Kufre Inima na Chief (Mrs.) Joke Adebayo-Chukwuma.

Ozi ahụ kwuru na mmadụ ndị a ga-amalite ọrụ oge ụlọ omeiwu sịnetị nabara ha.

South East Development Commission na uru ọ ga-abara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Akwammiri Niger nke abụọ

Ebe foto si, Julius Berger

Onyeisiala Bola Tinubu nọọrọ n’ụbọchị Tuzde 23 Julaị, 2024 tinye aka n’akwụkwọ iwu ka e hiwe ngalaba South East Development Commission (SEDC).

Osote onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Benjamin Kalu bụ onye kwadoro atụmatụ iwu a kwupụtara nke a. Ndị omeiwu ndị ọzọ sikwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ sokwa kwadoo atụmatụ iwu a.

Iwu a ga-eme ka e hiwe ụlọorụ South East Develoment Commission (SEDC), nke ga-ahụ maka mwulite mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Atụmatụ iwu ihiwe ụlọorụ a malitere n’ụlọomeiwu nta bụ ebe ọ gafere ngụpụta nke atọ n’ọnwa Disemba afọ 2023 tupu e zigara ya ndị Sịnetị.

N’ọnwa Febụwarị 2024, ndị ụlọomeiwu ukwu bụ Sịnetị tinyere aka n’akwụkwọ iwu ma kwadoo ka e hiwe ụlọọrụ SEDC a tupu Onyeisiala Tinubu emezie ka ọ bụrụ iwu ugbua.

Kedụ uru SEDC ga-abara Ọwụwa Anyanwụ?

  • Ụlọorụ SEDC ga na-enweta ego site n’aka Gọọmentị etiti maka ịrụzigharị okporoụzọ, ụlọorụ na akụnaụba ndị e mebiri n’oge agha Biafra n’ihe ruru afọ 54 gara aga.
  • Ụlọorụ a ga-ahụ na e gboro nsogbu a kpọrọ 'ecological problem' nke gụnyere ala mbuzi, idemmiri na ihe ndị ọzọ na-enye nsogbu na gburu gburu ebe obibi n’Ọwụwa Anyanwụ.
  • Mwulite ndị a ga-agbakwasị ụkwụ n’okporoụzọ, ahụike, agụmaakwụkwọ, inye ọrụ, ọrụ ugbo, ihiwe ụlọọrụ nrụpụta ihe, ụlọ ebe obibi, mmepe ime obodo, mmiri ọṅụṅụ, ọkụ latrik na igwe nziritaozi n’ekwentị.
  • Ọ ga-enye Gọọmentị etiti ndụmọdụ etu dị mma a ga-esi na-amịpụta mmanụ agbidi nakwa ihe ọnatarachi ndị ọzo dị n’Ọwụwa Anyanwụ.
  • Ụlọorụ SEDC na ụlọọrụ ndị na-amipụta mmanụ agbidi nakwa ihe ndị ọzọ ga na-arụkọ ọrụ iji hụụ na e gbochiri ihe ọbụla nwereike imebi gburu gburu ebe obibi.

A na-atụkwa anya na iwu a ga-eme ka ndị si na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nwee obi aṅụrị ma hụta onwe ha ka ndị so na Naịjirịa na-abụghị ndị a na-akpapụ iche.

Onyeisi ụlọomeiwu bụ Godswill Akpabio kwuru “iwu a dị oke mkpa nye ndị ụlọomeiwu. Ọ ga-akwụsị egwu ụmụnne anyị si na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nwere n’ebe Naịjirịa nọ.”

N'otu aka ahụ ndị ụlọomeiwu na-atụlekwa ime iwu ga-ehi ụlọọrụ North Central Development Commission nakwa South West Development Commission.