Okwu Nnamdi Kanu bụ okwu nwereonwe, ọ bụghị okwu nchekwa - Aloy Ejimakor

Nnamdi Kanu na okaiwu ya bu Aloy Ejimakor
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu

Aloy Ejimakor onye a ma dịka Ọkaiwu Nnamdi Kanu ekwuola na ọ bụ naanị Onyeisiala Tinubu ka ọ dịịrị ikwu okwu maka ntọhapụ Nnamdi Kanu.

O kwuru nke a n'ụbọchị Tuusde n'akara Twitter ya ebe o kwuru na ọ bụghị ndị isi ndị agha nwere ikike ikpebi maka ya bụ ntọhapụ.

"Okwu Nnamdi Kanu abụghị okwu nchekwa ọ bụ okwu gbasara mnwereonwe nke dị onyeisiala n'aka abụghị ndị isi ndị ọrụ nchekwa" ka o kwuru.

O ji ohere ahụ gwa ndị na-ebugharị akụkọ na ọ bụ okwu nchekwa ha kwụsị ya kpam kpam.

Ejimakor kwuru na ịchọ mwereonwe abụghị ajọ ihe ma maa atụ ebe ụfọdụ e ji ya zota ihe dịka mnwereonwe Naijiria nakwa etu Adamawa steeti si sonye na Naijiria.

"Kedụ ihe mere nke Biafra ga-eji dị iche" ka ọ jụrụ.

Okwu ya na-abịa dịka ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwupụtara na ha na-akwado igakwu onyeisiala iji kpa maka ntọhapụ Kanu.

Ndị omeiwu zutekwara Ọkaiwu kachasị na Naijiria iji kpa maka otu ihe ahụ bụ ntọhapụ Kanu.

Ndị Sịnetọ si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ arịọla ka a tọhapụ Nnamdi Kanu

Ndị Sịnetọ si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa arịọla Onyeisiala Bola Tinubu ka o nye iwu ka a tọhapụ onyeisi otu IPOB bụ Nnamdi Kanu.

Ndị Sinetọ ahụ na ọkaiwu ukwu gọọmenti etiti na mịnịsta na-ahụ maka ikpe bụ Lateef Fagbemi nwere ọgbakọ n'ụbọchị Tuzde Julai 2, ebe ha nọ wee nye ya akwụkwọ arịrịo ha degaara Onyeisiala Tinubu maka ntọhapụ Kanu.

Mgbe onyendu ndị sịnetọ ahụ bụ Enyinnaya Abarib na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, o kwuru na "Ọnọdụ akụnaụba na mmekọrịta ọhanaeze na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na-ata ahụhụ nke ukwuu maka na Kanu nọ n’ụlọ mkpọrọ."

Abaribe kọwara na ya na Nnamdi Kanu nwere ọgbakọ n’ụlọọrụ ndị Department of state services (DSS) ebe Kanu nọ wee kweta na ya ga-erube isi n’iwu obodo ma ọ bụrụ na a tọhapụ ya.

Ndị Sịnetọ ahụ rịọrọ ọkaiwu ukwu Fagbemi ka ọ rịọ Onyeisiala Bola Tinubu ka a kagbuo ebubo niile e boro Kanu ma mee ka o nwere onwe ya.

Gọọmentị kwesiri ịrubere ụlọikpe isi ma tọghapụ Nnamdi Kanu - Peter Obi

Nnamdi Kanu na Peter Obi

Ebe foto si, Getty Images/BBC

Peter Obi zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha otu Labour Party esorola tinye ọnụ n'okwu ịtọghapụ Nnamdi Kanu.

Obi kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Onitsha sị na ọ hụghị ihe gọọmentị gbadoro aka ika ji jichie Kanu ọ kachasị dịka ụlọikpe kachasị kpebiri ka atọghapụ ya.

"Anyị nọ n'ọchịchị onye kwuo uche ya, anyị ekwesighi i na-eme ihe sọrọ anyị nke iwu akwadoghi" ka Obi kwuru.

Ọ sịkwa na iwu bụ ihe mmadụ niile kwesiri ịchekwa ma sọpụrụ sị "E ji m ohere a arịọ gọọmentị etiti ka ha hụ na atọhapụru ndị niile nọ n'ọnọdụ ahụ ma kpaa ya".

Ihe ọzọ Obi tinyere ọnụ na ya bụ ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa niile.

Ọ sị na ọ bụ ihe oke echiche na akụko ogbugbu, ntọ na nsogbu nchekwa ndị ọzọ emeela ka Naịjirịa soro n'otu ebe nchekwa ka njọ na mba ụwa niile.

O kpọkwara oku ka ndị Gọvano jikọọ aka wụlite mpaghara ọwụwa anyanwụ dịka ọ sị na ọ dị mkpa ka ndị Gọvanọ ebe ahụ lụsọ nsogbu nchekwa agha.

Ihe dị mkpa bụ ijisi ike na-ekwu maka Nnamdi Kanu - Ohaneze Ndigbo

Nnamdi Kanu na Alex Ogbonnia

Ebe foto si, Getty Images/Alex Ogbonnia

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ohaneze Ndigbo bụ otu jikọrọ ndị Igbo na mbaụwa niile ma na-elekọta ọdịmma ha egosila obi ọma ha n'ebe ndị omeiwu degara Onyeisiala Tinubu ozi maka Nnamdi Kanu nọ.

Alex Ogbonnia bụ ọnụ na-ekwuru otu ahụ sị na o kelere ndị omeiwu ahụ niile ma sị ha daalụ maka mbọ ha na-agbara Kanu.

Ọ sị na ọ dị mkpa na mmadụ niile so akwanye gọọmentị etiti ọkụ n'ike iji tọghapụ Kanu n'aka ndị uweojii pụrụiche bụ DSS ji ya.

Dịka o si dị n'okwu (Nelson) Mandela, bụ onye a tụrụ nga, o nwere ka o ruru dịka ndị mmadụ jisike akpọ oku, atọghapụ ya, etu ahụ ka ọ ga-adịrị Nnamdi Kanu" ka Ogbonnia kwuru.

Cheta na ihe ruru ndị omeiwu 50 jikọrọ aka degara onyeisiala Tinubu akwụkwọ ozi si ya gwa ọkaiwu kachasị ka o jiri ikike dị n'ime iwu ala Naịjirịa tọghapụ Nnamdi Kanu ma kwụsị ikpe ya ikpe.

Ogbonnia gara n'ihu kọwaa na o nweghi ihe dị njọ Nnamdi Kanu mere n'ịkpọ oku mnwereonwe.

"Ọ bụ maka obi adịghị ndị mmadụ mma na mkpachapụ a na-eme ndị Igbo ka oku mnwereonwe ji malite

Ndị mmadụ na-ekwu ọ bụrụ na ịchọghị ka anyị sonye, ịhapụ anyị ka anyị jewere onwe anyị"

Mgbe Buhari nọ n'ọchịchị, o nweghi onye Igbo e nyere ọrụ nchekwa, nke ahụ edoghi anyị anya" ka o kwuru.

Ogbonna kọwakwara na onye Igbo niile kwesiri ịma na ọgụ mwereonwe Nnamdi Kanu na-alụ abụghị maka onwe ya kama ọ bụ maka onye Igbo niile.

O kwenyekwere ka ọtụtụ ndị mmadụ jikọọ aka na-akpọ oku ka atọghapụ Kanu na ọ ga-emecha nwee isi.

Ihe mere ndị omeiwu 50 ji degara Onyeisala Tinubu ozi ya tọghapụ Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu na Onyeisiala Naijiria Bola Tinubu

Ebe foto si, BBC/Bola Tinubu/Twitter

Nkọwa foto, O teela aka otu dị icheiche ji akpọ oku ka atọghapụ Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu IPOB

Ihe ruru ndị omeiwu 50 edegarala onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu ozi ma kpọọ oku n'ime ya ka ọ tọghapụ Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob.

Kanu nke gọọmentị Naịjirịa nwụchiri ma kpọlata Naịjirịa kemgbe afọ 2021 ka nọ n'aka ndị uweojii pụrụiche bụ DSS kemgbe ahụ n'agbanyeghi mkpebi dị icheiche ụlọikpe nyere ka atọghapụ ya ma kwuo ya ụgwọ mmekpahụ.

N'ime akwụkwọ ozi ahụ, ndị omeiwu ahụ kwuru ka Onyeisiala Tinubu nye Ọkaiwu kachasị iwu ka o weta ikike dị n'ime iwu ala Naịjirịa iji tọghapụ Nnamdi Kanu ma kwụsị ikpe ya ikpe kpam kpam.

Ndị ahụ dịka Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor depụtara n'akara Twitter ya gụnyere:

Hon. Obi Aguocha (Abia),

Hon. Ikenga Ugochinyere (Imo),

Hon. Aliyu Mustapha (Kaduna),

Hon. Midala Balami (Borno),

Hon. Afam Ogene (Anambra),

Hon. Abiante Awaji-Inombek (Rivers),

Hon. Dominic Okafor (Anambra),

Hon. Etanabene Benedict (Delta),

Hon. Shehu Dalhatu (Katsina),

Hon. Chinedu Emeka Martins (Imo),

Hon. Matthew Nwogu (Imo),

Hon. Muhammed Buba Jagere(Yobe),

Hon. Peter Aniekwe (Anambra),

Hon. Koki Sagir (Kano),

Hon.Amobi Oga(Abia),

Hon. Gwacham Chinwe (Anambra),

Hon. Uchenna Okonkwo (Anambra),

Hon. Abdulmaleek Danga( Kogi ),

Hon. Osi Nkemkama (Ebonyi),

Hon. Mark Useni (Taraba),

Hon. Alexander Mascot (Abia),

Hon. Philip Agbese (Benue),

Hon. Ginger Onwusibe Obinna (Abia),

Hon. Zakari Nyampa (Adamawa),

Hon. Jamo Aminu (Katsina), and

Hon. Emeka Idu Obiajulu (Anambra),

Hon.Nnabuife Chinwe Clara(Anambra),

Hon. Ukodhiko Jonathan (Delta),

Hon. Akingbaso Olarewaju(Ondo),

Hon. Lilian Obiageli Orogbu (Anambra),

Hon.Marcus Onobu(Edo),

Hon.Chinedu Obika (FCT Abuja),

Hon.Billy Osawaru (Edo) ,

Hon.Ojuawo Rufus Adeniyi (Ekiti),

Hon.Okoli Ngozi Lawrence (Delta),

Hon.Ezechi Nnamdi ( Delta),

Hon. Alozie Munachim Ikechi(Abia),

Hon.Nkwonta Chris (Abia),

Hon.Nnamchi Paul Sunday (Enugu),

Hon. Obetta Mark Chidi( Enugu),

Hon. Tochi Okere Chinedu (Imo),

Hon. Uguru Emmanuel (Ebonyi),

Hon.Joseph Nwaobasi (Ebonyi),

Hon.Onwugbu Befford Anayo (Enugu),

Hon.Atu Chimaobi Sam(Enugu),

Hon.Sunday Cyriacus Umeha (Enugu),

Hon. Anthony Adepoju (Oyo).

Gịnị bụ "nolle prosequi" dị n'ime s.174 iwu ala Naịjirịa?

"Ihe mere anyị ji achọ ka e kpezie okwu Nnamdi Kanu na Gọọmentị Naịjirịa n'ụzọ udo” – Ndị ọkaiwu Kanu

Aha onyonyo, "Ihe mere anyị ji achọ ka e kpezie okwu Nnamdi Kanu na Gọọmentị Naịjirịa n'ụzọ udo” – Ndị

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) akwọwaala ihe mere ha jiri achọ ka ekpezie okwu dị n’etiti Kanu na Gọọmentị Naịjirịa n’ụzọ na-abụghị n’ụlọikpe.

Otu n’ime ọkaiwu ya bụ Nnaemeka Ejiofor gwara BBC Igbo na mkpezi a ha chọrọ ka e kpezie abụghị ihe ọhụrụ, na ọ bụ okwu na-agabu n’ihu n’etiti Kanu na gọọmentị.

O kwuru na Kanu na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ nọbụ na-akpa nkata udo ahụ n’afọ 2017 ruo mgbe ndịagha wakpoo ụlọ ha dị n’Afara Ukwu Umuahia.

“Nnamdi Kanu na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ nọbụ na-akparịtaụka udo n’afọ 2017 mana ndịagha Naịjirịa wakporo ụlọ ha.”

Ọkaiwu Ejiofor kwuru na ihe ha chọrọ ugbua bụ ka ha na gọọmentị etiti malitekwa mkparịtaụka udo ahụ maka na nsogbu ọbụla e nwere n’ụwa na ọ bụ mkparịtaụka ka e ji ekpezi ya.

“Ihe anyị chọrọ ugbua bụ ka anyị na gọọmentị etiti malitekwa mkparịtaụka udo ahụ maka na nsogbu ọbụla bụ mkparịtaụka ke e ji ekpezi ya.

O kwuru na ha kwenyere na Onyeisiala Tinubu ka banyere n’ọchịchị ọhụrụ ga-aṅa ha ntị maka na o nwere echiche dị iche karịa nke pụrụapụ bụ Buhari.

Ejiofor gbakwụnyere na ọ bụ otu mkparịtaụka ahụ ka e nwere n’oge alụchara agha Biafra na gọọmentị Naịjirịa.

"Anyị chọro ka ka e kpezie okwu n'ụzọ ọzo"

Nnamdi Kanu na ọkaiwu Ejimakor
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ọkaiwu Ejimakor

Ndị ọkaiwu Kanu gwara ụlọikpe n'ụbọchị Wenezde ahụ na ha chọro ka ha na gọọmenti Naịjirịa soro ụzọ ọzọ na-abụghị ụlọikpe kpezie okwu Kanu, onye e boro ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịbụ onye otu Ipob

Ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor, gwara ụlọikpe ukwu dị n'Abuja na isoro ụzọ ọzọ na-abụghị ụlọikpe kpezie okwu bụ nke akwụkwọ iwu Naịjirịa kwadoro.

Na nzaghachi, ọkaikpe Binta Nyako kwuru na, “Ọ bụghị ụlọikpe ahụ ga-ekwu ka e soro ụzọ ọzọ kpee ikpe ahụ, na ọ bụ ọkaiwu ukwu gọọmenti etiti (AGF) ga-amalite ya.”

Ikpebi ikpe ahụ site n’ụzọ na-abụghị ụlọikpe nwere ike ị bụ ụzọ a ga-eji gbapụta Nnamdị Kanu onye gbara afọ 56 nọ n'ụlọ mpkọrọ kamgbe afọ 2021.

Nke na-edoghị anya bụ ma isoro ụzọ ọzọ na-abụghị ụlọikpe kpezie okwu ahụ, ọ ga-agbanwe usoro otu IPOB si achọ nwere onwe Biafra.

Ọnọdụ enweghi ezi nchekwa na-echere Naijiria aka mgba kemgbe, ebe ndị nyocha ọrụ nchekwa na-ekwu na amaghị ma itọhapụ Nnamdi Kanu ọ ga-akwụsị ọkpụkpọ oku nwere onwe Biafra.

N'ikpe a ụbọchị Wenezde, ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ bụ Binta Nyako anabataghị akwụkwọ ndị ọkaịwụ Nnamdi Kanu tinyere nke ha na-ekwu na ụlọikpe ahụ enweghị ikike ikpe Nnamdi Kanu ikpe.

Ọkaịwụ Kanu bụ Aloy Ejimakor ekweghị ka e bido ikpe n'usoro Nnamdi Kanu ga-eji malite zara ọnụ onwe ya n'ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpata ịkwatu Gọọmentị Naijiria.

Na mkpebi ikpe, ọkaikpe Binta Nyako anabataghị akwụkwọ ọkaịwụ Nnamdị Kanu tinyere ma gwa ha gaa n’ụlọikpe mkpegharị na ọ bụrụ na ọ dịghị ha mma n’obi.

Ihe Kanu kwuru mgbe ọ wụchiri n'ụlọikpe

Nnamdi Kanu na ndị ọkaikpe ya

Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n' ọgbaghara dị n'Ọwụwa Anyanwu Naịjiria, ọkachasị ka e sị egbu ndị mmadụ ma na-eme ọtụtụ ụmụnwanyị ka ha bụrụ ajadụ.

N' okwu ya n’Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja bụ ebe ọ bịara ịzara ọnụ ya n'ikpe metụtara ebubo iyi ndụ ehgwu na ịkpa nkata ịkwatu ụbọchị Wenezde, Kanu sịrị, “Ime ụwụnwanyị ka ha bụrụ ajadụ bụ ihe m na-akwadọghị.

"Eji m obi m niile katọọ ihe dị etu ahụ. Achọghị m ka onye ọbụla nwụọ”.

“Anyị na-alụ ọgụ ka ndị mmadụ nwere onwe ha, kedu ka anyị ga-esi tinye aka n’ụdị ihe dị etu ahụ? Anyị chọrọ ka ndị mmadụ nwere onwe ha. Ya bụ ihe anyị na-azọ”.

“Anyị ataala ahụhụ n’Afrịka. Ndị Afrịka ataala ahụhụ ohu n' aka ndị ọcha. Mbọ anyị na-agba ugua bụ ka Afrịka dị mma ka Chukwu si chọọ ya”.

Ihe a ga-eleba anya n'ikpe a

Nnamdi Kanu na ndị ọkaikpe ya

Taa bụ abalị 19 nke ọnwa Juun afọ 2024,a na-atụ anya na onye ndu otu nwereonwe Biafra, Indigenous People of Biafra(Ipob) bụ Nnamdi Kanu ga-apụta n’Ulọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja.

Ka ikpe ahụ sị aga, A na-atụ anya na ụlọikpe ga-aga n'ihu na ikpe ya ikpe maka ebubo ndị eboro ya nke gụnyere iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị nke ikpe ya malitere kemgbe afọ 2015.

Cheta na n'ikpe ikpe azụ ekpere n’ụbọchị Mee 20, 2024, Ọkpaikpe Binta Nyako ji ikpe ahụ kpụpụrụ n'ụsọ, arịrịọ ọkaiwu Nnamdi Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe ya(bail).

Ọ kụpụkwara arịrọ ka e wepụ ya na nga ndị uweojii Nzuzo bụ DSS n'ịchafụ .

Etu ikpe Nnamdi Kanu sị bido

N' afọ 2015 ka Gọọmentị Etiti nwụchiri Nnamdi Kanu na Legos steeti oge ọ sị mba Briten lọghachịta Naịjirịa ma kpụga ya ụlọikpe.

Gọọmenti boro ya ebubo dị icheiche ọkachasị nke metutara inyi ọha egwu, na ịkpọrị onyeisiala Naịjirịa n’oge ahụ bụ Mahammadu Buhari.

Ụlọikpe Naịjirịa mechere tọhapụ ya sị ka o si n'ụlọ abịa ikpe.

Mana Nnamdi Kanu sị na Naịjirịa gbapụ oge ndị ọrụ nchekwa wakporo ụlọ ya n’Afara-Ukwu, Abia Steeti.

Ebe ọzọ a hụrụ Kanu ka ọ sị Naịjirịa gbapụ bụ na mba Israel.

Kemgbe ọnwa Juun, afọ 2021 Nnamdi Kanu nọ na aka ndị DSS. Ha sị na mba Kenya kpụlata Kanu ma kpụpu ya ụlọikpe ọzọ ka ọ zara ọnụ ya.