Ohaneze Ndigbo na Legọs anaghị akwado Tinubu - Alex Ogbonnia

Peter Obi

Otu Ohaneze Ndigbo akọwaala na akụkọ nke na-efegharị na soshal midia, nke na-ekwu na ha na-akwado Bola Tinubu maka ịbụ onyeisiala Naịjirịa na 2023, bụ nnukwu okwu asị.

Nke a si n'aka Alex Ogbonnia bụ ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze Ndigbo Worldwide.

Ogbonnia kọwara na onye na-agbasa ozi a bụ nwoke aha ya bụ Solomon Aguene, onye chịburu otu Ohaneze malite n'afọ 2018 ruo June 2022.

Ọ gara n'ihu kwuo na Mazi Aguene bụ ọchọnganoko, onye chọrọ iji ụzọ aghụghọ nọgide n'ọchịchị n'agbanyeghị na oge ya ezuola.

Ogbonnia kwuru sị: "Onye bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo na Legos ugbua bụ Ichie Sunday Ossai, naanị ya bụonye nwere ikike ikwu okwu n'aha Ohaneze nke Legọs."

"Onye ọbụla ọzọ na-akọgheri akọgheri, ụnụ atụpụrụla ha ọnụ."

"Akụkọ ahụ kwuru na Ohaneze akwapụla (Peter) Obi n'akụkụ ma na-akwado Tinubu bụ nnukwu asị si n'ime ala mmụọ pụta."