Ejikọzila aha Peter Obi na ndị nwụrụ na mmiri Ezu - MASSOB

Ebe foto si, Getty Images/Peter Obi
Otu na-achọ mwereonwe Biafra Movement for the actualization of the sovereign state of Biafra (Massob) ekwuola ka ndị akụkọ ụgha kwụsị ijikọ aha Peter Obi nakwa ozu ndị ahụrụ na mmiri Ezu.
Ha kwuru nke a n'ime ozi si n'aka Edeson Samuel ha wepụtara n'ụbọchị Tọzde dịka ha mechara nzụkọ.
Ha sị "Obi enyeghi iwu nke o ji enedo anya n'ogbugbu e gburu ndị otu Massob"
Otu ahu jikwa ohere ozi ahụ rịọ ndị mmadụ niile ha gbaa mbọ weta PVC ha iji nyere ha aka wepụ ndị na-emegbu ha n'ọkwa etiti nakwa ọkwa steeti.
Ihe ọzọ otu ahụ kwuru bụ na ọ tụrụ ha n'anya na otu nwoke aha ya bụ Simon Ekpa ji soshal midia agbarụ ihe bụ eziokwu maka ndị egburu na mmiri Ezu.
"Ọ bụ ndị SARS nọbu n'Anambra nke James Nwafor bụ onyeisi ha nwụchiri ndị otu anyị ma gbuo ha na ndị ọzọ echeere bụ ndị ohi ma tunye ozu ha n'ime mmiri Ezu" ka ha kwuru.
"Mmụọ Biafra ka dị ndụ n'ime anyị"
N'agbanyeghị okwu ha kwuru, Massob gara n'ihu kpọọ oku ka atọghapụ ndị Massob, ndị Ipob nakwa ndị niile na-achọ mmwereonwe Biafra e ji n'ụlọ mkpọrọ dị icheiche.
Ha kwuru na ha rubeere 'nwanne ha nwoke' Nnamdi Kanu isi.
"Ojiji eji nwanne anyị nwoke Nnamdi Kanu nakwa mmigharị a na-eme n'ikpe ya agaghị akụtu mmuọ ya maọbụ kwụsị ọchịchọ Biafra" ka ha dere.
Ha kwuru na ha wepụtara ozi a n'oge dị etu a maka na e mee ngwa ngwa emeghara ọdachi.












