Nsogbu nchekwa, Nnamdi Kanu na ihe ndị ọzọ Gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpara na nzukọ ha

Ogbako ndi Govano owuwa anyanwu

Ebe foto si, Enugu state Government

Nzụkọ pụrụiche nke Gọvanọ Ọwụwa anyanwụ nwere ụnyaahụ n'Enugwu ji ọtụtụ ihe mapụta.

Ihe ndị ha kpebiri gụnyere ị ga leta onyeisiala Tinubu iji kpa maka ihe ndị dị mkpa metụtara mpaghara ahụ ọ kachasị ihe metụtara akụnụba obodo nakwa nsogbu nchekwa.

Dika onyeisi ọgbakọ ahụ bụ Hope Uzodimma aka na-achị Imo steeti si kwụ, ọ kelere Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala ochie Naịjirịa nakwa Obi nke Ọnịcha bụ igwe Achebe maka nleta ọ bịara na nzụkọ ahụ.

Lee okwu ha n'uju ebe a:

  • Ọgbakọ ahụ zigara steeti niile dị n'ọwụwa anyanwụ nakwa ezinaụlọ Ogbonnaya Onu ozi itiakanobi maka ọnwụ ya.
  • Ha nabatara aka chiburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo, Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Nnaemeka Achebe nakwa Emeka Anyaoku bụ ndị bịara nleta na ya bụ ọgbakọ.
  • Ha nyochara mpụtara nzukọ ha nwere gbasara ihighari akụnụba mpaghara ọwụwa anyanwụ ma kpebie ịmalite ọtụtụ ihe ndị ha kwekọrịtara maka ya.
  • Ha kpebiri ịga leta Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ikpesara ya nsogbu ndị chere mpaghara ahụ aka mgba
  • Ha kpebiri ileta Onyeisiala Naịjirịa kwa ịmalite mkparịtaụka maka ntọhapụ Nnamdi Kanu