Unu na-akụtu ụlọahịa iji kpochapụ akụnaụba ndị Igbo – ASITU na-agwa Gọọmenti Legọs

Otu jikọtara obodo ndị Igbo niile bụ Association of Igbo Town Unions (ASITU) eboola Gọọmenti Legọs steeti ebubo ikpochapụ akụnaụba ndị Igbo.
ASITU kwupụtara nke a n'ọgbakọ ha haziri n'isi obodo Abịa steeti bụ Ụmụahịa n'ụbọchị Fraịde 24 Ọktoba 2025.
Ndị otu ahụ boro ebubo na Gọọmenti Legọs steeti na-eme mkpochapụ agbụrụ site n'ụzọ akụnaụba.
Onyendu ASITU bụ Emeka Diwe kwuru na ụlọahịa Gọọmenti Legọs steeti na-akwatu abụghị maka nhazi obodo, kama ọ bụ mmegide na mmetọ ịdịnotu.
Diwe kwuru na ọ bụ ụdịrị omume a Gọọmentị Legọs steeti na-emeso ụmụ Igbo mere ha ji akpọ oku maka nnwereonwe, ma kwuo na ọ bụ omume ịkpa oke dị etu a mere ndị Igbo ji ahụta onwe ha dịka ndị Biafra.

"Nke bụ eziokwu bụ na onye Igbo ọbụla kpọrọ onwe ya onye Biafra taa abụghị maka na ọ rọtara ya na nrọ, kama ọ bụ n'ihi na ọ lakpuru ụra dịka onye a jụrụ ajụ".
"Etu ịkpa oke siri metụta onye Igbo, mere ka ọ bụrụ onye Biafra. N'ihi ya, anyị bụ ndị Biafra dabere n'ọnọdụ dị etu a. Gaa kpọọrọ anyị ndị uweojii," ka Maazị Diwe kwuru.
ASITU kwuru na kemgbe ọnwa Febụwarị, nkwatu ụlọahịa n'Ebute Ero Market na Trade Fair Complex dị na mpaghara Ojo akawanyela njọ, dịka ọ na-ebibi akụnaụba nke ọtụtụ ụmụafọ Igbo na-ere ahịa.
Dịka otu ahụ nabatara ikike Gọọmentị Legọs steeti nwere itinye iwu nhazi obodo n'ọrụ, ha boro ebubo na atụmatụ ahụ bụ nke lekwasara otu agbụrụ anya.
ASITU boro ebubo na ọtụtụ n'ime ụlọahịa ndị Gọọmenti Legọs steeti kwaturu nwere nkwado zuru okè sitere n'aka otu gọọmenti ahụ.
Ha kwukwara na ọ bụ asị na a rụrụ ụlọahịa ndị ahụ a kwaturu n'ọwammiri, dịka Gọọmenti Legọs steeti siri kwuo.

Diwe kọwara ndị Igbo dịka eriri jikọtara Naịjirịa ọnụ, ma kwuo na o nwebeghị agbụrụ ọzọ tụnyere okè n'olileanya Naịjirịa karịa ndị Igbo.
ASITU kwuru na dịka Gọọmenti Etiti Naịjirịa mere ka a ga-asị na ha anaghị anụ gbasara mmegbu a na-emegbu ndị Igbo na Legọs steeti, na ha edeela akwụkwọ mkpesa wee degara otu United Nations Human Rights Council, otu African Commission on Human and Peoples Rights nakwa ụlọikpe ECOWAS.
Ka o sina dị, ndị otu ahụ hiwere ngalaba ga-edekọta mkpesa ndị a kụturu ụlọ ha maka iwepụ okwu ya n'ụlọikpe.
Ha kpọkukwara ndị ọmeiwu si ala Igbo ka ha kwụsị ịbụ ndị na-ele sọọsọ n'anya, ma malite ịgbata ọsọ enyemaka.
Ha gara n'ihu gwa aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ka ọ kwụsị ịkwatu ụlọahịa ozugbo, ma rọpụtara ndị a kwaturu ụlọahịa ha iti aka n'obi kwesịrị ekwesị.
N'ikpeazụ, ha gwara ndị Igbo niile na-azụ ahịa ka ha malite atụmatụ "Akụ Ruo Ụlọ" site n'ibulata azụmahịa ha n'ala Igbo.
Gọọmenti Legọs Steeti enyela ndị nwere ụlọahịa na Trade Fair izuụka abụọ inweta akwụkwọ ikike

Gọọmentị Legọs steeti enyela ndị na-ere ahịa na Trade Fair Complex, Ojo izuụka abụọ ka ha nweta akwụkwọ ikike maka ebe ha nọ ere ahịa.
Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mmepe obodo bụ Oluyinka Olumide, kwupụtara nke a n'ụbọchị Tọzde 9 Ọktoba 2025.
Ọ si na ọ na-atụ anya na ndị na-ere ahịa ebe ahụ ga-abịakwute Mịnịstrị na-ahụ maka mmepe obodo ka ha "hazie nnabata nke ụlọahịa ha".
Olumide kwuru na gọọmentị Legọs steeti nwere ikike site n'iwu 'Nigerian Urban and Regional Planning Act' nke afọ 1992 nakwa 'Urban and Regional Planning and Development Law (2019), ịhazi mmepe obodo nke gụnyere ala nke gọọmenti etiti nwe nke ejighị eme ihe ọbụla gbasara gọọmenti etiti.
Ọ dọrọ aka na ntị na ya bụrụ na ndị na-ere ahịa abịaghị inweta akwụkwọ ikike ha, gọọmenti ga-ebidoghachi ịkwatu ụlọ ndị nọ ebe ahụ na-enweghị ikike
Kedụ ihe ndị na-ere ahịa na Trade Fair Complex kwuru gbasara nkea?

Otu n'ime ndị isi otu na-ere ahịa na Trade Fair Complex na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ dighị ha n'aka ime ihe ọbụla ugbua maka na ndị na-elekọta Trade fair ha zụrụ ụlọ n'aka nwetara ikike n'aka Gọọmentị Etiti.
Ọ si na a na-enwe mkparịtaụka n'etiti ndị resịrị ha ala natara ikike n'aka Gọọmenti Etiti na gọọmenti Legọs steeti.
Ọ gara n'ihu kwuo na ya bụrụ na Gọọmenti Etiti na gọọmenti Legọs steeti nwechaa mkparịtaụka ma nwee nkwekọrịta etu ihe ga-esi dị mma, na ha onwe ha bụ ndị nwe ụlọ ebe ahụ ga-amara ihe ọzọ ha ga-eme.

Ebe foto si, Sanwolu/X/BBC
Gọọmenti Legọs steeti akọwaala ihe mere ha jiri kutuo ụfọdụ ụlọahịa na Trade Fair dị n'Ojo ma kwuo na ọ bụghị n'ihi iji megide otu agbụrụ.
Kọmishọna na-ahụ maka ntọala na mmepe obodo bụ Olumide Oluyinka, mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channels TV n'ụbọchị Tọzde 2 Ọktoba katọrọ ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ọ bụ maka iji megide ndị Igbo na-azụ ahịa ebe ahụ.
"Nke ahụ abụghị eziokwu, anyị akụtuola ọtụtụ ụlọahịa n'ebe ndị ọzọ. Ọ nweghi mgbe o ji bụrụ maka imegide otu agbụrụ. Nke bụ eziokwu bụ na anyị ga-arụ ọrụ dịịrị anyị, onweghi ihe dịka agbụrụ ebe a."
Olumide gara n'ihu kwuo na ndị ndu na-elekọta ahịa ahụ hapụrụ ebe e nyere ha ikike ịrụ ụlọahịa ma na-eresi ndị mmadụ ala ha were na-arụ ụlọahịa aghara aghara na-anataghị ikike n'aka gọọmentị.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ etu gọọmenti Legọs steeti si kutuo ụfọdụ ụlọahịa ndị ahụ ma kwuo na ọ bụ maka ndị Igbo na-azụ ahịa ebe ahụ.
Peter Obi, Abaribe, Umeh na ndị ndu Igbo gara mgbaru n'ahịa Trade Fair

Ebe foto si, Peter Obi/X
N'ime ụbọchị ole ma ole a kutuchara ụlọahịa ndị ahụ, ụfọdụ ndị ndu na mpaghara Owuwa Anyanwu mere njem nleta ịchọpụta kpọmkwem ihe mere e jiri kutuọ ụlọahịa ndị ahụ.
Ụfọdụ ndị a gụnyere Peter Obi, ndị Sịnetọ dịka Enyinnaya Abaribe, Victor Umeh, Austin Akobundu, Tony Nwoye.
N'ozi Obi wepụtara ka ha mechara njem ahụ, o kwuru na gọọmenti Legọs steeti kuturu ụlọahịa ndị a na-agbanyeghi na ndị nwe ha natara asambodo ikike ịrụ ya.
O kwuru na ha ga-eme nnyocha ịchọpụta kpọmkwem ihe mere e jiri kutuo ụlọahịa ndị a ma gbochie ya ime ọzọ.
Ọ gara n'ihu rịọ gọọmentị arịrịọ ka ha nwee obi obere n'etu ha si akpaso ndị mmadụ agwa ọkachasị ugbua ihe siri ike.
O kwuru na ọtụtụ n'ime ndị a kuturu ụlọahịa ha tinyere ọkpụrụkpụ ego iji rụọ, ikekwe na ọ bụ ego niile ha nwere na ndụ ha.
Obi gbakwụnyere na ọ bụ ụdịrị omume a na-eme ndị mmadụ aghara iwepụta obi ha n'ihe banyere mmepe obodo.
"Gọọmentị Etiti nyere anyị ala na ikike ịrụ ụlọahịa ndị ahụ"

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị nwee ụlọahịa nke Legọs Steeti gọọmenti kụkpọrọ n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Septemba 2025 n'ogige ebe a ma ama ọtụtụ ndị Igbo na-atụ mgbere ahịa bụ Trade Fair Complex ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ha na-arụ ụlọahịa na ejighị akwụkwọ nkwado nke gọọmenti.
Dịka onyeisi nke otu jikọrọ ndị ahịa bụ Association of Progressive Traders (APT) na Trade Fair Complex siri kọwaara BBC News Igbo mgbe anyị gbara ya ajụjụ ọnụ, ihe mere n'ahịa ahụ n'ụbọchị Tọzde gbara ọtụtụ mmadụ gharị.
Eric Ifeanyichukwu Ilechukwu kwuru na ogige ahịa ahụ bụ ala nke Gọọmenti Etiti ma bụrụkwa ihe mere eji akpọ ogige ahịa ahụ 'International Trade Fair Complex'.
Dịka o siri kwuo, ndị nwere ụlọ n'ogige ahịa ahụ esighị n'azụ ụzọ bata n'ihi na ọ bụ Gọọmenti Etiti mgbazinyere ha ala ahụ ma nyekwa ha akwụkwọ nkwado atụmatụ ịrụ ụlọahịa ebe ahụ.
Ọ kọwara na kemgbe afọ 1977 a rụrụ ahịa ahụ, na o nwebeghị onye kwuru na ọ bụ gọọmenti Legọs steeti nwee ogige Trade fair Complex nke mere o ji gbaa ọtụtụ gharị mgbe ndị ọrụ steeti ahụ kwuru na ọ bụ Legọs Gọọmenti nwee ala dị n'ogige ahụ.

"O nweghị ihe dịka inye anyị akwụkwọ maọbụ zie anyị ozi na ndị ọrụ steeti na-abịa ịkụkpọ ụlọahịa ndị a. Ọ bụ mgbe o jiri ọkara gafee elekere isii nke ụtụtụ n'ụbọchị Tọzde ka mmadụ kpọrọ m n'ekwentị ma gwatụ m ihe banyere ya.
"Nke a tinyere m n'ọgbaaghara ma mee ka m malite kpọwa ọtụtụ ndị ọrụ ọchịchị n'ekwentị mana ọ bụ Kọmishọna ndị uweojii nke Legọs steeti gwara ha na ọ bụ ndị ọrụ nke Legọs steeti bịara kụkpọọ ụlọahịa," ka o kwuru.
Ilechukwu kọwaara na ọ bụ n'elekere asatọ nke ọtụtụ ka e jiri malite ịkụkpọ ụlọahịa ndị mmadụ nke a na-akpọ 'plaza'.
O boro ebubo na ndị ọrụ steeti ahụ ghọrọ ụlọahịa ndị ha kụkpọrọ n'ihi na ọ bụghị ụlọahịa niile dị na mpaghara ahụ ka kụkpọrọ.
O kwukwara na ndị ọrụ steeti gwara ha na ọ bụ gọọmenti Legọs steeti kwesịrị inye ha akwụkwọ nkwado ịrụ ụlọ nke bekee kpọrọ 'approve plan' na ọ bụghị gọọmenti etiti.
Mana ọ kọwara na ọ bụ ozi aka na-achị Legọs steeti bụ Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu mere ndị ọrụ ahụ jiri kwusị ịga n'ihu na-ịkụkpọ ụlọahịa ndị mmadụ.
"Anyị ga-ebe akwa begara ndị mba ụwa ka ha bịa hụrụ ihe anyị na-agabiga n'ihi ọtụtụ ji ego mgbazite bekee kpọrọ 'loan' arụ ụlọahịa ndị a gọọmenti na-akụkpọ," Ilechukwu kwuru.
Ka ọ dị ugbua, Ilechukwu kwuru na ndị ọchịchị nke ahịa Trade Fair Complex enweela nzukọ n'ụbọchị Fraịde iji kparịtaụka etu ha ga-esi zute ndị nnọchiteanya Legọs Steeti Gọọmenti n'ụbọchị Tuzde 30 Septemba 2025.

Onye ọzọ ihe a metụtara ụlọọrụ ya bụ ọkaiwu Uche Udogaranya kọwara ndị ọrụ steeti ahụ kụkpọrọ ụlọahịa ndị mmadụ kwuru na ha nyere ndị nwee ụlọahịa akwụkwọ afọ abụọ gara aga nke ndị ahụ kwuru na ha anataghị ya bụ akwụkwọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghị ikike gọọmenti steeti nwere n'ogige ahịa ahụ n'ihi na ọ bụ ogige Gọọmenti Etiti nwee.
O kwuru na ndị nwee ụlọahịa natara akwụkwọ nkwado nke si na mịnịstrị nke Gọọmenti Etiti na-ahụ maka ala. O kwuru na ndị nnọchiteanya mịnịstrị ahụ bịakwara mee nnoycha tupu ha akwado ịrụ ụlọahịa ndị ahụ.
Udogaranya kpọrọ oku ka gọọmentị etiti gbatara ndị ahịa Trade Fair Complex ọsọ enyemaka iji gbochie ọgbaaghara ịdaa.
Onye ọzọ bụ injinịa na-ahụ maka ụlọahịa IK Magnum Merchandise bụ otu n'ime ụlọahịa ndị gọọmenti kụpọrọ akụkpọ, kwukwara na ndị ọrụ steeti ahụ enyeghị ha akwụkwọ ịdọ aka na ntị tupu ha amalite ịkụkpọ ụlọ ndị a.
Dịka Zomagbo Marcelin si kwuo, ndị ihe metụtara amabeghị ọnọdụ ụlọahịa ha ugbua dịka ha ka na-enwe nzukọ ji mara etu ha na gọọmenti ga-esi hazie ọnọdụ ahụ.
Ihe mere Gọọmenti Legọs Steeti ji kụkpọọ ụfọdụ ụlọ dị n'ogige Trade Fair Complex dị n'Ojo

Ebe foto si, Jubril A. Gawat/X
Gọọmenti Legọs Steeti amalitela ịkụkpọ ụlọ ụfọdụ ha kwuru na o megidere iwu nakwa ndị na-ezighị ezi dị n'ogige Trade Fair Complex na mpaghara Ojo nke steeti ahụ.
Ozi onye ndụmọọdụ Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu bụ Jubril Gawat wepụtara n'akara X ya kwuru na ọrụ nkụkpọ ahụ bụ mịnịstrị na-ahụ maka nhazi obodo, mịnịstrị na-ahụ maka ịrụ ụlọ na mịnịstrị na-ahụ maka mgbanwe obodo rụrụ ya.
O kwuru na ụfọdụ ụlọ ha kụkpọrọ gụnyere ụlọ na-enweghị nkwado maọbụ akwụkwọ ikike gọọmenti, ụlọ a rụrụ n'elu akwara mmiri nakwa ndị a rụrụ metụtara okporoụzọ.
Gawat gara n'ihu kwuo na ihe mere gọọmenti ji kụkpọọ ụfọdụ ụlọ ndị ahụ bụ iji hụ na ndị na-arụ ụlọ rubere isi nye iwu gọọmenti mapụtara maka nhazi obodo.
Ụfọdụ ndị nọ oge a kụkpọrọ ụlọ ndị ahụ gụnyere ndị omeiwu steeti ahụ nakwa ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ.
N'aka nke ọzọ, ọtụụ mmadụ akatọọla nkụkpọ ụlọ ahụ ma kwuo na gọọmenti Legọs emeteghị ya.
Otu onye n'ime ndị ahụ katọrọ atụmatụ ahụ bụ Joe Igbokwe onye kwuru na ya aghọtaghị ihe mere gọọmenti ji kụkpọ ụlọ ndị ahụ.











