Ede mmụọ ọ bụ nri ndị mmadụ ka ọ bụ nke ndị mmụọ?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
I lee akwụkwọ osisi a, ọ na-acha ka akwụkwọ ndụ nwera akara ọcha na uhie n'elụ ya.
E nwere ndị na-eji akwụkwọ ya egbochi anwụ ma ọ bụ mmiri.
Ị bịa nso nso lee ya anya, osisi a mara ezigbo mma mana ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-amaghị bụ na ihe dị n'ime okooko a mara mma bụ nsi ma mmadụ rie ya.
Nsi nwere ike ị gbu mmadụ.
Ihe a na-akpọ osisi a bụ ede mmụọ (cocoyam for spirits) maọbụ aha sayensi ya wee bụrụ Caladium
O nwere ndị kwenyere na ede mmụọ nwere nsi nakwa ọ bụ nke ndị mmụọ.
Mana nke a ọ bụ eziokwu?
A na eri ede mmụọ eri?

Ebe foto si, Getty Images
Otụtụ ndị mmadụ n'ala Igbo kwenyere na a naghị eri ya eri maka nne na nna ha ochie erighị ya.
Dọkịnta Chigozie Nnabuihe, ọkammụta Igbo na Mahadum Legọọs steeti si na dika ede ndi ọzọ, anaghị eri ede mmụọ eri. Onye na-akụ ọrụ ugbo hụ osisi a na ọrụ ugbo ya, onye ahụ ga-atụfụ ya.
Nnabuihe kọwara na "ndị nne na nna mgbe ọchie ekweghị erị ya nke mere anyị ji sooro nzọmụkwụ ha".
Ede mmụọ o nwere ikike ime mmụọ?

E nwere ọtụtụ ndị Igbo kwenyere na ede mmụọ nwere ọtụtụ ikikie mmụọ nke nwere ike ịgwọ ọrịa mmụọ dị iche iche. Ụfọdụ kwenyere na ọ na-enye amara, ọ na-achụpụ ajọ mmụọ, ọ na eme ka mmadụ dị ọcha.
O nwere ndị kwenyere na eji ya achụ àjà mana sayensi egosịghị na nkwenye ndị a bụ eziokwu.
"E kwenyeghị m na ede mmụọ nwere ikike mmụọ mana omennala ndị ọbụla dị iche iche" dịka Dọkinta Nnabuihe si kwuo.

Ebe foto si, Getty Images

Ede mmụọ o nwere nsi?

E nwere ndị kwenyere na ede mụọ nwere nsi mana o nwebeghị onye ma ma ọ bụ eziokwu.
Nnabuihe si "anyị na-eche ma o nwere nsi mana onwebeghị onye anyị hụrụ riri ya"
Ọ kọwara na o nweghị ihe bara ụrụ e ji ya eme.
Site na mkparịtaụka anyị na Nnabuihe nwere, o mere ka odo anya na ede mmụọ enweghị ikike mmụọ ọbụla, anaghị eri ya eri. Dịka ndị mmadụ si ekwu na ede mmụọ nwere nsi, Nnabuihe si na onwebeghị onye ọ ma riri ede mmụọ i ji mara ma mmadụ o nwere ike ịnwụ ma erie ya.








