Lee ihe egusi na-enye n'ahụ na ụzọ kachasị mma e kwesịrị iji eri ya maka ahụike

Ebe foto si, Ntanta Soups
- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Egusi nke e ji 'melon seed' maara na Bekee bụ ezigbo nri a ma ama ndị Naịjirịa na ndị mpaghara West Afrịka anaghị eji egwu egwu.
A bịa na Naịjirịa, ofe egusi bụ ofe ọtụtụ mmadụ na-esi. Ọ bụ ofe a na-eji ụtara dị iche iche eri. Ndị Igbo na-eji ya eme ọnụ.
Site n'ugwu ruo na ndịda, ị gaa n'ebe ọbula a na-ere nri, ịhe ị ga na-anụ bụ 'Madam' tinyere m ofe egusi mana ọtụtụ ndị na-eri ya amaghị ihe ọ na-enye n'ahụ.

Mgbe BBC Igbo gara n'ime ahia ịjụ ajụjụ banyere egusi, ụfọdụ ndị na-ere egusi amaghị ihe ọ na-enye n'ahụ. Ihe ha ma bụ na egusi bụ ihe nri na-amasi ndị mmadụ iri.
Ọ bụghị naanị ofe ka e ji egusi esi, ụfọdụ ndị mmadụ na-eji ya eme ihe ndị ọzọ dịka akpụrụakpụ egusi (cookies), 'stiu, ihe ndori (source) nakwa 'flour'.
Mana ihe ọbula nwere uru, nwere ọghọm dị na ya.
Ihe ndị ntoorọbia amaghị gbasara egusi bụ na abụba nọ ya n'ime tinyekwara mmanụ nri e ji esi ya nwere ike ime mmadụ ebuo ịbu.
Ya mere ụmụnwaanyị ndị na-achọ ịta ahụ ma nwee ụdịdị 'figure 8' na ụmụnwoke na-achọ ịta ahụ ma nwee akpụobi '6 packs' kwesịrị ibeleta aka n'itinye mmanụ ma ha na-esi ofe egusi, ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri mmadụ na-eri kwuru .
A na-esikwa ya ebe a na-eme mmemme dị ịche ịche dịka alụm dị na nwunye, ikupụta nwa maọbụ ebe a na-eli ozu.

Egusi ọ bụ nri na-edozi ahụ?

Ebe foto si, Okorofelix Lilian
Otu onye ọkachamara n'okwu gbasara nri na ihe ọ na-enye n'ahụ nke bekee na-akpọ 'dietician' bụ Okoro Felix Lilian kwuru na egusi bụ ezigbo nri dị mma nke ukwuu, onye ọbụla nwereike iri na-agbanyeghi afọ ọle onye ahụ dị.
O kwuru na otu iko egusi (one Peak milk cup) nwere abụba karịrị iri anọ nke na-enyere obi mmadụ aka ịrụ ọrụ etu o kwesịrị ma sị na abụba dị n'egusi bu ezigbo abụba dị mma n'ahụ.
N'okwu ya; "egusi bụ nri dị mma nke ukwuu mana ọ dị mkpa ka onye na-eri ya gbalia belata aka n'itinye mmanụ maka na ọ na-eme mmadụ ibu ibu."

Ebe foto si, Ntanta Foods
O ji nwanyọ kọwaa ihe ndị dịgasi n'egwusi na-enyere ahụike aka nke gunyere;
- Abụba (52 pasenti) Abụba na-enyere ụbụrụ isi mmadụ aka ịcheta ihe, ọ na-enye ike nakwa na-eme ka mmadụ nwe ndịdị n'ọrụ ike. Ihe ọzọ ọ na-eme bụ ka ọ bara mmadụ na-agbazi ọfụma ha na ịbelata shuga nọ na ọ bara mmadụ.
- Protin (2.5 pasenti) ọ na-eme ka ahụ mmadụ dị mma, ọ na-eme ka afọ ju mmadụ ọsisọ nakwa inyere aka ka onye buru ibu gbadata.
- Faịba (2.7 pasenti) Faịba na-enyere aka ka nri mmadụ riri nwere ike igbaze n'oge. ọ na-edozi shuga ọbara na ịkwalite ibu dị mma na-ahụ mmadụ.
- Kalshum: Kalshum na-enye aka ime ka ọkpụkpụ na eze mmadị sie ike. ọ na enye aka na mmegharị ahụ ike, ọrụ akwara, na mkpụkọ ọbara.
- Zinc: Zinc na-enyere ndị mmadụ aka ịkwalite mmuo ịme mmekọahụ nke ọnụ ahụ karịsịa na ndị okenye. Ihe ọzọ ọ na-eme bụ ịnye ohere ịghọta uto nri ha na inụ isi nri.
- Magnesium: Magnesium dị mkpa maka ahụ ike, akwara, ọkpụkpụ na njikwa shuga dị n'ọbara. Ọ bụrụ na mmadụ enwetaghị magnesium zuru oke na nri ogologo oge, onye ahụ nwere ike ịnọ n'ihe ize ndụ dị elu nke nsogbu ahụike dịka nkụchi obi, ọrịa strok ha na ọrịa shuga.
Kedụ ndị na-ekwesighị iri egusi?

Ebe foto si, Luti Reign Bagula
Onye ọzọ ha na BBC Igbo nwere mkparịtụka bụ Luti Reign Bagula, onye nkuzi na Mahadum Modibbo dị n'Adamawa steeti.
"Egusi enweghi nsogbu ọbụla, ebe nsogbu dị bụ etu e si sie ya nakwa ugboro ole mmadụ na-eri ya", ka Luti Reign Bagula kwuru.
O kwuru na onye ọbụla nwereike iri egusi mana ha ga-akpachapụ anya itinye mmanụ nri. Oke mmanụ nọ ya n'ime ga-eme ka afọ mmadụ na-eko n'elu nakwa na-eme ka mmadụ bụọ ịbu. Nke a pụtara na onye chọrọ i si ya, etinyekwala ya mmanụ ọzọ maọbụ tinye mmanụ ntakịrị.
N'okwu ya, "itinye mmanụ n'egusi dịka ikwanye mmiri n'ime osimmiri" ọ bughị oge niile ka e kwesịrị iri ya.
Bagula dọrọ aka na ntị ka ndị na-esi egusi sepụ aka n'ịji anụ nwere abụba kama azụ maọbụ anụ ọkụkọ.

Kedụ ụzọ kacha mma e ji esi egusi?
Luti Reign Bagula na Okoro Felix Lilian kọwara ụzọ di ịche ịche e ji esi egusi ma kwụọ nke kacha mma iji nweta ahụike ọma.
Ha kwuru, enwere ndị na ehe egusi ha ehe, nwere ndị na-ahụ ya n'ọkụ, nweekwa ndị na-etinye n'ime mmiri ọkụ, dịka ebe onye si bịa na omenala ha.
Ha sị na ụzọ pụrụiche iji esi ofe egusi bu ighe ya ehe ntakịrị n'ọkụ ma tinye mmanụ nri ntakịrị.
Lilian dọrọ aka ntị ka ndị mmadụ kwụsị iji maggi esi nri, kama ha were ngwa nri ndị dịka ayịya (crayfish, lokọst beans nakwa ndị ọzọ yiri ya)
Kee ihe ndị ọzọ a na-eji egusi eme?

Okoro Felix Lilian si na ewezuga ofe, a na-eji egusi eme stiu maọbu ihe ndori e ji eri osikapa. A nakwa eji ya esi ji na abịrịka.
Ọ gara n'ihu kwuo na a na-eji egusi eme ihe ọtita dị iche iche maọbu tinye na nri ụmụaka.
Ndị na-eri akwụwkwọ nrị nke ndị bekee na-akpọ 'vegetarians' nwereike iji ya mere anụ.

O nwere ihe mkpo egusi na-enye n'ahụ?
Okorofelix Lilian sị na mkpo egusi dị oke mkpa dịka egusi n'onwe ya. ọ kọwara na ndị mmadụ anaghị enweta ụrụ faịba ma ọ bụrụ na ha na-etufu mkpo egusi.
Ọ si na ndị na-arịa ọrịa shuga kwesịrị ị na-eji ya esi nrị maka na ọ na akụtu ihe ọbula gbasara shuga n'ọbara mmadụ.
Ego ka egusi na-ada n'ahịa?

Mgbe BBC gara n'ime ahịa ime nchọpụta egọ ole, ọtu nwaanyi na-achọghị ka a kpọọ aha ya si na etu e si ere egusi di iche n'iche.
Ọ kowara na e nwere ndị na-ere na komkom (peak milk), komkom Derica nke ukwu na nke obere.
Iko peak milk itoolu maọbu iri bu ihe mejupụtara komkom Derica tomato nke ukwuu.
A na-ere komkom derica nke ukwuu puku abụọ na narị anọ.
Komkom derica ukwuu ekere nga abụọ bụ otu puku na narị abụọ.
Komkom peak milk bụ nari isii.








