Onyeisiala Bola Tinubu ekweela ndị Super Falcons ọtụtụ nkwa gunyere ego, ụlọ

Ebe foto si, BBC/Tinubu/X
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekweela ụmụnwaanyị Super Falcons Naịjirịa nkwa dị icheiche gunyere ego na ụlọ.
Bola Tinubu kwere ha nkwa ahụ n'oge ọ nabatara ha n'Abuja bụ isi obodo Naịjirịa n'ụbọchị Monde, Julaị 29, 2025.
Ụmụnwaanyị Super Falcons dị mmadụ iri abụọ na anọ nakwa ndị ọzọ so ha gaa Moroko ruru mmadụ iri na otu ritere erere na nkwa ego na ụlọ ahụ.
Ebe o kwere ndị Super Falcons mmadụ iri abụọ na anọ nkwa otu narị puku dọla ($100,000) nakwa ụlọ 'flat' nwere ime ụlọ atọ dị na Renewed Hope Estate.
Mana ndị nke ọzọ bụ mmadụ iri na otu ahụ so ha gaa Moroko ga-enweta naanị puku dọla iri ise ($50,000).
Ụmụnwaanyị Super Falcons Naịjirịa agaala Abuja izute Onyeisiala Tinubu, igosi ya iko WAFCON 2024 ha butere na Moroko

Ebe foto si, President Bola Tinubu/X
Ụgbọelu bu ụmụnwaanyị Super Falcons Naịjirịa eruola Abuja ebe ha ga-ezute Onyeisiala Bola Tinubu ma gosi ya iko mmeri WAFCON 2024 ha butere na mba Moroko.
WAFCON 2024 bụ mkpọbiri okwu "Women African Cup of Nations" nke afọ 2024/2025 a gbara na mba Moroko.
Cheta na Naịjirịa meriri mba Moroka n'asọmpị ikpeazụ ma turu ugo. Ha gbara Moroko ọkpụ atọ a satara naanị abụọ.
Ụgbọelụ bu ndị Super Falcon si Moroko lọta Naịjirịa fedetara n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n"abuja n'ihe dịka elekere nke abụọ na nkeji iri na isii (2:26pm) n'ehihe taa.
Ndị nabatara ụmụnwaanyị Super Falcons n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe n'Abuja gunyere mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Mohammed idris, Mịnịsta maka ọdịnaala na ndị mbịarambịara nletaanya bụ Hanatu Musawa nakwa nke na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Imaan Sulaiman-Ibrahim wdgz.
Ndị Super Falcons ga-ejiri iko WAFCON 2024 ha gagharịa n'Abuja gosi ya ohanaeze tupuu ha agaa zute Onyeisiala bụ Bola Tinubu n'obi gọọmenti.
Onyeisiala Bola Tinubu kwere nkwa ịnabata ndị Super Falcons butere iko mmeri WAFCON 2024

Ebe foto si, David Durowaiyeding
Onyeisiala Mba Naịjiria bụ Ahmed Bola Tinubu agwala ndị otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falcons na a ga-emere ha mmemme iji nabata mmeri ha meriri mba ụmụnwaanyị mba Moroko n'egwuregwu agba ikpeazụ na Women African Cup of Nations (WAFCON 2024).
Cheta na ọ bụ na mba Moroko bụ ebe e nyibere egwuregwu WAFCON 2024 mana ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falcon gara ebe ahụ merie ma buru iko n'abalị garaaga bụ ụbọchị Satọde Julaị 26, 2025.
N'asọmpị ikpeazụ n'etiti ndị Super Falcons na ogbo ha nke mba Moroko, ndị Super Falcons si n'ịzọ onwe ha n'oge ndị Moroko gbachara ha ọkpụ goolu abụọ nwere sachaa ya ma tụkwasị otu n'elu ya bụ nke nyere ha mmeri.
Na nkenke, Naịjirịa gbara Moroko ọkpụ abụọ a satara naanị abụọ nke tọrọ Onyeisiala Bola Tinubu ụtọ nakwa ọtụtụ ndị Naịjirịa ọnụ na-eru n'okwu.
Bola Tinubu kpọrọ ndị Super Falcons n'ekwe ntị, kelee ha na ndị kpọ ha ga asọmpị WAFCON 2024.

Ebe foto si, NGSuperFalcons/x
Tinubu kelekwara n'ụzọ pụrụiche, onye ndu otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Rasheedat Ajibade onye nke e mere nwaanyị onye egwu bọọlụ kacha baa uru n'asompi ahụ.
Onye ọzọ Tinubu kenelere bụ Esther Okoronkwo maka goolu o nyere nke mere Naịjiria ji kute ume, gaa n'ihu sachaa goolụ abụọ Mooroko nyere ha ma merie.
Ọ bụkwa Esther Okoronkwo nyere Jennifer Echegini bọọlụ o ji nye goolu.
Onyeisi ụmụanwaanyị na-agbara Super Falcons bọọlụ bụ Ajibade kenelere onyeisiala Tinubu maka nkwado o nyere ha nakwa etu e si kwụọ ha ugwọ niile ekwesịrị ịkwụ ha.
Ọ gwara Tinubu na ha ga ebutere ya iko WAFCON 2024 ma ha bata n'Abuja.
Etu Super Falcons nke Naịjirịa si turu ugo ma mabute iko WAFCON nke ugboro iri

Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falcons eturula ugo dịka ọkaibe n'asọmpi iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị bụ Women African Cup of Nations (Wafcon 2025.
Ha mere nke a mgbe ha si n'azụ ma jiri ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie otu egwuregwu bọọlụ Moroko bụ ndị a gbara asọmpi na mba ha.

Ebe foto si, Other
Nke a mere ya ugboro iri ndị Super Falcons nke Naịjirịa na-amabute iko a.
Mba Moroko bu ụzọ nye goolu nke mbụ na nkeji 13' site n'aka ọgba bọọlụ ga bụ Ghizlane Chebbak.
A ka na-egwu nke a ha nyekwa goolu nke abụọ na nkeji 24' nke Mssoudy S. nyere.
Ndị Super Falcons nwara ike ha ịsa goolu ndị mana mgbọ ha amịtaghị mkpụrụ ruo mgbe ọkara nke mbụ gwụrụ na nkeji 45'.

Ebe foto si, CAF/X
Dịka a banyere n'ọkara nke abụọ, Esther Okoronkwo nke Super Eagles nyere goolu mbụ ndị Naịjirịa n'ime nkeji 64'.
Olileanya lọghachịrị n'etiti ụmụafọ Naịjirịa kpọmkwem na nkeji 71' mgbe Ijamilusi F. nyere goolu nke abụọ iji saa goolu abụọ ndị Moroko nyere.
Mgbe ahụ ka egwuregwu a biri ezigbo ọkụ dịka ndị otu abụọ na-achọ onye ga-enye goolu ọzọ ka ọ ghara ịbanye mgbakwụnye oge na nkeji 90'
E nyere mba Moroko penariti mana e mechara kagbuo maka igwe nnyoch Video Assistant Referee (VAR) chọpụtara na bọọlụ akụghị onye Naịjirịa n'aka.
E ruru na nkeji 88', ọgba bọọlụ ndị Super Eagles bụ Jennifer Echegini nyere goolu nke atọ iji nye Naịjirịa mmeri n'asọmpi ahụ.








