Ihe niile i kwesịrị ịma banyere asọmpị Iko Afrịka ụmụnwaanyị Wafcon 2024

Foto na-egosi Rasheedat Ajibade, Iko asọmpị ụmụnwaanyị Afrịka nakwa Nouhaila Benzina

Ebe foto si, Getty Images/Backpage Pix

Nkọwa foto, Rasheedat Ajibade nke Naịjirịa na Nouhaila Benzina nke mba Moroko na-atụ anya na otu onye n'ime ha abụọ ga-emeri turuugo n'asọmpị ha ga-agba na Jụlaị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Dịka asọmpi iko mba Afrịka ụmụnwaanyị nke afọ 2024 (Wafcon) na-abịa nso, nke mba Moroko na-ahazi ugboro abụọ n'otu usoro.

Dịka a dọlachara ya azụ otu afọ n'ihi nsogbu ụbọchị a ga-ehiwe ya, asọmpi a ga-amalite n'ụbọchị Satọde, 5 Julaị.

Ndị ọbịa bụ mba Zambia ga-ezute ndị mba Moroko na-ahazi ya bụ WAFCON 2024 n'ama egwuregwu Olimpik dị na Rabat.

Ndị na-ege ntị na mgbasaozi mbaụwa ga-enwe ike ịnụ nkọwa redio banyere egwuregwu ahụ, asọmpi ga-adị n'etiti Mali na Tanzania, ma asọmpi ọkara nke ikpeazụ nakwa nke ikpeazụ.

Etu mba Moroko bụ ndị ruru ogo ịgba asọmpi ikpeazụ na WAFCON gara aga na-atụanya iburu nke afọ a ebe mba Naịjirịa bụ ndị mabuurula iko ahụ ugboro itoolu bụkwa ndị a na-eleanya nwereike ime nke ọma.

Naịjirịa ga-ejiri Tunisia bido ebe Saụt Afrịka ga-agba Gana n'ụbọchị Mọnde, 7 Julaị.

Mana kedụ mgbe egwuregwu ndị ọzọ ga-abụ? Kedu usoro nke asọmpi ahụ? Ebee ka a na-agba egwuregwu ahụ, ma olee mgbe ọ ga-amalite?

BBC Sport Africa na-enye gị ozi niile tupuu asọmpị bọọlụ ụmụnwaanyị Afrịka agba nke iri na atọ ebido.

Kedụ etu e si kesaa mba niile ga-agba asọmpi WAFCON 2025?

Mba Iri na abụọ bịara egwuregwu WAFCON 2025 ụzọ atọ ka e kesara mba anọ mejupụtara ofu otu.

Ndị Moroko nwere ọrụ siri ike n'otu - A, ebe ejikọtara ha na mba Zambia bụ ndị meriri ha na ntozu maka asọmpi Olimpik 2024.

Ndị Atlas Lionesses ga-ezutekwa Senegal na DR Kongo.

Mana ọ dịka Naịjirịa enweghị nnukwu ihe iche aka mgba maka ndekọ ha n'uwa nakwa Afrịka.

Nkeji A: Moroko, Zambia, Senegal, DR Kongo.

Nkeji B: Naịjirịa, Tunisia, Algeria, Botswana.

Nkeji CH: Saụt Afrịka, Gana, Mali, Tanzania.

Ụbọchị a ga-amalite Wafcon 2024 na ụbọchị niile a ga-agba ya

Ndị egwuregwu Saụt Afrịka, nwere ihe nrite n'olu n'olu na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, na-eji iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị na 2022 mee ememme.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Saụt Afrika gbachitere asọmpi iko mba Afrịka ụmụ nwanyị nke ha meriri na 2022

Mgbe a gbachara egwuregwu e ji emmeghe asọmpi a, opekatampe egwuregwu abụọ ka a ga-agba kwa ụbọchị n'otu oge. A ga-agba egwuregwu a ruo n'ụbọchị Mọnde, 14 Julaị.

A na-agba ya n'elekere 13:00, 16:00 na 19:00 (oge GMT niile) na mbido.

Kedụ ama egwuregwu a na-agba Wafcon 2024?

A gbara asọmpi ikpeazu nke WAFCON na Moroko n'afọ atọ gara aga, mana n'ime ama egwuregwu atọ e jiri gbaa asọmpị n'oge ahụ enweghị otu n'ime so n'ebe a ga-agba asọmpi nke afọ.

Moroko na-arụ ọtụtụ ọrụ mmepe dịka ọ na-akwado ikwado iko mba Afrịka nke afọ 2025 ma na-akwado iko mbaụwa nke FIFA 2030.

A ga-eji ama egwuregwu isii dị na mpaghara ise nakwa ama egwuregwu abụọ dị na Kasablanca gbaa asọmpi WAFCON afọ a.

  • Ama egwuregwu Olimpik, Rabat (mmadụ 21,000)
  • Ama egwuregwu El Bachir, Mohammedia (mmadụ 15,000)
  • Ama egwuregwu Larbi Zaouli, Casablanca (mmadụ 30,000)
  • Ama egwuregwu Pere Jego, Casablanca (mmadụ 10,000)
  • Ama egwuregwu Honneur, Oujda (mmadụ 19,800)
  • Ama egwuregwu Berkane, Berkane (mmadụ 15,000)

Kedụ ndị nwereike iburu iko a?

Barbra Banda

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Barbra Banda na-agbara mba Zambia, turu ugo ọkọrọtọ nwaanyị kacha agba bọọlụ nke BBC n'afọ 2024 adịla njikere ị sọ gaa asọmpi a ka ọ gaghị nke afọ 2022

N'ime mba iri na abụọ na-asọ mpi na Morocco, ọ bụ naanị Naịjirịa na Saụt Afrịka bugoro iko Wafcon.

Ndị Super Falcons na-eme njem n'alaeze ahụ nwere nnukwu akụ na ụba n'okpuru onye nchịkwa obodo Justin Maduguwu.

Akpọla Chiamaka Nnadozie dị ka onye mgbaru ọsọ kacha mma n'Afrịka afọ abụọ gara aga na onye n'ihu Asisat Oshoala na-eweta ọdịdị kpakpando na echiche mmeri.

Onye nkuzi Desiree Ellis na-ele anya iji otu Banyana Banyana gbachitere iko a bụ onye na-agaghị aga n'ihu Thembi Kgatlana n'ihi ebumnuche onwe ya.

Mara na Moroko etinyela nnukwu ego n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ n'afọ ndị na-adịbeghị anya mana otu ụmụnwaanyị ha enwebeghị ike iṅomi ihe ịga nke ọma ụmụ nwoke obodo ahụ n'ịghọ ndị otu kachasị na kọntinent ahụ.

Zambia gụchara nke atọ na mbipụta gara aga wee na-anya isi na ọ bụ onye egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Afrịka na-achị na Barbra Banda, onye a manyere ịhapụ asọmpi ikpeazụ nke 2022.

Oge na ụbọchị a ga-asọmpi na WAFCON 2024

Ndị Moroko n'afo 2022

Ebe foto si, Backpage Pix

Nkọwa foto, Morocco ga-agba ndị Zambia n'ama egwuregwu Rabat
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mgbe asọmpi niile ga-ebido n'usoro elekere GMT.

Satọde 5 Julaị

Nkeji A: Moroko na Zambia, amaegwuregwu Olimpik, Rabat (20:00)

Sonde 6 Julaị

Nkeji A: Senegal na Ivory Coast, amaegwuregwu El Bachir, Mohammedia (14:00)

Nkeji B: Naịjirịa na Tunisia, amaegwuregwu Larbi Zaouli, Casablanca (16:00)

Nkeji B: Algeria na Botswana, amaegwuregwu Pere Jego, Casablanca (19:00)

Monde 7 Julaị

Nkeji Ch: Saụt Afrịka na Gana, amaegwuregwu Honneur, Oujda (16:00)

Nkeji Ch: Mali na Tanzania, amaegwuregwu Berkane , Berkane

Wednezde 9 Julaị

Nkeji A: Zambia na Senegal, amaegwuregwu Mohammedia (16:00)

Nkeji A: DR Kongo na Moroko, amaegwuregwu Rabat (19:00)

Thọzde 10 Julaị

Nkeji B: Botswana na Naịjirịa, amaegwuregwu Larbi Zaouli, Casablanca (16:00)

Nkeji B: Tunisia na Algeria, amaegwuriegwu Pere Jego, Kasablanca (19:00)

Fride 11 Julaị

Nkeji Ch: Gana na Mali, amaegwuregwu Berkane (16:00)

Nkeji Ch: Tanzania na Saụt Afrịka, amaegwuregwu Oujda (19:00)

Satọde 12 Julaị

Nkeji A: Moroko na Senegal, amaegwuregwu Rabat (19:00)

Nkeji A: Zambia na DR kongo, amaegwuriegwu Mohammedia (19:00)

Sọnde 13 Julaị

Nkeji B: Naịjirịa na Algeria, amaegwuregwu Larbi Zaouli, kasablanca (19:00)

Nkeji B: Tunisia na Botswana, amaegwuriegwu Pere Jego, Kasablanca (19:00)

Monde 14 Julaị

Nkeji Ch: Saụt Africa na Mali, Oujda (19:00)

Nkeji Ch: Gana naTanzania, Berkane (19:00)

Agba anọ nke ikpeazụ na Wafcon

Fride 18 Julaị

QF1: Nkeji A ndị meriri na Nkeji Ch/B onye gbara bke atọ, Rabat (19:00)

QF2: Nkeji B onye meriri na Nkeji A Onye gbara nke Abụọ, Larbi Zaouli Stadium, Kasablanca (16:00)

Satọde 19 Julaị

QF3: Nkeji C Onye meriri na Nkeji A/B Onye gbara onye atọ, Oujda (19:00)

QF4: Nkeji B Onye nke abụọe na Nkeji Ch Onye nke abụọ, Berkane (16:00)

Agba abụọ nke ikpeazụ

Hildah Magaia jna ndị ọzọ n'afọ 2022.

Ebe foto si, Backpage Pix

Nkọwa foto, Hildah Magaia nyere goolu abụọ mba Saụt Afrịka jiri merie Morocco 2-1 na ngwụcha Wafcon 2022.

Tuesday 22 July

SF1: meriri QF1 na meriri QF4 ga-agba na Rabat (19:00) - gee asọmpi na redio BBC World Service nke Afrịka.

SF2: onye meriri QF2 na onye meriri QF3 ga-agba n'ama egwuriegwu Larbi Zaouli Stadium dị na Casablanca (16:00) - gee asọmpi na redio BBC World Service nke Afrịka.

Asọmpị ndị nke atọ

Friday 25 July

SF1 e meriri na SF2 e meriri ga-ezuta n'ama egwuriegwu Larbi Zaouli di na Casablanca (19:00)

Wafcon 2024 asọmpi ikpeazụ

Satọde 26 July

SF1 meriri na SF2 meriri, ga-ezute n'Olimpik Stadium, Rabat (20:00) - Gee asọmpi na redio BBC World Service nke Afrịka.