Iwu ọkụ latrik Naịjirịa nke 2023 nyere anyị ikike ịgbanwe usoro ụgwọ ọkụ latrik n'Enugwu Steeti – Ụlọọrụ EERC

Ebe foto si, Enugu State Governemnt
Ụlọọrụ na-ahụ maka nkesa ọkụ latrik n'Enugwu Steeti bụ Enugwu Electricity Regulatory Commission (EERC) ekwuola na iwu ọkụ latrik Naịjirịa nke afọ 2023 nyere ya ikike ịhazi na ịgbanwe usoro ụgwọ ọkụ latrik na steeti ahụ.
Na nzaghachi ajụjụ nke ụlọọrụ gọọmenti etiti Naịjirịa bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (NERC) na-ahụ maka nkesa ọkụ latrik na Naịjirịa niile jụrụ ha banyere nkwupụta ụlọọrụ ahụ wepụtara n'oge na-adịbeghị anya na ha ga-amalite ịnakọ ndị bi n'Enugwu usoro ụgwọ ọkụ latrik ọhụrụ malite n'abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst 2025.
Cheta na ụlọọrụ EERC kwuru n'izu gara aga na ha enwetara ụlọọrụ ọhụrụ bụ MainPower Distribution Company nke ga na-ekesa ọkụ latrik na steeti ahụ.
Ha kwukwara na ụlọọrụ ahụ ga-ebudata ụgwọ ọkụ latrik site n'ọnụego N260 ruo ọnụego N160 ma kagbuo nhazi usoro ụgwọ ọkụ latrik bụ "bands" malite n'abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst.

Mana ụlọọrụ nke gọọmenti etiti bụ NERC kwuru na Enugwu enweghị ikike ịgbanwe ego ole ndị bi na steeti ahụ ga-akwụ n'ọkụ latrik maọbụ kagbuo "Bands" bụ usoro gọọmenti etiti wepụtara.
Gọọmenti Enugwu Steeti site n'aka onyeisi ụlọọrụ EERC kwuru na iwu "Nigeria Electricity Act of 2023" bụ nke sotere mmezi iwu a kpọrọ "constitution amendment" nyere ha ikike imezi, igbanwe nakwa ịchọ ụzọ ka mma iji nye ndị bi na steeti ahụ ọkụ latrik.
Dika Maazi Chijioke Okonkwo siri kọwaa, iwu ahụ nyere EERC ikike ime ihe ha n'eme ugbua na steeti ahụ.
Ihe i kwesiri ịma maka usoro iwu ọkụ latrịk ọhụrụ gọọmenti Enugwu Steeti wepụtara

Ebe foto si, ENSG/Getty Image
Ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ latrịk n'Enugwu Steeti bụ Enugu State Electricity Regulatory Commission (EERC), ekwuola na ha ga-amalite imezu ihe dị n'usoro iwu ọkụ latrik ọhụrụ na steeti ahụ.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Usoro iwu ọhụrụ ahụ nke ụlọọrụ ahụ kwuru na ọ ga-amalite n'abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst nke afọ a, ga-eme ka amalite ịnakọ ndị bi na steeti ahụ ego ụgwọ ọkụ ọhụrụ.
Ha kwuru na-aga enwe ụlọọrụ ọhụrụ ga na-ekesa ọkụ latrik n'Enugwu Steeti nke a na-akpọ "MainPower" bụ ndị ha kwuru na ha ga-amalite ịnakọ ọnụego ọhụrụ maka otu kilowatt (kwh) ọkụ latrik.
Ụlọọrụ ahụ gara n'ihu kwuo na ndị bi n'Enugwu ga na-akwụ ọnụego otu narị naịra na iri isii (N160) maka otu kwh ọkụ latrik.
Ha kwukwara na gọọmenti Enugwu Steeti akagbuola usoro nhazi nkesa ọkụ latrik na steeti ahụ nke a kpọrọ "Band" n'olu bekee dịka ha ga-etinye mmadụ niile n'otu ogogo bụ "Band A".
Cheta na mba Naịjirịa wepụtara iwu ọkụ latrik 2023 ọhụrụ nke ga-anọchiteanya usoro iwu mgbanwe nke ngalaba ọkụ latrik afọ 2005, a na-akpọ Electric Power Sector Reform Act, 2005.
Iwu ọhụrụ a wetara nnukwu mgbanwe n'ihe banyere ọkụ latrik na Naịjirịa dịka o kwuru ka ekewaa ọrụ nkesa na inye ọkụ, ma nyekwa steeti ikike ịhazi usoro ahịa ọkụ latrik nke ha.
Gịnị mere gọọmenti Enugwu jiri belata ego ọkụ latrik?
N'afọ 2023, Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Peter Mbah binyere aka n'iwu ọhụrụ Enugu State Electricity Law 2023 nke nyere ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ latrik na steeti ahụ bụ Enugu State Electricity Regulatory Commission (EERC) ikike ịhazi ọrụ ndị na-inweta, inye ma ikesa ọkụ latrik n'Enugwu steeti.
Nke a na-esochi ndezigharị iwu nke afọ 2023 bụ nke kwadoro inye steeti ọbụla dị na Naịjirịa ikike ịhụ maka ịgbasa ọkụ latrik na steeti ha.
Ọchịchị Peter Mbah kọwara na ngbanwe ụlọọrụ na-ahụ maka nkesa ọkụ latrik na steeti ahụ bụ iji nyere ndị mmadụ bi na steeti ahụ aka site na-ibelata ọnụahịa ha na-azụ ọkụ latrik na steeti ahụ.
Onyeisi ụlọọrụ nke EERC bụ Chijioke Okonkwo kwuru na mbelata ọnụahịa tarifu ndị bi n'Enugwu steeti na-akwụ maka ọkụ latrik nakwa ịkpọbata ụlọọrụ MainPower ka ha bụrụ ndị ga-ahụ maka nkesa ọkụ latrik na steeti ahụ bụ ihe ha sara anya mmiri were mee.
"Anyi nyochara nke ọma ka esi agbakọ ego tarifu ndị mmadụ na-akwụ maka ọkụ latrik, wee hụ n'ụlọọrụ MainPower ga-abara ndị Enugwu uru site na iji obi mmadu arụ ọrụ."
"Mgbakọ na nwepụ niile anyị na ndị ụlọọrụ mere gosiri na ịkwụ N160 dịka ọnụahịa nke otu kwh dị mma maka ndị Enugwu.
Okonkwo gara n'ihu kwuo na: "Mbelata ụgwọ ọkụ latrik bụ maka ụfọdụ ihe nke gụnyere na gọọmenti etiti na-enye aka n'ịkwụ ụgwọ ọkụ latrik site n'inye ego enyemaka ọkụ latrik".
O kwuru na ego enyemaka nke ọkụ latrik ahụ belatara ego eji arụpụta ọkụ latrik site n'ọnụahịa ₦112 gbadata na ₦45 maka Enugwu steeti.
"Nke a mere ka anyị jiri tinye tarifu ọkụ latrik n'ọnụahịa N94 dịka ọnụahịa dị mma."
Ọ dọrọ aka na nti na enwekwara ike ịtụgharị ọnụahịa ọkụ latrik na steeti ahụ ma ọ bụrụ na ụlọọrụ Mainpower hapụ ịzụ ọkụ nke gọọmenti etiti tinyere ego enyemaka na ya, ma zụọ ọkụ latrik n'aka ụlọọrụ Nigerian Bulk Electricity Trader (NBET).










