Ndị agboro na-emekpa anyị ahụ -Ndị isi ụlọakwụkwọ ndị ntị chiri n' Abia steeti

Aha onyonyo, Ọnọdụ ụfọdụ agụmaakwụkwọ na mpaghara ndịda anyanwụ Naịjiria abụrụla ihe na-agba anya mmiri nyere ndị nkụzi, ụmụaka nakwa ndị nne
Ndị agboro na-emekpa anyị ahụ -Ndị isi ụlọakwụkwọ ndị ntị chiri n' Abia steeti
Ụlọakwụkwọ agụmakwụkwọ pụrụiche akpọrọ .special education centre. nọ n'akụkụ Azikiwe Road by East Road, Aba - Abia steeti
Nkọwa foto, Akara ụlọakwụkwọ ndị ntị chiri nọ na Aba, Abia steeti

Ndị nkuzi ụlọakwụkwọ ndị ntị chiri nakwa ndi nwere nsogbu uche n' Abia steeti etiela mkpu na oke olu nyere nsogbu ha na-enwe n'ụlọakwụkwọ ha.

Ụlọakwụkwọ agụmakwụkwọ pụrụ iche a kpọrọ 'Special Education Centre nọ n'akụkụ Azikiwe Road by East Road, Aba , Abia steeti bụ otu n'ime ụlọakwụkwọ abụọ enwere na steeti ahụ maka ndị ntị chiri na ndị nwere nsogbu uche. Nke ọzọ nọ na Umuahia

Mgbe BBC Igbo mere nnyocha ebe ahụ, onyeisi ndị nkuzi Ijeoma Madubuko gwara onye ntaakụkọ anyị na ụlọakwụkwọ ha kwesịrị ị bụ ebe olileanya na ọgwụgwọ nyere ndị ntị chiri, ndị nwere nsogbu uche nakwa ndị ogbo mana gburugburu ya ugbu bụ nke na-enye obi mgbawa.

Ụmụakwụkwọ ndị nwoke na nwannyi yi uwe ụlọakwụkwọ ha na-amụ ihe.

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ agụmakwụkwọ pụrụ iche akpọrọ special education centre nọ n'akụkụ Azikiwe Road by East Road, Aba - Abia steeti

Na-agbanyeghị na ụlọakwụkwọ ha emebichala, ihe ọzọ na-enye ha obi mgbawa bụ na ndị agboro na-abịa ezuru ugwu, nkasi obi na nchekwa ụmụakwụkwọ ndị a pụrụiche.

Nke na-agba anya mmiri bụ na mgbe BBC Igbo rutere ebe ahụ, ha huru ka ụmụakwụkwọ nọ na-anwụ na-achọ mmiri maka mmiri nke ha nwere n'ụlọakwụkwọ ha ndị agboro bịara zuru akụrụngwa e ji ewepụta mmiri nke bekee kpọrọ 'borehole pipe'.

Nke kacha awa isi bụ na ihe abụghị nke mbụ ndị agboro na-abịa ezuru ihe ndị ha nwere n'ụlọakwụkwọ ha.

Ihe ọzọ bụ na ndị ajọ mmadụ a na-abịa akpakasi ihe ndị eji rụọ ụlọakwụkwọ ahụ ma nyụọ nsi ebe niile.

"Otu ụbọchị ndị agbọrọ a kụrụ otu onye nkuzi anyị ihe maka ọ nọ na-achụpụ ha mgbe ha nọ na-aga mposi n'ime ụlọakwụkwọ ebe ụmụaka na-amụ ihe".

"ụmụaka akwụkwọ bịa ụlọakwụkwụ ha ga-ebu ụzọ kpowaa nsi tupu ha amalite ị mu ihe"

Nke kacha awa isi bụ na ihe abụghị nke mbụ ndị agboro na-abịa ezuru ihe ndị ha nwere n'ụlọakwụkwọ ha.
Nkọwa foto, Akụrụngwa ụmụakwụkwọ ji agbata mmiri nke ndị agboro zuru

Ọtụtụ ndị nkuzi n'ụlọakwụkwọ ahụ tinyere ọnụ rịọ gọọmenti Abia steeti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka ma rụọ ụlọ ebe obibi n'ụlọakwụkwọ ahụ maka ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-esi ebe dị anya na-abịa akwụkwọ.

"Ụlọakwụkwọ a bụ sọsọ ụlọakwụkwọ ndị ntị chiri na ndị ọzọ nwere nsogbu dị iche iche na Aba. Ọ ga-adị mma ka gọọmenti rụọ ụlọ ebe obibi maka na ọtụtụ ndị mmadụ na-esi ebe dị anya a bịa"

Otu nwannyị nwa ya na-aga akwụkwọ ebe ahụ si na ndị nne na nna na-agbafụ egọ ị gba ụgbọala ị kpọta ụmụ ha akwụkwọ. Ọ kọwara na ọ ga-adị mfe ya bụrụ na gọọmenti rụọ ụlọ ọbibi ebe ahụ dịka ndị nkuzi si kwuo.

E nwere ndi nkuzi rịọrịọ arịrịọ ka ministri na-ahụ maka agụmakwụkwọ kpọtara ha ndị nkuzi na-ahụ maka ụmụakwụkwọ pụrụiche I ji nyere ndị nọ ọrụ ugbua aka.

Lee steeti kacha edozi ụlọakwụkwọ n'ọwụwaanyanwụ
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Legọs

Ụmụaka na-anọdụ n'ala agụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ n'Abịa steeti

N'ụlọakwukwọ a, mkpuchi ha emebiela ọtụtụ afọ
Nkọwa foto, World Bank Model Praịmari 2, n'isi obodo Umuahia n'Abia steeti

Ọnọdụ ụfọdụ agụmaakwụkwọ na mpaghara ndịda anyanwụ Naịjiria abụrụla ihe na-agba anya mmiri nyere ndị nkụzi, ụmụaka nakwa ndị nne na nna.

BBC Igbo chọpụtara nke a mgbe ha mere nyocha pụrụiche na ụfọdụ ụlọakwụkwọ praịmari nke gọọmenti nwe na steeti ise nke mejupụtara ndịda anyanwụ Naịjiria.

Otu onye nkụzi na-achọgi ka akpọ aha ya n'ụlọakwụkwo World Bank Model Praịmari 2, nọ n'isi obodo Umuahia n'Abia steeti si na mgbe ọbula ha biara akwụwkwọ kama ụmụaka ga-anọrọ ala gụọ akwụkwọ, ha ga-eji awa abụọ kpowa nsị ndị mmadụ nyụrụ na klassị tupu ha anọdụ ala ịmu ihe.

BBC Igbo na-ewetara gị akụkọ ụwa niile n'ekwenti gị. Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
N'ụlọakwukwọ a, gbam gbam eji ekpuchi ime ụlọ emebiela dịka ọhia gbara ha okirikiri
Nkọwa foto, World Bank Model Praịmari 2, n'isi obodo Umuahia n'Abia steeti

Ọ kọwara na ha bịara ọrụ otu ụbọchị ma chọpụta na ndị ohi bịara zuo akụrụngwa dị iche iche eji akụziri ụmụakwụkwọ ihe ha na akụrụngwa eji rụọ ụlọakwụkwọ nke mere ụmụaka ji amụ ihe n'ezi.

O kuru si "obi adịghị ya mma maka ọnọdụ ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ. Kemgbe ndị ohi bịara zuru akụrụngwa dị iche iche, anyị jikọtara ihe dịka klasị abụọ maọbụ atọ n'otu ụlọ ịmụ ihe"

Oge udu mmiri maọbu ọkọchi, ụmụakwụwkwọ na-ata ahụhụ maka klassị ha emebiela
Nkọwa foto, Otu klassị mebiri emebi n'ụlọakwụkwọ World Bank Model Praịmari 2, n'isi obodo Umuahia n'Abia steeti

Otu onye nkuzi ọzọ kwuru na ha n'agba mbọ ihu na ha gara mpusi n'ụlọ tupu ha bịa ụlọakwụkwọ maka ha enweghị ebe mpusi n'ụlọakwụkwọ ha.

"Ka ọ dị ugbu a, enweghị m ike ịtinye ụmụaka m na ọdịka ụlọakwụkwọ anyị a"

N'ụlọakwụkwọ World Bank Model Praịmari 1, ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi n'atụ ụjọ ịbịa n'oge maka na ha nwereike izute ndị omekome.

"O nwere mgbe otu onye ntụrụ mmadụ kara ijide otu nwa akwụkwọ mana chineke zọpụtara ya.

"O nwere mgbe ha napụrụ otu onye nkụzi bịara ọrụ n'isi ụtụtụ akara ekwentị ya"

Kedụ ihe gọọmenti Abia steeti gwara BBC?

Onyesisi mgbasa ozi govanọ Abia steeti Ukoha Njoku Ukoha kọwara ihe gbasara agụmakwụkwo nwụrụ anwu n'Abia steeti mana ọ bughị ha kpatara ya, ọ boro ebubo na ọ ndị nọ bụ n'ọchịchị tupu ha abata n'oche rere ụfọdụ ụlọụmụakwụkwọ nye ndị otụ ha tupu ha apụọ ọchịchị"

Ka ọ dị ugbu a, gọọment Abia steeti ewerela ndị nkuzị kariri puku ise na-ọrụ ma na-akwado iwere ọzọ kariri puku anọ.

"Anyi nwere ụlọakwụkwọ ruru otu puku, mana aka na-achi steeti bụ Otti enyeala ikikere ka arụgharịa ihe ruru narị abụọ iri abụọ na otụ (221) nakwa ịdozi ihe ruru iri ise na atọ (53) dịka ọ na atụgharị iri abụọ (20) ka ha bụrụ ụlọakwụkwọ smart

"Ihe ọzọ gọọment na-eme ugbu a bụ ị were ndị nchekwa ga na-echekwa ụlọakwụkwọ niile nọ na steeti nọ ọru, ndị anakpo local vigilante na-okwu bekee"

Akụkọ ndị a kacha agụ na websaịt anyị

Ụmụaka ga-ebuzo zapụ nsi ndị mmadụ nyụrụ nakwa mmiri zobatara na Klasi ha tupu ha amụwa ihe

Mmiri n'achụpụ ụmụakwụkwọ na klassi ha
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ Okpaugwu Urban1 n'Ebonyi steeti

Ọtu onyenkuzi n'ụlọakwukwọ Okpaugwu Urban 1 n'Ebonyi steeti n'ayọ ka gọọmenti gbatara ha ọsọ enyemaka maka ndị mmadụ na-eji nsị achụpụ ha n'ụloakwụkwọ

Ụmụakwụkwọ Okpaugwu Urban 1 n'Ebonyi steeti na-amụ ihe na klassị
Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ Okpaugwu 1 n'Ebonyi steeti

Ọnye nkuzi ọzọ kwuru na ndị ara, ndị ọsi na ndị omekome n'enye ha nsogbu na gbụrụ gbụrụ ụlọakwụkwọ ha.

Nke a kpatara ụmụaka anaghị abịa n'oge.

"Ihe gbasara nchekwa na skool ebe a kụrụ afọ n'ala maka ndị omekome n'enye anyi nsogbu.

Onwe mgbe ha nara otu onye nkuzi ekwenti ya mgbe ọ na-abia ọrụ."

ụlọakwụkwọ n'Ebonyi steetị
Nkọwa foto, ụlọakwụkwọ n'Ebonyi steetị

Kedụ ihe Gọọmenti Ebonyi sara BBC?

Kọmishọna n'ahụ maka agụmakwụkwọ n'Ebonyi steeti ọkammụta Awo Nwobashi si na ha agaghi agọnahu na-enweghị ụlọakwụkwọ ndị na-adighị mma na steeti ha mana gọọmentị n'agbambọ ihu n'emeziri ya.

"Ka ọ dị ugbu a, gọọment Ebonyi na-arụ ụlọakwụkwọ ọhụrụ ruru iri atọ na abụọ (32) na mpaghara dị iche iche n'Ebonyi steeti."

"Gọọmenti enyela ndị ọrụ ọtụtụ ego ka ha mezie ụlọakwụkwọ ọbụla na adighị mma site na praimarị ruo na sekọndịrị"

Anyị enweghị ụlọmposi, ndị omekome na-abata ebe a awakpo n'ụlọakwụkwọ anyị n'Anambra steeti

Ụlọakwụkwọ n'Anambra steeti
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ n'Anambra steeti

Mgbe BBC Igbo mekwara nyocha n'Anambra steeti na ụlọakwụkwọ Okpoko Community Primarị 11, otu onye nkuzi kwuru na ha bụ ndị nkuzi onweghị ụlọọrụ, ụmụaka enweghị oche na ihe ndị ozo maka ndị ohi n'abia ezu akụrụngwa ha ji agụ akwụkwọ.

Ụlọakwụkwọ Okpoko Community Primarị 11 enweghị ebe ụmụakwụkwọ maọbụ ndị nkuzi ga-aga mpụsi maka nke nọ emebiela
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ Okpoko Community Primarị 11 dị n'Ọgbaru, Anambra steeti

Ihe Gọọmenti Anambra steeti sara anyị

Kọmisha agụmakwụkwọ n'Anambra steetị ọkamụta Ngozi Chuma si na-mgbe ha batara ọchịchị, gọvano Soludo kwupụtara ọnọdụ gbata gbata na-agụmakwụkwọ n'ihi na "o ketara akụrụngwa ụlọakwụkwọ mebiri emebi n'aka onye bubu gọvana"

N'ihi nke a, Soludo na-arụ "Smart School" iri abụọ na otu (21) n'isi obodo niile dịka o meziri ụlọakwụkwọ ndị n'adighị mma ruru iri anọ (40)

"Govanọ nyere ndị nkuzi puku asatọ, otu narị, iri na ise (8115) ọrụ n'ọnwa isii ọ batara ọchịchị iji kwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ. Tupu o mechara nke a, o bidoro imezi ụlọakwụkọ ndị na-adighị mma dịka ọ n'arụgharị ndị nke nwere nnukwu nsogbu"

Ndị nkuzi Imo steeti tụrụ ụjọ na a ga-achụ ha n'ọrụ mere ha ejighị kwuo okwu cha cha

Ụlọakwụkwọ Comprehensive Emekuku
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ Comprehensive Emekuku

Mgbe BBC gara n'ụlọakwụkwọ ụfọdụ n'Imo steeti ndị nkuzi ekweghị ekwu okwu maka ụjọ na-aga achụ ha n'ọrụ.

Mana anyị sere foto nke gosiri ọnọdụ ụlọakwụkwọ ebe ụmụaka na-anọ amụta ihe sị dị.

Gọọmenti Imo steeti ọ sara BBC?

Mgbe anyi kpọtụru gọọmenti Imo steeti, o nweghị ihe ha sara anyi ruo ugbu a maka ọnọdụ ụlọakwụkwọ dị na steeti ha.

Kọmishona na-ahu maka agụmakwụwkọ n'Imo steeti ọkamuta Ikegwuoha azaghị ekwentị ya nakwa ọzị ndị BBC Igbo zigara ya.

Eluụlọ ụlọakwụkwọ Comprehensive Sekọndịrị n'Emekuku, Imo steeti
Nkọwa foto, Eluụlọ ụlọakwụkwọ Comprehensive Sekọndịrị n'Emekuku, Imo steeti

Ihe anyị hụrụ n'Enugwu steeti

Mgbe BBC gara n'ụlọakwụkwọ ụfọdụ n'Enugwu anyi ahụghị ụlọakwụwkọ mebiri emebi maka na gọọment steeti amalitela ịrụgharị ụlọakwụkwọ nille mebiri emebi.

Ụlọakwukwọ ndị anyị nyochara gunyere Haven Praimarị, Ekulu Praimarị GRA Enugu nakwa ụlọakwụkwọ Practicing nọ n'Emene, GTC

Ụlọakwụkwọ GTC n'Enugwu

Ebe foto si, Enugwu steeti gọọment

Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ GTC n'Enugwu

Ihe Gọọmenti Enugwu sara anyị

Na-agbanyeghị ya, Kọmishiona n'ahụ maka agụmakwụkwọ n'Enugu ọkamụta Ndubueze Mba kwuru na "Gọọmenti na-aga n'ihu ịgbanwe ọnọdu agụmakwụkwọ site n'ịwu ụlọakwụkwọ nke akpọrọ "Smart Green" ruru narị abụọ na iri isii (260) na mpaghara isi obodo niile nke otụ n'ime ha nwere ike ịnabata ụmụ akwụkwọ ruru puku (1000)

N'ime narị abụọ na iri isii (260) gọọment kwere nkwa irụ, Mba si na ha arụchala otu nari, iri abụọ na ise (125), dịka ha ka na-arụ elu ụlọ otu nari, iri ato na ise (135) ndị nke ka fọrọ mebiri emebi.

"Ha niile ga-adị njikere n'ọnwa Septemba dịka ana-atụ anya n'ụmuakwụkwọ narị puku abụọ na iri isii (260,000) ga-amalite agụmakwụkwọ"