IGP Kayode ezutela ndị uweojii nara ezumike nka na-eme ngagharịiwe n'Abuja

IGP na ndị nara ezumike nka

Ebe foto si, NPF/X

Nkọwa foto, IGP na ndị nara ezumike nka
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisi ndị Uweojii na Naịjirịa bụ Kayode Adeolu Egbetokun ezutela ndị uweojii na-eme ngagharịiwe n'Abuja.

Ulọọrụ ndị uweojii na Naịjirịa mere ka a mata nke a n'akara X soshal midia ha.

N'okwu ha "IGP Kayode Adeolu Egbetokun nọ ugbua n'ụlọ ọgbakọ 'Peacekeeping Hall' dị n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja ebe ya na ndị uweojii nara ezumike nka na-enwe mkparịta ụka".

Ndị uweojii

Ebe foto si, NPF/X

Nkọwa foto, Ndị uweojii

Isi okwu ihe ha na-akpa gbadoro ụkwụ n'ihe gbasara ihe nrite ndị nara ezumike ọlụ na ihe ndị ọzọ na-emetụta ha.

"Mkparịta ụka ahụ na-aga nke ọma na-enweghị ọgbaaghara n'etiti ndị nara ezumuike nka na ndị uweojii".

Ndị uweojii lara ezumike nka na Naịjirịa na-eme ngagharịiwe maka ọdịmma ha
Ha na-emekwa mkpesa maka obere ego ha na-enweta dịka ụgwọ ezumike nka na ụgwọ a na-akwụ ndị chọrọ ịla ezumike nka "gratuity".

Ụfọdụ ndị uweojii lara ezumike nka malitere ime ngagharịiwe megide ọnọdụ ọdịmma adịghị mma maka ndị uweojii nọ n'ọrụ na ndị lara ezumike nka na Naịjirịa.

Ngagharịiwe ahụ malitere n'isi obodo Abuja n'ụbọchị Mọnde 21 Julaị 2025 dịka otu ndị National Association of Police Retirees jupụtara n'okporoụzọ iji mee ka gọọmenti etiti Naịjirịa nụrụ olu ha.

Ndị uweoji ahụ lara ezumike nka na-emekwa mkpesa maka obere ego ha na-enweta dịka ụgwọ ezumike nka na ụgwọ a na-akwụ ndị chọrọ ịla ezumike nka "gratuity".

Ha katọrọ ihe ha kọwara dịka ọtụtụ afọ nke nleghara anya, akwụghị ụgwọ ezumike nka, na mmeso ọjọọ a na-emeso ndị uweojii jere ozi mba ahụ nke ọma.

Onye ndu otu Revolution Now Movement bụ Omoyele Sowore sonyekwara ndị uweojii lara ezumike nka na-ịkpọ oku ka gọọmenti etiti tinye aka ngwa ngwa na-ịgbanwe ọnọdụ ha dịka ụlọmgbasa ozi channels tv siri kwuo.

BBC News Igbo amalitela ịgbasa ozi n'ọbaozi WhatsApp Channelụ
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro anyị