Ọbaozi WhatsApp nke BBC IGBO: Etu ị ga-esi sonye ma nweta akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa

BBC Igbo amalitela izipụ akụkọ n'ọbaozi Whatsapp
Nkọwa foto, BBC Igbo amalitela izipụ akụkọ n'ọbaozi Whatsapp
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ugbua ị pụrụ iji ekwentị gị nweta akụkọ niile dị mkpa na-eme ozugbo, nnyocha akụkọ na akụkọ ndị pụrụ iche BBC News Igbo chịkọtara.

Ndị ntaakụkọ anyị na-ahọrọ akụkọ ndị ahụ bụ ọkaibe na-akpọtụ gburugburu anyị nakwa na mbaụwa, mepụta ha n'ụdị edemede na ihe onyonyoo maka ndị na-esonye n'ọbaozi WhatsApp ọhụrụ anyị.

Dịka e hibere ya n'afọ 2023, ọbaozi WhatsApp Channel na-enye ndị mmadụ ohere inweta ozi dị mkpa site n'aka ndị ọzọ nakwa otu ndị na-amasị ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Whatsapp dị n'ekwenti mmadụ ji n'aka

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụrụ ma a chịkọta ya ọnụ, mmadụ karịrị nde 15 esonyela n'ọbaozi WhatsApp Channel ụlọọrụ BBC niile n'ime mba karịrị 200.

Lee ka ị ga-esi nweta akụkọ na ihe ngosi kachasị mma BBC ga-ewetara gị n'asụsụ Igbo:

  • Pịa aka ebe aBBC Igbo whatsapp Chanelụ iji banye n'ọbaozi WhatsApp anyị ọ bụrụ na i ji ekwentị maọbụ WhatsApp Web.
  • I nwekwara ike chọọ BBC News Igbo n'okpuru "Updates" na WhatsApp.
Aka na-apị Whatsapp n'ekwenti
Nkọwa foto, Aka na-apị Whatsapp n'ekwenti

I nwere ike chọta "Updates" na ndịda akaekpe dị n'ihu ekwentị gị ọ bụrụ na i ji iPhone, maọbụ na mgbago ihu ekwentị gị ọ bụrụ na i ji Android.

Ọ bụ ebe ahụ ka ozi anyị niile ga-egosi - ọ ga-anọpụ iche na mkparịtaụka "Chat".

Pịa aka na mgbịrịgba dị na mgbago ọbaozi WhatsApp Channel iji kpọghee ya ka ị ghara ịgbanarị akụkọ anyị ọbụla. I nwekwara ike kpọchie ya ọzọ maọbụ wezuga onwe gị n'ọbaozi anyị oge ọbụla ị chọrọ.

I nwere ike iji ngosi emoji ọbụla masịrị gị gosipụta ka obi dị gị dịka ọ dịkwaara gị mfe izigara ndị nke gị akụkọ ndị kachasị masị gị n'akara Whatsapp ha.

Ụlọọrụ nwe WhatsApp, Facebook na Instagram bụ Meta ekwuola na enweghị onye ọbụla ga-ahụ njirimara, foto, aha maọbụ akara ekwentị ibe ya n'ọbaozi WhatsApp Channel.

Mụtakwuo maka ozi nzuzo gị na BBC WhatsApp Channels and Communities Privacy Notice Pịa ebe a ka ị gụọ maka iwu nzuzo Whatsapp Chanelụ.