Nwaanyị ọbụla mere BBL amaghị ihe - Eric Gugua

Aha onyonyo, Ọ bụ n'ihi agụụ ka m jiri malite ime ihe ngosi - Eric Gugua
Nwaanyị ọbụla mere BBL amaghị ihe - Eric Gugua
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist

Eric Gugua bụ nwaafọ Igbo a maara nke ọma maka ime ihe ngosi a kpọrọ content creation n'asụsụ Bekee.

Oge anyị na ya nwere mkparịtaụka pụrụiche, Eric kọọrọ anyị na ya bụ nwaafọ Abatete dị n'okpuru ọchịchị Idemili North n'Anambra steeti.

Ọ sịrị na mgbe ya malitere ime ihe ngosi, na ọ bụ agụụ kpaliri mmụọ ya mana dịka oge na-aga, echiche ya gbanwere.

"Ọ bụ agụụ kpaliri m ibido ihe ngosi. A sị na ego dị n'ihe ngosi, m sị ka m banyegodu. Ọ bụ ihe dị m n'obi oge m malitere mana dịka oge na-aga, ihe na-akpa mmadụ a na-agbanwe," ka Eric Gugua gwara anyị.

O kwuru na ya abụghị onye amụma maọbụ Ụkọchukwu dịka ụfọdụ mmadụ si eche kama na ya bụ onye na-akpọ oku ka mmadụ na-eme ihe kwesịrị ekwesị oge niile, ọ bụrụgodu ma a sị na ọ bụghị ihe Jizọs Kraịst kwuru n'akwụkwọ nsọ.

Ebe foto si, Eric Gugua/Instagram

Nkọwa foto, Eric Gugua yi uwe isiagụ na okpu ndị nze tinyere ugegbe anya ojii, nke bụ ekike e ji mara ya oge ọ malitere ime ihe ngosi.

Eric Gugua kwuru na ya bụ onye hụrụ omenala Igbo n'anya nke ukwuu. Ọ sịrị na ọ bụ nke ahụ mere o ji eke ekike e ji mara ndị Igbo oge ọ malitere ime ihe ngosi, tupu ruo oge o chefuru ngwongwo ya gaa mba ofesi.

O kwuru sị: "Ihe gbasara omenala na njirimara ndị Igbo na-amasị m nke ukwuu. Ana m agụ gbasara omenala ndị Afrịka nke ọma".

"Oge m malitere ime ihe ngosi, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na m gosipụtara njirimara m ahụ. Ihe mere m ji gbahapụ ụdị ihe ngosi ahụ bụ na m mere njem gaa mba ofesi ma chefuo ngwongwo ndị m ji eke ekike."

Ọ gbarụrụ ihe megide mmadụ ịhazigharị ọnọdụ ahụ ya nke ụmụnwaanyị na-eme ugbua, a maara dịka BBL ma kwuo na ndị na-eme ya amaghị ihe ha na-eme.

O nyere ndị na-eme ihe ngosi ndụmọdụ ka ha kpachapụ anya n'ụdị ihe ha na-egosipụtara ọhanaeze, n'ihi na ọtụtụ mmadụ dabeere n'ebe ha nọ.

"Biko ghọta na ndụ ndị mmadụ dị gị n'aka, ọ bụghị naanị ka e mee. I nwere ikike iwulite ndị mmadụ, nweekwa ikike ibibi ndụ mmadụ," bụ ndụmọdụ Eric nyere ndị otu ya.

O nyere ndị na-eme ihe ngosi ndụmọdụ ka ha kpachapụ anya n'ụdị ihe ha na-egosipụtara ọhanaeze, n'ihi na ọtụtụ mmadụ dabeere n'ebe ha nọ.

Ebe foto si, Eric Gugua/Instagram

Nkọwa foto, Foto Eric Gugua ebe ọ na-adọ aka na ntị.