'Agaghị m ekwe ka ndị "mbịarambịa" wakpoo obodo m ma nara ha ala ha n'ike' – Eze Okey Bakassi

Aha onyonyo, 'Esi m n'ịkpa ndị mmadụ ọchị bụrụ Eze obodo m' - Okey Bakassi
'Agaghị m ekwe ka ndị "mbịarambịa" wakpoo obodo m ma nara ha ala ha n'ike' – Eze Okey Bakassi
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji, Adline Okere na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist, Editor and Video Journalist

Okechukwu Onyegbule a maara nke ọma dịka "Okey Bakassi" agwala BBC etu o siri malite ịza ya bụ aha nakwa etu ndị obodo ya si họpụta ya dịka Eze ọhụrụ ha.

Nwaafọ Mbaise ahụ a ma ama na-eme ejije ma na-emekwa ihe ntọọchị, kwuru na ọ bụ ndị enyi ya bidoro ịkpọ ya Okey Bakassi oge ọ malitere ime ejije.

Ọ kọọrọ anyị sị: "Oge ahụ, Naịjirịa na mba Kameruun chọrọ inwe nghọtahie maka mpaghara Bakassi Peninsula, ọ na-abụ anyị gbakọọ, m malite ịkọrọ ha ka ihe si kwụrụ n'ụzọ na-akpa ha obiọma".

"Oge ahụ, anyị ruru mmadụ anọ a na-akpọ Okey mana iji kọwaa m nke ọma, ha malitere ịkpọ m Okey na-akọrọ ha ihe ndị na-eme na Bakassi. Mana otu onye meziri ya ka ọ dị nkenke site n'ịkpọ m "Okey Bakassi."

Ọ kọwara na ya na-emekwa ụdị ejije ndị ọzọ na-abụghị ndị nke na-akpa ọchị n'ihi na e nweghị ụdị ejije ọ na-apụghị ime.

"Ndị obodo m họpụtara m dịka Okwe II dabere n'iwu na-achị obodo anyị. Anyị na-ebugharị ocheeze obodo anyị, ọ bụghị ụdị nke na-esite n'aka nna fere n'aka nwa. Nke anyị na-esite n'otu ọnụmara fere n'ọnụmara ọzọ."

Ebe foto si, Okey Bakassi

Nkọwa foto, Eze Okechukwu Onyegbule a maara dịka Okey Bakassi

Na mkparịtaụka pụrụiche anyị na ya nwere, Okechukwu Onyegbule kwuru na ndị obodo ya bụ Ụmụihuọcha dị n'Obohịa n'okpuru ọchịchị Ahịazụ Mbaise nke Imo steeti họpụtara ya dịka Eze ọhụrụ ha site n'ịgbakwasa ụkwụ n'iwu na-achị obodo ha.

"Ndị obodo m họpụtara m dịka Okwe II dabere n'iwu na-achị obodo anyị. Anyị na-ebugharị ocheeze obodo anyị, ọ bụghị ụdị nke na-esite n'aka nna fere n'aka nwa. Nke anyị na-esite n'otu ọnụmara fere n'ọnụmara ọzọ," ka ọ kọwara.

Eze Onyegbule sịrị na ya bụ nwa nke mbụ nne na nna ya mụrụ ma bụrụkwa ọkpara, ebe ọnụmara nke ha bụ Ụmụamarannọ bụ ọkpara n'obodo Ụmụihuọcha.

O kwuru na ndị obodo ya họpụtara ya dịka Eze ọhụrụ ha oge Eze na-achị obodo ha nwụrụ.

"Oge ọ mara anyị n'aka iwepụta Eze, ndị Ụmụamarannọ họpụtara ụmụ ha ndị kara aka ịnọchi anya Okwe I laraala mmụọ. N'ime ụmụokoroọbịa ndị Ụmụamarannọ họpụtara, ndị Ụmụihuọcha mere ntuliaka ma họpụta mụ onwe m bụ Okechukwu Onyegbule dịka Okwe II," ka Eze Onyegbule kọwara.

O kwere ndị obodo ya nkwa na ọ ga-ewetere ha ezi mmepe ma kwalitekwa ọnọdụ ndị ntoroọbịa ha. O kwukwara na ya ga-eme ihe niile dị ya n'aka iji hụ na ndị "mbịarambịa" emebighị ihe ndị ha kọrọ n'ugbo maọbụ gbuo ndị obodo ya.

"Oge eruola mgbe a ga-enwe onye Eze ga-ejikọta ndị ntoroọbịa, chọọrọ ha ihe ndị ha ga-eme iji na-akpata ego, nke ga-eme ka ha ghara inwe mmasị ịga mba ndị ọzọ."

Ebe foto si, Okey Bakassi

Nkọwa foto, Okey Bakassi

Okwe II sịrị: "Achọrọ m ịgwa ndị Ụmụihuọcha na oge agaala mgbe anyị ga-ewere ọkwa onye ndu anyị tinye n'aka onye rụcharaala ọrụ ka ọ bụrụ ebe ọ ga-ala ezumike. Ọrụ mmepe obodo karịrị akarị ma bụrụkwa nke chọrọ onye gbasiri ike na onye nwere ọhụ ga-eme ihe ndị a niile ka ọ dị mma".

"Onye Eze a chọrọ n'afọ 2025 nakwa n'ọdịnihu bụ Eze ga-emepe ime obodo, ka ndị bi n'ime obodo mata ihe na-eme n'ụwa niile, ka anya ndị ntoroọbịa anyị mepee, ka ha nweeike bie ndụ etu ndị mmadụ si ebi ndụ na mba ndị ọzọ, ma nọsie ike n'obodo iji hụ na e nweghị ndị ọbịa ga-emebi akụmakụ ndị obodo maobụ gbuo ndị obodo ma nara ha ala ha n'ike".

"Oge eruola mgbe a ga-enwe onye Eze ga-ejikọta ndị ntoroọbịa, chọọrọ ha ihe ndị ha ga-eme iji na-akpata ego, nke ga-eme ka ha ghara inwe mmasị ịga mba ndị ọzọ."

Ọ sịrị na dabere n'ihe o jiri anya ya hụ oge a họpụtara ya n'ọkwa n'oge Ikedi Ohakim bụụrụ aka na-achị Imo steeti, na ya nọ n'ezi ọnọdụ ịgaara ndị obodo ya ozi dịka Eze ha.

O nyere mmadụ niile ndụmọdụ ka ha tinye aka n'ụzọ ọbụla ha nwere ike ya, iji hụ na e meziri ala Igbo ma kwuo na ya ga-aga n'ihu na-eme ejije n'agbanyeghị na ya bụ Eze.

"Bikonu, anyị chọọ ka ala Igbo anyị dị mma, ọ dị anyị niile n'aka. Onye niile nwere uru ha bara, o nweghị onye anyị ga-agbahapụrụ ya".

"Ndị mmadụ na-ajụ ma m ga-agakwa n'ihu na-eme ejije ugbua e mere m eze. Ewezuga ego, ime ejije bụ ihe ọzọ na-eme m obiọma." ka Eze Okey Bakassi kwuru.