Etu m siri bụrụ Mr International mbụ si Naịjirịa - Samuel Nwajagu
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist
Samuel Nwajagu akọwaala etu o siri malite njem ya nakwa etu o siri turu ugo mmeri n'emume ihe ngosi Mr International a haziri n'ọnwa Disemba, afọ 2024.
Nwaafọ Anambra steeti ahụ kwuru na ya gụrụ ihe ọmụmụ Mechanical Engineering na mahadum UNIPORT tupu o sonye n'ịmaaka ahụ.
Nwajagu kọwara na ime ngosi Bekee kpọrọ pageantry bụ ihe dị ya n'obi kemgbe ọ bụ nwata mana o nweghị ohere ime ya n'ihi agụmaakwụkwọ ya.
"Ọ bụ afọ abụọ gara aga ka m nwara ike m iji hụ ka ihe ga-esi gaa. Gị lee anya ugbua, ị hụ na ihe niile na-aga nke ọma," ka ọ gwara BBC News Igbo.
Ọ sịrị na ya nwere atụmatụ ịga n'ihu n'agụmaakwụkwọ ya, iji nweeike mụbawanye amamihe ya maka na dịka o siri kọwaa "ọ bụ ihe mmadụ mụtara ka ọ ga-akụziri ndị ọzọ".
E wezuga ime ihe ngosi, Nwajagu bụ onye na-akpalite mmụọ mmadụ nke a na-akpọ Motivational Speaker.
O kwuru na ya na-emekwa egwuruegwu na teknụụzụ.
Dịka onye ihe banyere ọdịmma ndị ọzọ na-emetụ n'obi, nwaamadị ahụ malitere otu atụmatụ o ji enyere ndị anya na-enye nsogbu aka.
"E nwere ọtụtụ ihe omume m ji n'aka, nke m mere na nso nso a bụ "See the Light Project". Nke ahụ bụ ihe omume m hibere maka ndị nwere nsogbu anya na ndị kpuru isi, iji mee ka ha nweeike hụ ụzọ nke ọma ma nyekwa ha nkwado ga-eme ka ndụ ha dị mfe," ka ọ kọwara.
O gisipụtara obiụtọ maka isonye na ndị na-eme ejije na Naịjirịa ma kwuo na ọ ga-amasị ya ịga n'ihu na ngalaba ahụ.
Dịka o siri kwuo "obi dị m aṅụrị ịbanye na ngalaba na-akpa obiọma bụ entertainment industry site n'ime ejije.
"Malite n'oge m dị na nwata ruo ugbua, ọ na-amasị m ikiri ndị na-eme ejije. Obi dị m ụtọ maka ohere ahụ, ma ana m atụkwa anya inwete ohere ndị ọzọ,"
Oge ọ na-enye ndị ntoroọbịa ndụmọdụ, Mr International sịrị na ọ dị mkpa na nwoke ọbụla ma ebe ọ na-aga.
Ọ gwara ụmụokoroọbịa ka ha ghara ikwe ka ụmụnwaanyị megherie ha anya n'ihi na oge dịịrị ihe niile.
N'okwu ya, "e nwere oge maka ụmụnwaanyị mana ugbua, akaọrụ m dị m ezigbo mkpa karịa ihe niile."

Ebe foto si, Samuel Nwajagu/Instagram



