Nsụ m na-asụ egbochighị m iji egwu ebu agha megide ọgwụike - David Jones

Aha onyonyo, Nsụ m na-asụ egbochighị m iji egwu ebu agha megide ọgwụike - David Jones
Nsụ m na-asụ egbochighị m iji egwu ebu agha megide ọgwụike - David Jones
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist

David Jones David bụ nwaafọ Nsit Ubium dị n'Akwa Ibom steeti, mana ọ na-asụ Igbo nke ọma.

Ọ bụ onye a ma ama na-eti egwu, na-eme ejije ma na-emekwa ihe ngosi a kpọrọ content creation n'asụsụ Bekee.

Oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka, David Jones kpughere na o nwere otu nsogbu na-echere ya aka mgba oge ọ na-eme ihe ngosi, ọkachasị ndị nke ọ na-eme n'ụdị ejije.

Ọ gwara anyị sị: "Abụ m onye na-ekwu okwu ọsọ ọsọ oge ụfọdụ. M chọọ imepụta ihe ngosi n'ụdị ejije, ịkpọpụta ụfọdụ okwu na-enye m nsogbu, ọ bụ ya mere m ji asị "you know" ugboro ugboro, n'ihi na ọ bụ ụzọ m si akpakọ okwu m ọnụ. Nke ahụ bụ otu ihe kachasị enye m nsogbu."

David kọọrọ anyị na ụdịrị egwu ọ na-eti bụ nke ọ kpọrọ "egwu ọma" n'ihi na ọ bụ nke o ji ekwu ihe gbasara ịhụnanya, Chineke nakwa ibu agha megide ọgwụike.

O nyere ndụmọdụ ka onye niile were onyinye amara Chukwu nyere ha buo agha megide ịṅụ ọgwụike dịka ya onwe ya si eme.

Ebe foto si, David Jones David/Facebook

Nkọwa foto, David Jones

Dịka o siri kwuo, ọ bụ ogogo dị elu ndị ntoroọbịa ji aṅụ ma na-emetọ ọgwụike ugbua, tinyere ọtụtụ nsogbu ọ na-ebutere ha mere o ji malite iji egwu ya ebu agha megide ọgwụike.

O kwuru sị: "Ndị ntoroọbịa weere ịṅụ ọgwụike dịka ihe enweghịzi ihe ọ bụ ugbua. Ma ha aṅụghị kolos, ha aṅụọ kana. Ma ha aṅụghị kana, ha aṅụọ moli. Ma ọ bụghị moli, ọ bụrụ tramadọl".

"Otu ụbọchị ka ndị na-eto eto bịara ime egwu n'ụlọegwu m. Ka m pụrụ wee bata, ọ bụrụ na ha amalitela ịnụ ọgwụike ma dobere m abụọ. Oge m jụrụ ha ihe ọ bụ, ha asị m na ọ bụ ọgwụike, m sị ha mba, na m anaghị aṅụ ọgwụike. Ọ tụọ ha n'anya."

O mekwara ka anyị mata ụdịrị egwu na-akpalite mmụọ ya nakwa ndị otiegwu ọ na-elekwasị anya.

"Egwu ọbụla a na-eti eti na-akpali mmụọ m, dịka egwu ndị Saụt Afrịka. Aga m asị na ọ bụ ndị na-eti ụdịrị egwu dị etu ahụ kpaliri mmụọ m," ka David Jones gwara anyị.

O nyere ndụmọdụ ka onye niile were onyinye amara Chukwu nyere ha buo agha megide ịṅụ ọgwụike dịka ya onwe ya si eme.

"Mmadụ niile kwesịrị itinye aka bụọ agha megide ịṅụ ọgwụike site n'ikikere ọbụla Chineke nyere anyị. Ikikere Chineke nyere m bụ ịgụ egwu, ọ bụ ya mere m ji si ụzọ ahụ na-eme ihe m na-eme," bụ ndụmọdụ David Jones David nyere mmadụ niile.

David Jones kọọrọ BBC ihe mere o ji malite ibu agha megide ọgwụike site n'egwu ya.

Ebe foto si, David Jones/Facebook

Nkọwa foto, David Jones na-eme ejije