Were vootu gị chụpụ Gọvanọ emeghị ọfụma - Uche Ekwunife
- Onye dere ya, Michael Ngene na Ayo Bello
- Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist
Sinetọ Uche Lilian Ekwunife agbaala n'anwụ na ya agaghị asa nwunye Gọvanọ Soludo okwu n'ebubo ahụ o boro ya na nso nso.
Sinetọ Ekwunife kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere banyere ọtụtụ ebubo nwunye Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra Steeti bụ Nonye Soludo boro ya nke o kwuru na ọ na-agba n'ezi n'agbanyeghị na ọ nọ na dị.
N'okwu ya "Agaghị m atufu oge m ma saa nwunye Gọvanọ Soludo okwu".
Cheta na ebubo ndị na-abịa dịka a na-akwado ime ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti na Nọvemba 8, 2025.
Uche Ekwunife bụ osote Nicholas Ukachukwu ji aha pati All Progressives Congress (APC) azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti na ntuliaka a ga-eme na Nọvemba 8 2025, ji ohere mkparịtaụka ahụ katọọ ọchịchị Gọvanọ Soludo ma kwuo na oge eruola mgbe ndị Anambra ga-enwe ezi gọọmenti ebumnobi ya ga-abụ iweta nchekwa zuruoke nye ndị Anambra Steeti.
Ọ gakwara n'ihu kwuputa ụfọdụ ihe ọchịchị ya na Nicholas Ukachukwu ga-emepụta n'Anambra Steeti ma ọ bụrụ na ha nweta mmeri na ntuliaka ahụ.
Ụfọdụ ihe ọ rụtụrụ aka na ya gụnyere nchekwa, ụlọọgwụ ahụike, agụmakwụkwọ, nrọpụta ụlọọrụ na ọtụtụ ihe ndị ọ gụpụtara.

Ebe foto si, Uche Ekwunife






