Onye ọbụla gbara ama maka ndị gburu Fada Eya ga-erite nde naịra iri - Gọọmenti Enugwu Steeti

Ebe foto si, Enugu State Police/ Catholic Dioceses Nsukka/Facebook
Ndị uweojii Enugwu Steeti ekwuola na ha anwuchiela mmadụ iri atọ na asatọ a na-enyo enyo na aka ha dị n'ogbugbu ụkọchukwu Katọlik bụ Fada Mathew Eya, nke Dayọsis Nsukka.
N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe wepụtara n'ụbọchị Sọnde 21 Sepụtemba, 2025, ha ṅụrụ iyi inwuchi ndị a ma taa ha ahụhụ ruuru ha.
"Anyị na-eche na ndị ekperima a ka nọ na gburu gburu ebe ahụ, anyị ekpebiela ịchọpụta ha," ka Kọmishọna uweojii bụ Giwa kwuru.
Ozi ahụ kwuru na ndị uweojii zigara ndị ọrụ ha ka ha zachaa ma kpochasịa ogige ebe ndị ekperima a zọrọ, nke mere e jiri nwuchie mmadụ 38 ma kpachie ọtụtụ ngwaagha.
"Anyị anwuchiela mmadụ 38 a na-enyo enyo, a na-eme ha nnyocha ugbua.
Anyị ga-agba mbọ hụụ na e nwetere ikpe ziri ezi, ma taa ndị kpara arụ a ahụhụ ruuru."
Ha gara n'ihu kwuo na ha nwere nkwenye na ndị a e jidere maara ihe banyere ọnwụ Fada Eya.
"Onye gbara ama maka ndị gburu Fada Eya ga-erite nde naịra iri"

Ebe foto si, Peter Ndubuisi Mbah/Facebok
Gọọmenti Enugwu Steeti akatọọla ogbugbu e gburu Fada Mathew Eya n'Eha-Alumona – Eha-Ndiagu.
Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi bụ Malachy Agbo n'ozi o wepụtara kwuru na obi agbawaala gọọmentị maka nke a na-eti ezinaụlọ ụkọchukwu aka n'obi.
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị na-ekwe nkwa ịkwụ onye ọbụla nyere aka ka a chọta ndị gburu Fada Eya ego dị nde naịra iri (N10m).
O kwuru ka onye ọbụla nwere ozi banyere nke a kpọtụrụ gọọmentị n'akara ekwentị ha wepụtara.
Agbo kwuru na gọọmenti Enugwu Steeti na-agbasi mbọ ike igbo nsogbu banyere nchekwa na steeti ha.
Etu e si gbagbuo Fada Mathew Eya

Ebe foto si, Catholic Diocese of Nsukka/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị ojiegbe gbagburu Fada Mathew Eya nke ụlọụka St. Charles Katọlik dị n'obodo Eha-Ndiagu n'okpuruọchịchị Nsukka nke Enugwu Steeti.
Ọdachi a mere na mgbede ụbọchị Fraịde 19 Sepụtemba, 2025 mgbe Fada Eya si njem na-alaghachị n'ụlọụka ya n'okporoụzọ Eha-Alumona nke Eha-Ndiagu.
Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe a bu ọgbatumtum, gbachie n'ihu ụgbọala ya, malite ịgba ya egbe ma gbagbuo ya.
N'ozi ụlọụka Katọlik nke Dayọsis Nsukka wepụtara na Satọde 20 Sepụtemba, 2025, ha kwara arịrị maka ọnwụ Fada Mathew Eya.
Chanselọ Dayọsis ahụ bụ Fada Cajetan Iyidobi tinyere aka n'akwụkwọ ahụ kpere ekpere ka mkpụrụobi Fada Eya laa n'udo.
"Ọ bụ site n'obi nwute na iru uju kama na nrubeisi n'uche nke Chineke, ka m ji ekwupụta ọnwụ ike nwanne anyị nwoke ọzọ, Fada Mathew Eya.
"A gbagburu ya ụnyaahụ (Fraịde), 19 Sepụtemba 2025 n'okporoụzọ Eha-Alumona – Eha-Ndiagu.
"Ka anyị jisie ike na-ekpere Chineke ka o chekwaa anyị n'oge ọjọọ a. Ka mkpụrụobi ya zuo ike n'udo. Amịn."
Cheta na nke a abụghị mbụ a na-egbu ndị ụkọchukwu n'Enugwu Steeti, mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa Naịjirịa gbaa gburu gburu.
N'ọnwa Eprelụ, afọ 2019, ndị ojiegbe tọọrọ ụkọchukwu Katọlik bụ Fada Clement Ugwu n'ụlọ ya dị na St. Marks Katọlik Obunofia ma mechaa gbuo ya.
N'ọtu aka ahụ, ndị ojiegbe gburu ụkọchukwu Paul Offu n'ọnwa Ọktoba afọ 2019 n'Enugwu, mgbe ọ na-aga n'ụlọ Fada ibe ya.
E nweela ọtụtụ akụkọ banyere ntọrị ndị ụkọchukwu na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.








