NAFDAC akpọchiela ụlọọrụ 250 na-emepụta mmanya adigboroja n'Aba

Ndịọrụ NAFDAC na-akpọchi ọdọ ahịa ahụ

Ebe foto si, NAFDAC/X

Nkọwa foto, Ndịọrụ NAFDAC na-akpọchi ọdọ ahịa ahụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) akpọchiela ụlọọrụ 250 na-emepụta mmanya adigboroja n'ọdọ ahịa Cemetary Market Aba dị n'Abia steeti.

Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC bụ Ọkankuzi Mojisola Adeyeye kwuru na nke a bụ ugboro abụọ ụlọọrụ ya na-akpọchi ahịa ahụ n'ime afọ abụọ.

Adeyeye kwuru na nke a bụ mbọ ụlọọrụ NAFDAC na-agba iji kpochapụ ngwa ahịa adigboroja n'ahịa ahụ. Ọ kọwara na ha machiri ngwa ahịa adigboroja dị iche iche ọnụ ahịa ya ruru ijeri naịra ise (₦5 billion).

Onyeisi NAFDAC kwuru na ha chọpụtara ụlọọrụ 240 na-emepụta mmanya adigboroja n'usoro megidere na-ekwesighị.

Ụlọọrụ NAFDAC ekposaala ogige ebe a na-akụ mmanya adịgboroja n'ahịa Cemetery Aba

Mmanya adigboroja NAFDAC bibiri

Ebe foto si, NAFDAC/X

Nkọwa foto, Mmanya adigboroja NAFDAC bibiri

Ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ na Naịjirịa bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) ekposaala ogige ebe a na-akụ ma na-ere mmanya adịgboroja dị iche iche n'ahịa Eziukwu e ji Cemetery n'Aba, Abia Steetị.

Onyeisi ụlọọrụ a na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Martins Iluyomade kwuru nke a mgbe o du ndị ọrụ gaa nzem n'ahịa ahụ. Ọ gbarụrụ ihu ma kwuo na nke abụghị mbụ ha na-achọpụta ụdịrị ihe n'ahịa ahụ.

N'afọ 2023, ụlọọrụ NAFDAC gakwara n'ahịa ahụ ebe ha na ndị ndu ahịa nwere nkwekọrịta na-ha ga-enyere ha aka ịchọpụta ndị niile na-ere mmanha adịgboroja ndị a.

Ebe foto si, NAFDAC/X

Nkọwa foto, N'afọ 2023, ụlọọrụ NAFDAC gakwara n'ahịa ahụ ebe ha na ndị ndu ahịa nwere nkwekọrịta na-ha ga-enyere ha aka ịchọpụta ndị niile na-ere mmanha adịgboroja ndị a.

N'afọ 2023, ụlọọrụ NAFDAC gakwara n'ahịa ahụ ebe ha na ndị ndu ahịa nwere nkwekọrịta na-ha ga-enyere ha aka ịchọpụta ndị niile na-ere mmanha adịgboroja ndị a.

Iluyomade kwuru "Anyị bịara ahịa n'afọ gara aga, ugbua anyị abịala ọzọ site n'ama a gbaara anyị na ndị mmadụ amalitekwa ịrụ ma na-ere mmanya adịgboroja n'ahịa.

"Ọ fọrọ ka m bee akwa, amaghị ihe mere ndị mmadụ ji agba isi akwara ịchọ ego ma na-emebi ndụ mmadụ ihe ya.

"Ihe anyị hụrụ ebe a taa adịghị iche n'ihe ndị anyị hụrụ n'afọ gara aga, ọ bụ ihe mgbawa obi. O nweghi mmanya ọbụla ịchọrọ na Naịjirịa na a naghị arụpụta ebe a.

"Ọ na-ara ahụ ịchọpụta ihe dị iche na mmanya adịghoroja ndị a na-arụpụta ebe na ndị ezigbo ya nọ n'ahịa.

O kwuru na ihe a na-arụpụta ebe a bụ ngwaọgụ e ji ala ndụ igwe mmadụ n'iyi. "Ha na-egbu ndị mmadụ n'igwe."

N'afọ 2023, ụlọọrụ NAFDAC gakwara n'ahịa ahụ ebe ha na ndị ndu ahịa nwere nkwekọrịta na-ha ga-enyere ha aka ịchọpụta ndị niile na-ere mmanha adịgboroja ndị a.

Ebe foto si, NAFDAC/X

Nkọwa foto, N'afọ 2023, ụlọọrụ NAFDAC gakwara n'ahịa ahụ ebe ha na ndị ndu ahịa nwere nkwekọrịta na-ha ga-enyere ha aka ịchọpụta ndị niile na-ere mmanha adịgboroja ndị a.

Ọ gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ NAFDAC atọọla ntọala etu ọ ga-esi meminaa ndị na-esipụta ma na-ere mmanya na ngwa nri adịgboroja, ma gwaa ndị mmadụ ka ha gbadoo anya tupu ha etinye mmanya ndị a n'ọnụ.

Etu ị ga-esi chọpụta ma ọgwụ na ihe oriri ị zụrụ ọ bụ adịgboroja

Iji nyere ndị mmadụ aka ịmata ma ha na-azụ ezi nri na ọgwụ ka ọ bụ nke adịgboroja, Nafdac wepụtara ihe ha kpọrọ 'Four Ps' nke pụtara 'pee anọ'. Ndị a gụnyere ; 'Place, price, packaging na product'.