Ụmụnwaanyị Anambra Steeti emeela ngagharịiwe maka nwaanyị di ya gbara ọkụ n'Abagana

Ebe foto si, Ministry of Women and Social Welfare Anambra State
Ụmụnwaanyị si obodo 179 n'Anambra steeti, emeela ngagharịiwe maka Blessing Nwaka onye akụkọ kwuru na di ya gbara ọkụ maka obere esemokwu ha nwere.
Ụmụnwaanyị ahụ mere ngagharịiwe n'ogige ụlọọrụ kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị dị na Dora Akunyili Women Development Center, bụ onyeisi ngalaba ụmụnwaanyị otu Anambra State Association of Town Unions, ASATU bụ Ify Okaro nọ n'isi ya.
Ify Okaro katọrọ ajọ ọdachi ahụ ma kpọọ oku ka ụmụnwoke na-aleta nwunye ha anya etu o kwesịrị iji gbochie ụdịrị njinji a.
N'okwu ya, kọmịshọna na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị Anambra bụ Ify Obinabo, gwara ụmụnwaanyị ahụ na nwunye Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ Nonye Soludo enyela iwu ka e mee ezi nnyocha n'okwu ahụ ma hụ na enwere ikpe ziri ezi na ya.

Ebe foto si, Ministry of Women and Social Welfare Anambra State
Ihe Gọọmentị Anambra Steetị kwuru maka nwoke gbara nwunye ya ọkụ n'Abagana

Ebe foto si, Ministry of Women and Social Welfare Anambra State
Gọọmentị Anambra Steetị akatọọla omume otu nwoke aha ya bụ Sunday Nwaka nke akụkọ kwuru na ọ gbara nwunye ya bụ Blessing Nwaka ọkụ n'Abagana nke steet ahụ.
Gọọmenti mere ka a mata nke a oge Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị n'Anambra steeti bụ Ify Obinabo gara mgbaru n'ezinaụlọ Nwaka ebe ọ nọrọ kwuo na gọọmentị steeti ahụ ga-ahụ na enwere ikpe ziri ezi n'okwu ahụ ma hụ na nwoke ahụ wetara ntaramahụhụ kwesịrị ajọ agwa ahụ.
N'aka nke ọzọ, onyeisioche okpuru ọchịchị Njikoka bụ Dominic Ononiba kwere nkwa na Gọọmentị Anambra ga-agba mbọ ịhụ na e nyere ụmụaka nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ezi nleta.
Cheta na ihe onyonyo malitere ifegharị na soshal midia na mgbedeTuzde 21 Jenụwarị 2025, gosiri etu ọkụ siri gbaa Blessing Nwaka onye akụkọ kwuru na ọ bụ ya na-ebu ibu ezinaụlọ ya.

Ebe foto si, Ministry of Women and Social Welfare Anambra State
"Ihe mere m jiri mụnye nwunye m ọkụ" - Nwoke gbara nwunye ya ọkụ n'Abagana, Anambra Steeti

Ebe foto si, Anambra State Police
Otu nwoke a kpọrọ Maazị Nwanna, bụ onye mụnyere nwoke ya ọkụ n'obodo Abagana dị n'Anambra Steeti na Tuzde 21 Jenụwarị 2025 akwaala arịrị ma kwupụta ihe mere o jiri gbuo nwunye ya.
Nwamadị a bụ onye nọ n'aka ndị uweojii Anambra Steeti ugbua kwuru na ọnwụnwa butere ya na ọ gaghị akọwanwu ihe kwabara n'ịkpa ụdịrị agwa a.
Mgbe Kọmishọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị n'Anambra Steeti bụ Ify Ibinabo na-agba nwoke a ajụjụ, o kwuru na nke a mere mgbe ya na nwunye ya bụ Chioma Nwanna na-alụ ọgụ.

Ebe foto si, Anambra State Police
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
"Ihe mere mgbe mụ na nwunye m na-alụ ọgụ, o buuru ngwa ọgụ ka ọ kụọ m, m lee anya hụụ galọn mmanụ ụgbọala nọ n'akụkụ were mmanụ ụgbọala ahụ wụọ ya ma mụnye ya ọkụ.
"Mgbe m hụrụ ka ọ na-ere ọkụ, agbara mbọ were mmiri ka m menyụọ ọkụ ahụ mana o rechaa ọtụtụ anụ ahụ ya"
Mgbe a jụrụ ya ihe butere esemokwu ha, Nwanna kwuru na nwunye na-ahapụ ụlọ pụọ na-agwaghị ebe ọ na-aga na na-alọta n'ụlọ n'ime abalị.
"Nwunye m na-ahapụ ụlọ anyị pụọ na-agwaghị m ebe ọ na-aga, ma na-alọta n'ihe dịke elekere iri na otu maọbụ iri na abụọ nke abalị.
O kwuru na ebumnobi ya abụghị ka o gbuo nwunye maka na ọ hụrụ ya n'anya nke ukwuu. Ọ gara n'ihu rịọ ụmụnwoke ise ha mụtara arịrịọ ka ha gbaghara ya.
Ka ọ dị ugbua nwunye mechara nwụọ n'isi ụtụtụ Wenezde 22 Jenụwarị 2025, site na mmerụ ahụ ọkụ ahụ gbara ya, ebe uweojii kwuru na nnyocha ka na-aga n'ihu.
Ibinabo kwuru na ozi ha nwetere bụ na nke a abụghị mbụ nwoke a na-eyi egwu igbu nwunye ya, ọ sị na ụmụaka ha kwuru na e nweela mgbe nna jiri karama sụọ nne ha.
Ọ gara n'ihu nye ndị di na nwunye ndụmọdụ na ọlụlụ dị na nwunye abụghị ihe a na-amanye mmadụ n'ike, na ọ bụrụ na di maọbụ nwunye sị na ọ lụjuola, ka ọ hapụ ụlọ ahụ pụọ karịa ịnọ ruo mgbe otu onye gburu ibe ya.
Ndị agbataobi ha kwuru na ha na-enwekaarị nghọtahie kwa mgbe kwa mgbe, ha kọwakwara na Maazị Nwanna na Chioma bibu na Jos, Plateau steeti tupu ha alọta oge adịghị anya n'ihi na ha gbara ọsọ ndụ.
Akụkọ banyere mwakpo na-eme n'ezinaụlọ ọkachasị nke metụtara ụmụnwaanyị na-arị ibe ya elu na Naịjirịa.
Ọtụtụ ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye ekwuola ka gọọmentị gbaa mbọ hụụ na e nyere ndị wakporo nwunye ha ntaramahụhụ ruru ha iji belata ụdịrị akụkọ dị etu a.









