Etu e si chọta ụmụaka atọ ahụ a tọọrọ n'Abakpa Enugwu Steeti kamgbe ọnwa Nọvemba 2024

Mkpu ọṅụ dara na mpaghara Abakpa Nike n'Enugwu Steeti n'ihi na ụmụaka atọ ahụ ndị ntọrị zuuru kamgbe Nọvemba 2024 abụrụla ndị a hụrụ.
Nna ụmụaka abụọ n'ime ha bụ Maazị Obum Elijah ji gwara BBC "ugbua chi jiri eji efoola na ndụ m."
Cheta n'afọ gara-aga ka BBC Igbo dere akụkọ etu ụmụagbọghọ abụọ kwabatara ọhụrụ n'ụlọ ebe ha bi n'Abakpa zuru ụmụaka atọ ahụ ma gbaa ọsọ.
Kamgbe ahụ ka ndị ọrụ nchekwa, ezinaụlọ na ndị malitere ịchọ ụmụaka atọ ahụ.
Dịka Maazị Elijah siri kwuo, ọ bụzị n'ụbọchị Jenụwarị 8 ka ha nwetere ozi na ndị uweojii n'Anambra Steetị jidere ndị na-ere ụmụaka, wee napụ ha mmadụ iri na atọ.

O sị na ngwa ngwa ha nụrụ nke a, ha gawara Awka wee hụụ na ụmụ aka ya abụọ na otu nke onye agbataobi ya so ndị ahụ.
Ka ha na ndị uweojii mechiri akwụkwọ, ha kpọọrọ ụmụ ha lọghachite n'Enugwu.
Oriaku Enebe bụ onye agbataobi ha kwuru na kamgbe ọnwa abụọ a na-achọ ụmụaka ndị a, na ha ehibeghi ụra ọfụọma.
Ọ rịọrọ ndị uweojii ka ha tinye anya na mmiri ma nwuchie ụmụwaanyị abụọ ahụ tọorọ ụmụaka ndị a.
Mgbe Elijah rịọrọ ka gọọmentị nyere ha aka chọta ụmụaka a
Akwa ka na-ada ugbua na no 103 Ukwunna streeti, Obinagu Rd. Abakpa Nike Enugwu steeti.
Ihe butere ya bụ etu ụmụagbọghọ ekperima si kachie ntị tọọrọ ụmụaka atọ gbalagaa.
Ya bụ mkpamkpa kpara ụbọchi Wenezde 30 Novemba 2024, ya bụ izuụka abụọ gara aga kpọmkwem.
Dịka nne na nna ụmụaka ahụ furu efu na ndị agbataobi ha siri kwuo, ofufu ụmụaka ahụ mere ha ka ihe onyonyo.
Oge BBC rutere n'ogbe ahụ dị n'Obinagu Road Abakpa Nike Enugwu, ha niile nọ ka ebe a na-eru uju.

Maazị Obumneme Elijah Uzendu onye a tọrọ ụmụ ya abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị ji anya mmiri kọọrọ anyi ka mmiri si baa n'opi ụgbọgọrọ.
"Ọ bụ na mgbede ụbọchi 30 Novemba ka ụmụnwaanyị abụọ kwatara ọhụrụ n'ụlọ a, kpọrọ ụmụaka m abụọ na otu nke onye agbataobi m sị ka ọ zụtara ha achịcha".
"Anyị amaghị na ọ bụ ndị ntọrị bịara ịtọrọ ụmụaka. Ha tọọrọ ụmụaka atọ ahụ, rute taa mere ya izuụka abụọ, anyi ejibeghị anya anyị hụ ụmụaka anyị ọzọ".

Ọtụtụ ndị bi na ya bụ ụlọ tinyere ọnụ kọwaa na ụmụagbọghọ ahụ kwabatara ụbọchi 27 Nọvemba, wee tọrọ ụmụaka ahụ ka ọ gachara naanị mkpụrụ ụbọchị atọ na 30 Novemba 2024.
Nna ụmụaka ahụ kwara arịrị na kemgbe izuụka abụọ ndị uweojii na-enyocha ya bụ ọdachi, mana ọ mịtaghị mkpụrụ ọbụla.
Otu nwoke so na ndị isi ogbe bụ MC Originality, kwuru na ha anụbeghị ụdị ajọ akụkọ a n'Obinagu rd Abakpa, wee rịo gọọmenti ka o tinye anya na mmiri nwude ụmụagbọghọ mere aru a tupu ha agatee aka.

Ihe ndị uweojii kwuru maka ụmụaka ahụ
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Daniel Ndukwe maka akụkọ ụmụaka ahụ a tọọrọ ka ọ kwuru na ya "ga-eme nyocha' gbasara ya.
Tupuu akụkọ anyị apụta, e nwebeghị ọsịsa okwu gbara ọkpụrụkpụ na-egosi ihe ndị ọzọ ndị uweojii chọpụtara gbasara ụmụaka ahụ.










